Igbo Mass Readings December 22 2021, Wednezde Izuuka nke Ano

Igbo Mass Readings December 22 2021, Wednezde Izuuka nke Ano n’oge Olileanya Onyenzoputa Anyi.

Igbo Mass Readings December 22 2021, Wednezde Izuuka nke Ano n’oge Olileanya Onyenzoputa Anyi – Catholic Lectionary.

Igbo Mass Readings December 22 2021, Wednezde Izuuka nke Ano n'oge Olileanya Onyenzoputa Anyi
Igbo Mass Readings December 22 2021, Wednezde Izuuka nke Ano n’oge Olileanya Onyenzoputa Anyi

EKPERE MMEGHE

Chineke Nna anyi, I zitere Nwa Gi ka Q zoputa mmadu n’aka-ike nke onwu. Mee ka anyi bu ndi na-eme emume nke obibia Dinwenu anyi Jesu Kristi dika mmadu ketakwuo oke n’uju n’ibu Chukwu nke Q bu. Site na Dinwenų anyi Jesu Kristi …

IHE OGUGU NKE MBU: 1:24-28

Ihe ogugu ewetara na akwukwo mbu nke Samuel

Mgbe Hana napuchara nwata ahu ara, o kuuru ya, kpuru otu okeehi gbara afo ato, burukwa otu akpa ntu oka na otu udu mmanya, jee n’ulonso Yahweh na Shilo. Mgbe ha gbuchara oke ehi ahu, ha kpojeere Elai nwata ahu. Hana gwara Elai si, “Nnamukwu, ndeewo! Anwula! o bu m bu nwaanyi ahu kwuru n’ihu gi kpere Yahweh ekpere n’oge gara aga. O bu nwa a ka m rioro maka ya, Chineke wee nye m ihe m rioro ya.
Ya mere, ekuterela m ya Yahweh. Ubochi ndu ya niile o ga-abukwa nke Yahweh. Ha wee fee Yahweh ofufe ebe ahu.

ABUOMA NA AZIZA: 1 Samuel 2:1.4-5.6-7. 8.

Aziza: Obi m na-anuri onu nke ukwu n’Oseburuwa.

1. Obi m na-anuri onu nke ukwu n’Oseburuwa.
N’ihina o meela ka ike m di elu!
Ugbu a ka m nwere onu igwa ndi iro m okwu,
Na ihi na ana mañuri na nzoputa ya. Aziza

2. A nyajiele uta ndi bu dike
Ma e yiwela ndi adighi ike ike, dika aji,
Ndi na-eriju afo na mbu, na ejezi oru ngo maka ihe oriri.
Ma ndi aguu na-agu na-eriju afo ugbu a.
Nwaanyi aga amutala umu asaa
Ebe nwaanyi ahu mujuru ulo gbazi aka nwa. Aziza.

3. Yahweh na-eweta onwu, na-eweta ndu
O na-ezida ndi mmadu n’ala mmuo na-akpolitekwa ha
Yahweh na-eme ka ufodu daa ogbenye
na-emekwa ka ufodu buru ogaranya.
Ufodu ka o na-ebuda ala,
ufodu ka o na ebulikwa elu. Aziza.

4. O na-esi na ntų ekuli ndi ogbenye
O na esi n’ebe a na-ekpofu ahihia welite ndi no na mkpa.
Nye ha onodu n’etiti umu ndieze,
iji nye ha úgwù na nsopuru. Aziza.

ALLELUIA

ALLELUIA ALLELUIA:

Bia, eze nke uwa niile, isi iyi idi n’otu na okwukwe nke nzuko gi, zoputa mmadu niile bu o ru aka gi.

ALLELUIA.

OZIOMA MAKA DECEMBER 22 2021: 1:46-56

Ihe ogugu ewetara na ozioma di aso nke Luk dere.

Maria kwuru si: “Mkpuru obi m na-eto Dinwenu m Mmuo m na-anuri na Chukwu onye nzoputa m, Maka na o leele anya n’umeala odibo nwaanyi ya, site taata ndudugandu niile ga na-akpo m onye ngozi;

Maka na onye di ike emeerela m nnukwu ihe, aha ya di nso. Obi ebere ya si na ndudugandu ruo na ndudugandu maka ndi na aturu ya egwu, O gosila ike aka ya, o chusachaala ndi nganga di n’obi;

O sila n’ocheeze budaa ndi ukwu, bulie ndi umeala, O nyejuola ndi aguu na agu afo hapu ndi ogaranya ka ha gbara aka laa. O nyerela Izrel nwodibo ya aka, na ncheta ebere ya, Dika o si gwa nna anyi Abraham na mkpuru ya ebeebe.”

Maria nonyeere Elizabet ihe di ka onwa ato tupu o loghachi n’ulo ya.

Maka inweta Ihe Ogugu ndi a ubochi niile, sonyere anyi na:

IHE ỌGỤGỤ ỤNYAHỤ: Igbo Mass Readings December 21 2021, Tuezde Izuuka nke Ano n’oge Olileanya Onyenzoputa Anyi

IHE ỌGỤGỤ ECHI: Igbo Mass Readings December 23 2021, Tọọzdee Izuuka nke Ano n’oge Olileanya Onyenzoputa Anyi

Igbo Mass Readings December 22 2021, Wednezde Izuuka nke Ano n’oge Olileanya Onye nzoputa Anyi – Catholic Lectionary.

error: Alert: Content is protected !!