Igbo Mass Readings December 21 2021, Tuezde Izu nke Ano

Igbo Mass Readings December 21 2021, Tuezde Izuuka nke Ano n’oge Olileanya Onyenzoputa Anyi.

Igbo Mass Readings December 21 2021, Tuezde Izuuka nke Ano n’oge Olileanya Onyenzoputa Anyi – Catholic Lectionary.

Igbo Mass Readings December 21 2021, Tuezde Izuuka nke Ano n'oge Olileanya Onyenzoputa Anyi
Igbo Mass Readings December 21 2021, Tuezde Izuuka nke Ano n’oge Olileanya Onyenzoputa Anyi

EKPERE MMEGHE

Dinwenu, nuru ekpere ndi nke Gi; Mee ka anyi bu ndi na-eme emume nke omumu nke Nwa Gi dika mmadu nuria n’onyinye nke ndu ebighi ebi mgbe Q ga-abia n’otito Ya. Site na Dinwenu anyi Jesu Kristi …

IHE OGUGU NKE MBU: 2:8-14

Ihe ogugu ewetara na akwukwo Abu ka Abu

Ana m anu olu onye m huru n’anya. Lee ka o na abia. O si n’ugwu ukwu wuru na-awuda n’ugwu ntakiri. Onye m huru n’anya yiri mgbada, o dika nwaele.

Lee ka o guzo n’akuku mgbaaja, si na mpio ulo na n’oghere di na ya elebata anya. Onye m huru n’anya na-agwa m okwu na asi m: Bilie onye m huru n’anya puta ka anyi puo, gi bu o kacha mma nke m.

N’ihina oge oyi otutu agafeela; udummiri agafeela, mmiri ozuzo akwusįkwala. Okooko osisi aputabala n’elu uwa.

Ugbu a bu oge e ji agu egwu di uto. Ana-anu olu kparakuku n’ala anyi. Osisi Fiig amibala. Nduru m, si na mgbawara okwute na ebe nzuzo di n’okpuru ugwu gositu m ihu gi, kwe m nutu olu gi, n’ihi na olu gi di uto, ihu gi makwara mma.

(MA O BU)

IHE OGUGU NKE MBU: 3:14-18

Ihe ogugu ewetara na akwukwo onye amuma Zefanaya

Kwesie ukwe ike, gi ada Zayon; tie mkpu, gi Izrel! Were obi gi niile nuria ma goriwe, gi ada Jerusalem! Yahweh akagbuola ikpe niile mara gi, O chupula ndi iro gi niile.

Eze Izrel bu Yahweh no n’etiti gi, egwu ihe ojoo obula agaghi atu gi ozo. N’ubochi ahu a ga-agwa Jerusalem si: “egwu atula gi, gi Zayon, ekwela ka aka gi daa mba.

Yahweh Chukwu gi no n’etiti gi, odogwu na-enye mmeri; o ga-eji obiuto nuria na gi, o ga-emekwa ka I di ohuru n’ihunananya ya, o ga-eji nnukwu ukwe gorie na gi dika ubochi emume. “Aga m ewepuru gi odachi, nke na I gaghi enwe ihe mwute.

ABUOMA NA AZIZA: Ps 33, 2-3. 11-12. 20-21.

Aziza: Tierenu Chineke mkpu onu ndi eziomume, kwerenu Chineke ukwe o huru.

1. Werenu ubo akwara too Chineke;
werenu une kuoro ya egwu.
Kweerenu Chineke ukwe ohuru
werenu ike unu niile kweere Onyenweanyi ukwe mmeri. Aziza.

2. Mana atumaatu Chineke ga-adi okpu.
Echiche obi ya niile ga-adi ebeebe.
Añuri na Ngozi na-adiri mba Chineke bu Chukwu ha,
ndi nke o hooro dika ndi nke ya. Aziza.

3. Mkpuruobi anyi na eche Onyenweanyi;
Ya bu onye enyemaka anyi na onye ogbugbo anyi,
Mkpuruobi anyi na-añuri n’Onyenweanyi,

n’ihi na anyi tukwasiriobi n’aha ya di nso. Aziza.

ALLELUIA

ALLELUIA ALLELUIA:

Bia Emmanuel, ihu nke Chukwu n’ebe anyi no, onye eze anyi, onye ikpe anyi, Dinwenu na Chineke.

ALLELUIA.

ΟΖΙΟΜΑ MAKA DECEMBER 21 2021: 1:39-45

Ihe ogugu ewetara na ozioma di aso nke Luk dere.

N’oge ahu, Maria biliri, gaa osiso n’otu obodo di n’ugwu n’ala Judia. O banyere n’ulo Zekaria, kelee Elizabet. Mgbe Elizabet nuru olu ekele Maria, nwa o bu n’afo wuliri elu.

Elizabet juputara na Mmuo Nso wee tie mkpu onu si, “I di ngozi n’etiti umunwaanyi niile, o dikwa ngozi bu nwa afo gi bu Jesu.

Olee otu nke a si rute m aka na nne nke Onyenwe m biara ileta m? Lee, mgbe m nuru olu ekele gi, nwa no m n’afo wuliri elu n’oñu.

Ngozi na-adiri nwaanyi ahu nke kwere n’ihe niile Dinwenu gwara ya, ga-emezu.

EKPERE NHUNYE

Dinwenu Onye ihunaanya, nara onyinye ndi a nke I nyere Nzuko Gi. Mee ka ha ghooro anyi enyemaka nzoputa anyį. Anyi na-ario ihe ndia site na Krişti Dinwenu anyį. Amen.

EKPERE ANATACHA ORIRI NSO

Dinwenu, nyere anyi aka ife Gi n’uwa a ka anyi tozuo iketa oke nzoputa. Mee ka Eucharistia nke a buru nchedo anyi mgbe niile. Mezuoro anyį ihe ndi a site na Kristi Dinwenu anyį. Amen.

Maka inweta Ihe Ogugu ndi a ubochi niile, sonyere anyi na:

IHE ỌGỤGỤ ỤNYAHỤ: Igbo Mass Readings December 20 2021, Monde Izuuka nke Ano n’oge Olileanya Onyenzoputa Anyi

IHE ỌGỤGỤ ECHI: Igbo Mass Readings December 22 2021, Wednezde Izuuka nke Ano n’oge Olileanya Onyenzoputa Anyi

Igbo Mass Readings December 21 2021, Tuezde Izuuka nke Ano n’oge Olileanya Onyenzoputa Anyi – Catholic Lectionary.

error: Alert: Content is protected !!