Igbo Mass Readings December 6 2020, Ụka nke Abụọ n’Oge Adventi Yr B

Igbo Mass Readings December 6 2020, Ụka nke Abụọ n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.

Igbo Mass Readings December 6 2020, Ụka nke Abụọ n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.
Igbo Mass Readings December 6 2020, Ụka nke Abụọ n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ      40:1-5, 9-11.

Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye Amụma Aịzaya.

Isi Okwu: Dozierenụ Onyenweanyị ụzọ.

Ugbu a, Chineke ụnụ na-ekwu sị: “Kasienụ ndị nke m obi! Kasienụ ha obi! Gwa Jerusalem okwu ruru ya n’obi! Kpọ ya oku, kọọrọ ya na oge e kenyere ya maka ịgba ohu agwụla; na a kwụọla ụgwọ njọ ya; na ọ natala ọpịpịa mmaji abụọ n’aka Onyenweanyị maka arụ niile o mere.

Otu olu na-eti mkpu sị: “Kwadoronụ Onyenweanyị okporo ụzọ na mbara ịkpa.

Gbuoronụ Chineke anyị ụzọ a wara, a wara, guzoziri eguzozi n’ime ọzara. Kpojupụtanụ ndagwurugwu niile!

Kụrienụ ugwu ukwu na ugwu nta!  Meenụ ka mkpomkpo ala dị larịị; ka ugwu n’elu, ugwu n’ala hara otu; ka ebe gbagọrọ agbagọrọ guzozie eguzozie.

Mgbe ahụ ka a ga-egosi ebube nke Onyenweanyị. Mmadụ niile ga-ahụ Ya, n’ihina ọnụ Onyenweanyị ekwuola ya.

Gị, onye ozi ọñụ Zayọn, gbagoro n’elu ugwu ukwu dị elu! Gị onye ozi ọñụ Jerusalem, were oke olu tie mkpu!

Tie mkpu n’atụghị egwu ọbụla. Gwa obodo niile nọ na Juda: ‘Chineke ụnụ nọ n’ebe a’.

Lee ka Onyenweanyị Chineke ji ike Yan a-abịa. Ogwe aka Yan a-emeri ihe niile, ka ha nọrọ n’okpuru Ya.

Ụgwọ O ritere na mmeri so Ya. Ihe O ji akwụ ụgwọ mmeri bu Ya ụzọ na-aga.

Ọ dị ka onye ọzụzụ atụrụ na-azụ atụrụ Ya. Ọ na-ekuru ụmụ atụrụ Ya n’aka, na-akpọkọta ha; bịakwa na-agụrụ ha n’ezi obi, na-edute nne ha ebe ha ga-ezuru ike.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA:       Ps. 84:9-14

Azịza: Onyenweanyị gosi anyị ebere Gị. Nyekwa anyị nzọpụta Gị.

1.Aga m anụ ihe Onyenweanyị Chineke ga-ekwu: Olu na-ekwu maka udo; udo maka ndị nke ya. Enyemaka Ya nọ ndị na-atụrụ Ya egwu nso. Ebube Ya ga-anọgide n’ala anyị. Azịza

2. Ebere na Eziokwu ezukọtala. Eziomume na udo ebiela ọma. Ezi okwu ga-esi n’ala epulite. Ikpe nkwụmọtọ esi n’eluigwe na-eledata anya. Azịza.

3. Onyenweanyị ga-enye anyị agamniihu. Ala anyị ga-amịta mkpụrụ nke ukwu. Eziomume ga na-aga n’ihu Ya. Udo wee na-esota na nzọ ụkwụ Ya. Azịza.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ        3:8-14

Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Ozi nke Abụọ Pita dị asọ dere.

Isi Okwu: Anyị na-eche eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ.

Ndị enyi m, ụnụ echefukwala ihe a: na n’ihu Onyenweanyị, ‘otu ụbọchị’ nwere ike ịpụta nnụ kwụrụ nnụ afọ; nnụ afọ dị ka otu ụbọchị.

Onyenweanyị anaghị egbu oge n’imezu nkwa O kwere, dịka anyị si ekwu na mmadụ na egbu oge.

