Igbo Mass Readings for June 16, 2020, Tuezdee

Igbo Readings for June 16, 2020, Tuezdee, Izu Nke Iri Na Otu N’oge Na-Adanyeghi N’emume

Nke a bu Igbo Catholic Readings maka Tuezdee, June 16, 2020, nke ndi Catholic Lectionary wetara unu.

Image of Igbo Mass Readings for  June 16, 2020, Tuezdee
Igbo Readings for June 16, 2020, Tuezdee, Izu Nke Iri Na Otu N’oge Na-Adanyeghi N’emume

IHE OGUGU NKE MBU 21:17-29

Ihe Ogugu ewetara n’Akwukwo nke Mbu nke Ndieze

Elaija onye Tishbe nwetara okwu nke Yahweh nke siri ya: “Bilie, gaa zute Ahab eze Izrel na Sameria. I ga-ahu ya n’ubi vain Nabot; o gbadala ebe ahu iweghara ya. I ga asi ya, ‘Oseburuwa na-ekwu nke a si: O kwa I gbuola ochu were aka ike na-ewere ihe abughi nke gi?

N’ihi nke a,  bu Yahweh na-ekwu, n’ebe ahu nkita ndi ahu rara obara Nabot ka nkita gakwa ara obara gi.” Ahab siri Elaija, “Ya bu na I jidela m.Onyeiro m?” Elaija azaa ya si, “Ejidela m gi maka ihu abuo gin’ebe I merela ihe na-ewe Yahweh iwe.

Aga m ezitere gi oke odachi, aga m azachapu gi bia kpochapu nwoke obula no n’ulo Ahab, ma ohu ma onye new onwe ya n’Izrel.

Aga m emekwa ezinuulo gi dika m si mee ezinuulo Jeroboam nwa Nebat nakwa nke Baasha nwa Ahija maka iwe i kpasuru m na maka ihe ojoo nke i dunyere Izrel.

Oseburuwa kwukwara gbasara Jezibel si, “Nkita ga-eri Jezibel n’ime Jerzril. Onye ezinuulo Ahab obula nwuru n’ebe ndi mmadu bi nkita ga-eri ya, nke nwuru n’ikpa umunnunu nke igwe ga-erikwa ya.

Ma n’ezie o nweghi onye yiri Ahab na-ime mpu nakwa na-ime ihe na-ewe Yahweh iwe site na mmanye nwaanyi ya Jezibel.

O ruru ala n’uzo kacha di ukwuu site n’ife arusi dika ndi Amo si mee, nke na Yahweh napuru ha aku ha were ha nye Izrel.

Mgbe Ahab nuru okwu ndi ahu o dokara uwe ya, bia yiri naani nkirika akwa, biakwa buo onu.

O ji nkirika akwa ahu na-arahu ura na-agakwa ka onye a na-emegbu emegbu. Elaija onye Tishbe nwetara okwu nke Yahweh nke siri ya: “I hula ka Ahab si weda onwe ya ala n’ihu m?

Ebe o wedara onwe ya n’ihu m, agaghi m ezite mbibi ahu n’oge nke ya, mana aga m ezidata mbibi ahu n’ezinuulo ya n’oge nke nwa ya.

ABUOMA NA AZIZA Ps. 50:3-6, 11, 16

Aziza: Meere anyi ebere O Chineke n’ihina anyi emehiego

1. Meere m ebere O Chineke site n’ihunaanya gi;

Site na nnukwu obi ebere gi hichapu njo m niile;

Sachapu mmeghie m niile

Wuchapu m na njo m. Aziza

2. Nihina amarala m mmehie m niile;

Njo m no na mmuo m oge niile.

O bu so gi, naani gi, ka m mere njo megide.

Ihe di njo n’ihu gi ka m mere. Aziza

3. Elekwala anya na njo m

ma hichapu mmehie m niile.

Si n’onwu nzoputa m Chineke onye nzoputa m

Ka ire m wee kwuputa ikwuba aka oto gi. Aziza.

MBEKU (I Jon 2:5):

Alleluia. Alleluia:

Onye obula nke na-edobe okwu nke Kristi, n’ezie ihunanya maka Chineke zuru oke n’ime ya.

Allueluia.

Ozioma maka June 16, 2020, Tuezdee, Izu Nke Iri Na Otu N’oge Na-Adanyeghi N’emume  – Matiu     5:43-48

Ihe Ogugu nke a si n’Ozioma di aso nke Matiu dere

Jesu gwara ndi na-eso uzo ya si, “Unu anula na e kwuru si,’I ga-ahu onye agbataobi gi n’anya, ma kpoo onyeiro gi asi’.

Ma ana m agwa unu; hunu ndiiro unu n’anya, na-ekpekwaranu ndi na-emegbu unu ekpere, ka unu wee buru umu nke Nna unu bi n’eluigwe n’ihina o na-eme ka anyanwu ya chakwasi ma ndi ajo mmadu, ma ndi ezigbo mmadu.

O na-emekwa ka mmiri na-ezoro ma ndi oma ma ndi ojoo. O buru na unu na-ahu naani ndi enyi unu n’anya, kedu ugwo oru puru iche unu ga-anata n’aka Chineke?

Obuladi ndi onautu na-emekwa out ahu. O buru na unu na-ekele naani umunne unu, kedu ihe puru iche unu mere karia ndiozo?

O bu na ndi na-ekpere arusi anaghi eme otu ahu? Ya bu, unu onwe unu ga-ezu oke dika Nna unu nke bi n’eluigwe siri zuo oke.

IHE OGUGU UNYAHU: June 15, 2020, Monde, Izu Nke Iri Na Otu N’oge Na-Adanyeghi N’emume

IHE OGUGU NKE ECHI: June 17, 2020, Wednezdee, Izu Nke Iri Na Otu N’oge Na-Adanyeghi N’emume

Igbo Readings for June 16, 2020, Tuezdee, Izu Nke Iri Na Otu N’oge Na-Adanyeghi N’emume

Sonyere Anyi na Facebook @ Catholic Lectionary

error: Alert: Content is protected !!