Igbo Mass Readings for June 15, 2020, Monde

Igbo Readings for June 15, 2020, Monde, Izu Nke Iri Na Otu N’oge Na-Adanyeghi N’emume

Nke a bu Igbo Catholic Readings maka Monday, June 15, 2020, nke ndi Catholic Lectionary wetara unu.

Image of Igbo Mass Readings for June 15, 2020, Monde
Igbo Readings for June 15, 2020, Mondee, Izu Nke Iri Na Otu N’oge Na-Adanyeghi N’emume

IHE OGUGU NKE MBU                  21:1..16

Ihe Ogugu ewetara n’Akwukwo nke mbu nke Ndieze

Nabot onye Jezril nwere ubi vain na Jezril n’akuku ulo Ahab eze Samea. Ahab gwara Nabot si, “nye m ubi vain gi ka m wee ya mere ubi akwukwo nri m, ebe o bu na o di nso n’ulo m, aga m enye gi ubi vain ka ya mma, mobu o masi gi, aga m  akwugi ihe  dara n’ego.”

Nabot zara Ahab si, “Chineke ekwekwala ka m nye gi ihe nnanna m ha. Ahab ji ihu mgbaru na iwe laa n’ulo ya, n’ihi ihe Nabot onye Jezril sara ya si, “Agaghi m enye gi oke si n’aka nnanna m ha rute m aka.”

O dinara n’akwa ya, tofuo ihu ya jukwa iri ihe obula. Nwunye ya Jezibel biakwutere ya juo ya si, “Gini bu iwe gi nke na i naghikwa eri ihe?” Ma o zara ya si, “Agwara m Nabot onye Jezril ka o resi m ubi vain ya, mobu o buru na o  ka masi ya, ka m nye ya ozo maka ya. Ma o zara m si, “agaghi enye gi ubi vain mu?”

Mgbe ahu ka nwaanyi ya Jezibej ji si ya: “O bu na o bughi gi na-achi Izrel? Bilie rie nri, gbasapu ihu aga m enye gi ugbo Vain Nabot onye Jezril ahu.” O biara dee akwukwoozi n’aha Ahab, were akara e jiri mara ya bu eze suchie onu ha.

O zigara ya ndiokenye na ndi nwere agba n’obodo Nabot. Ihe o dere n’akwukwoozi ndi a bu, “kpoonu oku maka ebumonu ma guzobenu Nabot n’ebe putara ihe n’etiti oha mmadu. N’ebe ahu unu ga-edunyere ya ndi efulefu abuo ka ha boo ya ebubo si, “O kpoola Chineke na eze iyi.

Kpupuzienu ya ezi were okwute tugbuo ya.” Ndi obodo ya ahu, ndi okenye na ndi niile nwere agba na ya mere dika Jezibel si deere ha n’akwukwoozi. Ha kporo oku ebumonu bia guzobe Nabot n’ebe putara ihe n’etiti oha mrnadu obodo ahu.

Ndi efulefu abuo kwuuru n’ihu Nabot boo ya ebubo n’ihu oha mmadu si, “Nabot ekwutoola Chineke na eze anyi.”

Ha kpopuru ya n’obodo ahu were okwute tugbuo ya. Ha zigakwaara Jezibel ozi si, “A tugbuola Nabot n’okwute, o nwuola.”

Mgbe Jezibel nuru na atugbuola Nabot n’okwute, o si Ahab, “Kulie, gaa were ubi vain ahu Nabot onye Jezril juru iresi gi n’ihina Nabot adighikwa ndu, o nwuola. Ozigbo Ahab nuru na Nabot anwuola o kuliri iga n’ubi Nabot onye Jezril iweghara ya ka oke ya.

ABUOMA NA AZIZA:                        Ps. 5:2-3,5-6,7

Aziza: Onyenweanyi gee nti n’akwa enyemaka m.

1. Oseburuwa gee m nti,

Chee echiche maka osu m na-ama.

Gee nti n’akwa enyemaka m

I bu Eze m na Chineke m! Aziza

2. O bu gi ka m na-ario, Oseburuwa

n’ihina oge chi boro I na-ege m ntí;

Ndi na-anya isi anaghi akwudosi ike n’ihu gi.

I na-akpo ndi ajo mmadu niile asi,

na-ekpochapu ndi ugha.

Onyenweanyi na-akpo ndi na-egbu mmadu

na ndi aghugho asi. Aziza

MBEKU (Ps. 95:8):

AlIelula, Allelula:

Taa, o buru na unu anu olu ya, unu akpochila obi unu. Alleluia.

Ozioma maka Monday, June 15, 2020, Monde, Izu Nke Iri Na Otu N’oge Na-Adanyeghi N’emume – Matiu 15; 38-42

Ihe Ogugu nke a si n’Ozioma di aso nke Matiu dere

Jesu gwara ndi na-eso uzo ya si, “Unu anula na e kwu si, ‘Anya laara anya; eze laara eze’. Ma ana m agwa unu; ejikwala ihe ojoo akwughachi rnmadu obula ihe ojoo o mere unu.

O buru na mmadu amaa gi ura na nti akanri, tughariara ya nti akaekpe.  O buru na mmadu agbaa gi akwukwo ka o nara gi uwe mkpuchi gi, hapukwara ya uwe mwuda gi; O buru na onye obula amanye gi ka i jee otu nzoukwu soro ya jee nzoukwu abuo.

Nyee onye obula rioro gi ihe, agbakutakwala onye obula choro ibiri gi ihe azu.

IHE OGUGU UNYAHU:

IHE OGUGU NKE ECHI: June 16, 2020, Tuesday, Izu Nke Iri Na Otu N’oge Na-Adanyeghi N’emume

Igbo Readings for June 15, 2020, Monde, Izu Nke Iri Na Otu N’oge Na-Adanyeghi N’emume

Sonyere Anyi na Facebook @ Catholic Lectionary

error: Alert: Content is protected !!