Igbo Mass Readings October 25 2020, Ụka Iri Atọ n’oge Nkiti

Igbo Mass Readings October 25 2020, Ụka Iri Atọ n’oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings October 25 2020, Ụka Iri Atọ n'oge Adanyeghị n'Emume.
Igbo Mass Readings October 25 2020, Ụka Iri Atọ n’oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ      45:1, 4-6

Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Ọpụpụ

Isi Okwu:  I megbuo nwanyị isimkpe na nwogbenye, iwe M ga-ebuso gị ga-ere ka ọkụ.

Akpagbukwala onye ọbịa. E megbukwala ya n’ihi na o nwere mgbe ụnụ bụ ndị ọbịa n’ala Ijipt.

E mejọkwala nwanyị isimkpe ma ọ bụ nwa enweghị nne na nna. Ọ bụrụ na ụnụ emegbuo ha, ha bekuo M, n’ezie aga M anụ mkpu akwa ha.

Oke iwe M ga-enwu ka ọkụ. Aga m eji mma agha egbu ụnụ. Mgbe ahụ ka nwunye ụnụ ga-abụ nwanyị isimkpe. Ụmụ ụnụ aghọọ ndị na-enweghị nna.

“Ọ bụrụ nwa ogbenye si n’agbụrụ ndị nke M ka I binyere ego, a nakwala ya ọmụrụ nwa. A tụkwasala ya ụma.

Ọ bụrụ akwa mgbochi onye agbata obi gị ka i chịịrị n’agba ibe, hụkwa na ị chịghachiri ya azụ tupu anyanwụ adaa, n’ihina, eleghị anya, o nwere ike bụrụ sọ otu akwa mgbochi ahụ ka o nwere iji kpuchie ahụ ya.

Ọ bụ gịnị ọzọ ka ọ ga-eji rahụ ụra? Ọ bụrụ na ya bekuo m, aga M anụkwa olu ya, n’ihi na abụ M onye obi ebere.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA: Ps. 17:2-4, 47, 51. Az. 2

Azịza:  Onyenweanyị Ị bụ ike m. Ahụrụ m Gị n’anya.

  1. Onyenweanyị Ị bụ ike m. Ahụrụ Gị n’anya. Onyenweanyị, nkume m, ụlọ igwe m na onye mgbapụta m. Azịza.
  2. Chineke m, nkume m na-agbaga ọsọ ndụ, nchedo m, mpi nzọpụta m, ụlọ m na-agbaba ezere isi m. Etiri m mkpu sị: “Otito dịrị Onyenweanyị,” e wee zọpụta m n’aka ndị iro m niile. Azịza.
  3. Ogologo ndụ dịrị Onyenweanyị! Ọ bụ ya bụ nkume m! Ebube na otito dịrị Chineke onye nzọpụta m. Ọ bụ Gị nyere eze Gị nnukwu mmeri, bịakwa meere Onye i tere mmanụ amara. Azịza.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ   1:5-10

Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Ozi Mb Pọl dị asọ degaara Ndị Tesalonika

Isi Okwu: Ụnụ site n’ikpere arụsị tụgharịa wee bụrụ ụmụ odibo Chineke. Ugbu a ụnụ na-eche ọbịbịa nke Nwa Ya.

Ụnụ hụrụ ụdị ndụ anyị biri mgbe anyị na ụnụ nọ; ụdị ndụ ahụ anyị jiri kụziri ụnụ ihe. Nke mere ụnụ ji bụrụ ndị na-eso ụzọ anyị, na ụzọ Onyenweanyị.

Ọ bụ ya mere ụnụ ji were añụrị nke Mmụọ Nsọ nabata Oziọma ọ bụrụgodu mgbe ahụ ọnwụnwa dị iche iche gbara ụnụ gburugburu.

Otu a ka ụnụ si bụrụ ndị anya na-ele, n’agbata ndị niile kwere ekwe dị na Masidonịa na Akaya.

Ebe ọ bụ na site n’aka ụnụ ka okwu nke Onyenweanyị malitere ịgbasa, ọ bụghị sọ na Masidonịa na Akaya niile, kama akụkọ banyere okwukwe ụnụ nwere na Chineke agazuola ụwa niile.

Ọ dịghị mkpa ka anyị kọwara ndị ọzọ banyere ya. Ọ bụ ndị ọzọ na-akọrọ anyị otu anyị si bido ọrụ n’etiti ụnụ; otu ụnụ si wepụ aka n’ikpere arụsị, mgbe a tọghatara ụnụ na Chineke,

na otu ụnụ si bịa bụrụ ụmụ odibo ezi Chineke dị ndụ; na otu o si bụrụ na ugbu a, ụnụ na-eche Jesu Nwa Ya, Onye O bilitere n’ọnwụ, ka O si n’eluigwe bịa zọpụta anyị na mmegwata ahụ na-abịanụ.

ALLELUỊA       Luk 19, 28

Alleluịa, Alleluịa:

Ngọzi dịrị eze ahụ na-abịa n’aha Onyenweanyị. Udo dịkwara ụwa, ebube dịkwara igwe,.

Alleluịa.

Oziọma maka October 25, 2020 – Matiu 22:15-21

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Isi Okwu: Ị ga ahụ Chineke gị n’anya bịakwa hụ mmadụ ibe gị n’anya ka I si hụ onwe gị.

Mgbe ndị Farisii nụrụ na  Jesu emeela ka ndị Sadụsii mechie ọnụ ha, ha zukọtara ịchọpụta ajụjụ ọzọ ha ga-ajụ ya.

Otu onye n’ime ha bụ onye ozizi iwu bịara jụọ Jesu ajụjụ iji nwaa ya sị: “Onye ozizi, olee iwu kachasị mkpa n’ime iwu niile?”

Jesu zara sị ya, “Hụ Onyenwe gị bụ Chineke gị n’anya site n’obi gị niile na site na mkpụrụ obi gị niile, na site n’uche gị niile.

Nke a bụ iwu nke mbụ, bụrụkwa iwu kachasị iwu niile.’ Iwu ọzọ na-eso nke a n’idi mkpa bụ nke a,

“Hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka i si hụ onwe gị n’anya. Iwu ndị ọzọ niile na ihe niile ndị amụma chọrọ ka ụnụ mee dabeere n’ebe iwu abụọ ndị a dị.”

IHE ỌGỤGỤ ỤNYAHỤ: Igbo Mass Readings October 24 2020, Satọdee Izu Iri Abụọ na Itoolu n’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ ECHI: Igbo Mass Readings October 26 2020, Mọndee Izu Iri Atọ n’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings October 25 2020, Ụka Iri Atọ n’oge Adanyeghị n’Emume.

Sonyere anyị na Facebook na Igbo Mass Readings 

error: Alert: Content is protected !!