Kama O ji ndidi na-edi ụnụ niile, maka na Ọ chọghị ka e nwee ndị furu efu; kama Ọ chọrọ ka onye ọbụla gbanwoo ụzọ ya.

Ụbọchị Onyenweanyị ga-abịa ka onye ohi. Otu ugboro ka mkpọtụ ga-ahịọ, mbara igwe efuo.

Ihe niile e kere eke ga-agba n’ibe, n’ibe, nwuru ọkụ. Ụwa na ihe niile nọ n’ime ya ga-agba ọkụ.

Ebe ọ bụ na ihe niile ga-esi otu a gwụ, ụnụ kwesịrị ibi ndụ na-arụghị arụ, na ndụ dị nsọ; ebe ọ na-agụ ụnụ oke agụụ n’obi ka ụnụ na-eche ụbọchị Chineke ahụ na-abịanụ, mgbe mbara igwe ga-efu n’ire ọkụ; ihe niile e kere eke wee gbazee n’okpomọkụ ahụ.

Ihe anyị na-eche bụ ihe e kwere na nkwa: eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ ahụ, ebe ahụ ga-abụ ụlọ obibi nke ndị eziomume!

Ndị enyi m, ihe ọ pụtara bụ na ugbu a ụnụna-eche nche, ụnụ ga-agba mbọ niile ụnụ nwere ike iji bie ndụ na-ebughị ọrụ ma ọ bụ ntụpọ, ka o wee chọta ụnụ n’udo.

ALLELUỊA             Luk 3:4, 6.

Alleluịa, Alleluịa:

Dozierenụ Onyenweanyị ụzọ. Meenụ ka ụzọ Ya guzozie. Mmadụ niile ga-ahụ nzọpụta Chineke.

Alleluịa.

Igbo Mass Readings December 6 2020, Ụka nke Abụọ n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.

Oziọma maka December 6 2020 – Matiu  1:1-8

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere

Isi Okwu: Mee ka ụzọ Ya kwụrụ ọtọ

Mbido Oziọma nke Jesu Kristi Nwa Chineke. E dere n’Akwụkwọ Onye Amụma Aịzaya sị: “Lee, aga M ezite onye ozi M, ka o bute Gị ụzọ.

Ọ ga-akwadoro Gị ụzọ. Otu olu na-akpọ n’ịkpa: Kwadonụ ụzọ maka Onyenweanyị. Meenụ ka ụzọ Ya kwụrụ ọtọ.”

Ọ bụ otu ahụ ka Jọn Ome Mmirichukwu si pụta n’ime ọzara na-ekwupụta mmirichukwu nchegharị maka mgbaghara njọ.

Judịa niile na ndị Jerusalem niile, chọọrọ ụzọ ga a kwụrụ ya. Mgbe Ọ na-eme ha mmirichukwu n’osimiri Jọdan, ha kwupụtara njọ ha.

Jọn jiri akpụkpọ ịnyịnya kwaa uwe. Nri ọ na-eri bụ ụkpala na mmanụ añụ dị n’ọhịa.

Mgbe ọ na-ekwu okwuchukwu, ọ sịrị: “E nwere onye na-eso m n’azụ. Onye ahụ ka m ike, nke na, etosịghị m ịgbu ikpere n’ala tọpụ eriri akpụkpọ ụkwụ Ya.

E jiri m mmiri mee ụnụ mmirichukwu. Ma Ọ ga-eji Mmụọ Nsọ eme ụnụ mmirichukwu.

IHE ỌGỤGỤ ỤNYAHỤ: Igbo Mass Readings December 5 2020, Satọde Izuụka nke Mbu n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.

IHE ỌGỤGỤ ECHI:   Igbo Mass Readings December 7 2020, Ncheta Ambrose Dị Asọ – Mọnde Izu Abụọ n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta.

Igbo Mass Readings December 6 2020, Ụka nke Abụọ n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.

Sonyere anyị na Facebook na Igbo Mass Readings 

error: Alert: Content is protected !!