Igbo Mass Readings December 23 2021, Tọọzdee Izuuka nke Ano

Igbo Mass Readings December 23 2021, Tọọzdee Izuuka nke Ano n’oge Olileanya Onyenzoputa Anyi.

Igbo Mass Readings December 23 2021, Tọọzdee Izuuka nke Ano n’oge Olileanya Onyenzoputa Anyi – Catholic Lectionary.

Igbo Mass Readings December 23 2021, Tọọzdee Izuuka nke Ano n'oge Olileanya Onyenzoputa Anyi
Igbo Mass Readings December 23 2021, Tọọzdee Izuuka nke Ano n’oge Olileanya Onyenzoputa Anyi

EKPERE MMEGHE

Nna, anyi na-achighari uche n’omumu nke Nwa Gį. Amuru Ya site na Virgin Maria, O bia binyere anyi. Mee ka anyį nata mgbaghara njo na ebere. Site na Dinwenu anyi Jesu Kristi …

IHE OGUGU NKE MBU: 3:1-4, 23-24

Ihe ogugu ewetara na akwukwo onye amuma Malaki

Lee, ana m ezipu onyeozi m ka o kwadoro m uzo. Ma Yahweh onye nke unu na-atu anya ya ga abata n’ulonso ya na mberede; lee onyeozi nke ogbugbandu ahu unu na-enwe mmasi na ya na abia.

O bu Yahweh nke igwe ndiagha na ekwu. Ma onye ga-edi ubochi obibia ya, onye ga eguzokwa ma o puta?

“N’ihi na o ga-adi ka oku ihe nñucha na ncha e ji asu akwa; o ga-anodu ala dika onye nnucha na nsacha nke olaocha, o ga asachakwa umu Levai ma nucha ha di ka olaedo na olaocha ruo mgbe ha ga-ewetera Yahweh ihe onyinye kwesiri ekwesi.

Mgbe ahu onyinye nke Juda na Jerusalem ga amasi Yahweh dika o di na mgbe ochie n’afo ndi ahu gara aga. “Lee, aga m ezitere unu Elaija tupu oke ubochi nke Yahweh ahu di egwu abia.

O ga atugharikwa obi ndi nna n’ebe umu ha no, ma tugharikwa obi umu n’ebe ndi nna ha no, ma o bughi otu ahu, aga m abia ibu ala ahu onu.

ABUOMA NA AZIZA: Ps: 25: 4-5. 8-9.10.14.

Aziza: Welitenu isi unų, lelie anya elu, n’ihi na oge mgbaputa unu abiala nso

  1. Mee ka m mata uzo gi, o Onyenweanyi,
    Kuziere m uzo gi,
    Dube m n’uzo eziokwu gi, ma kuzibere m,
    N’ihi na o bu Chineke onye nzoputa m. Aziza

2. Onyenweanyi di mma, burukwa onye eziomume,
O na-akuziri ndi mmehie uzo
O na-eduzi ndi umeala n’ihe niile kwu oto,
O na-akuziri ndi ogbenye uzo ya. Aziza

3. Uzo nke Onyenweanyi bu ihunaanya na eziokwu,
n’ebe ndi na-edebe iwu ya na ogbugbandu ya no.
Ndi na-atu Onyenweanyi egwu maara ihe omimi ya
Ogbugbandu ya na-enye ha nghota. Aziza

ALLELUIA

ALLELUIA ALLELUIA:

Bia n’etiti anyi Emmanuel, gi bu Chineke no n’etiti anyi, gi bu eze anyi, gi bukwa onye ikpe anyi, zoputa anyi Onyenweanyi na Chineke anyi.

ALLELUIA.

OZIOMA MAKA DECEMBER 23 2021: 1:57-66

Ihe ogugu ewetara n’ozioma di aso nke Luk dere.

Ugbu a, oge ruru mgbe Elizabet ga-eji muo nwa, o wee muo nwa nwoke. Mgbe ndi agbataobi na ndi ikwu na ibe ya nuru na Dinwenu egosila ebere ya n’ebe o no, ha sooro ya nuria onu.

N’ubochi nke asato ha zukoro ibi nwata ahu ugwu, ha gaara akpo ya Zekaria, aha nna ya. Ma Elizabet zara si, “Mba; a ga-akpo ya Jon.” Ha azaa ya si, “O nweghi onye obula n’ime ndi ikwu na ibe gi na-aza aha di otu a.”

Ha meere nna ya akara ka ha mara aha o choro ka a kpoo nwa ya. O wee rio ka enye ya ihe eji ede akwukwo. O dere, “Aha ya bu Jon.”

Nke a turu ha niile n’anya. Ozigbo ahu, onu ya meghee, ire ya toghepu, o bia kwube okwu, na-agozi Chineke. Ujo turu ndi agbataobi ha niile.

Ndi mmadu kwusara ihe ndi a n’obodo niile nke Judia; Ndi niile nuru ihe merenu chebaara ihe ndi a echiche, na-aju si, “Gini ka nwatakiri a ga-abu?” N’ihi na ike nke Dinwenu nonyeere ya.

EKPERE NHUNYE

Dinwenu, I nyela anyi ihe ncheta nke a dika uzo zuru oke esi efe Gi ofufe. Doghachie anyi n’onodu udo Gi ma kwadobe anyį maka emume nke obibja Onye nzoputa anyi, n’ihina O bu Dinwenu ebighi ebi, ebighi ebi. Amen.

EKPERE ANATACHA ORIRI NSO

Dinwenu, ebe I ji achicha nke ndu azu anyį nrį, tinyekwa n’ime Mmuo anyį ma kwadobekwa anyjiji okwukwe na-anu oku nabata Nwa Gį. Anyi na-ario ihe ndia site na Kristi Dinwenu anyi. Amen.

Maka inweta Ihe Ogugu ndi a ubochi niile, sonyere anyi na:

IHE ỌGỤGỤ ỤNYAHỤ: Igbo Mass Readings December 22 2021, Wednezde Izuuka nke Ano n’oge Olileanya Onyenzoputa Anyi

IHE ỌGỤGỤ ECHI: 

Igbo Mass Readings December 23 2021, Tọọzdee Izuuka nke Ano n’oge Olileanya Onyenzoputa Anyi – Catholic Lectionary.

error: Alert: Content is protected !!