Igbo Mass Readings for December 24 2021, Uka nke Ututu

EKPERE MMEGHE

Bia, Dinwenu Jesu, atufula oge, nye ndi nke Gi, ndi tukwasara obi n’jhunaanya Gi obi-isi-ike ohuru. Site n’objbja Gi, kulite anyį n’anurį nke alaeze Gi, ebe I di ndu na-achieze n’idiko n’otu nke Mmuo Nso, otu Chukwusite n’uwatuwa niile. Amen.

Ihe Ogugu nke mbu 7:1-5, 8-11, 16
Ihe ogugu ewetara na akwukwo abuo nke Samuel

Mgbe Yahweh nyere Devid ezumike n’ebe ndiiro gbara ya gburugburu no, Devid wee biri n’ulo o ya. Devid siri onye amuma Natan, :Lee ugbu a, ebi m n’ulo osisi sida. Ma igbe Ogbugbandu Chineke doro n’ime uloikwu” Natan zara ya si: “Gaa mee ihe obula di gi n’uche n’ihi na Oseburuwa nonyeere gi.” Ma na-abali ubochi ahu, Yahweh ziri Natan si, “Jee gwa odibo m bu Devid, na m si ya, ‘O bu gi ga-aruru m ulo ebe m ga ebi? Ya mere, jee gwa odibo m bu Devid na mu, bu Chineke nke igwe ndiagha, si ya, ‘Esiri m ebe I na-azu aturu n’ohia kpoputa gi, mekwaa ka I buru onyendu ndi nke m bu Izrel. Anonyekwaara m gi ebe obula I jere merikwaa ndi iro gi niile, n’ihu gi. Aga m emekwa ka aha gi di ukwu dika ndi aha ha kacha di ukwu. Aga m ahoputara ndi nke m bu Izrel otu ebe, kuokwa ha dika osisi n’ebe ahu. Ha ga-ebikwa n’ebe ahu na-enweghi nsogbu ozo; ndi obi ojoo agaghi akpagbukwa ha ka na mbu, bido mgbe m hoputaara ndi nke m Izrel ndi ikpe; aga m enye ha ezumike site n’aka ndiiro ha. Aga m eme ka I di ukwu; aga m ewuru gi ulo. Ezinuulo gi na alaeze gi ga-adi ebeebe. Aga m akwudosi ocheeze gi ike ebeebe.

ABUOMA NA AZIZA: Ps: 89: 2-3, 4-5, 27, 29.

Aziza: Aga m eji ukwe kwuputa jhunaanya nke Onyenweanyi ebeebe ebeebe.

  1. Aga m eji ukwe kwuputa jhunaanya nke Onyenweanyi ebeebe ebeebe

Bido na ndudugandų ruo na ndudugandu aga m na-ekwuputa ntukwasiobi gi N’ihi na ihunaanya gi ga-adi ebeebe, ikwesi ntukwasiobi gi ga-akwudosi ike dika igwe. Az./

  1. “Mu na onye m hooro agbala ndu añuorola m Devid nwodibo m iyi. Aga m eme ka ochichi gi di ebeebe, Aga m emekwa ka ocheeze gi digide ruo na ndudugandu niile. Az./
  2. O ga-ebeku m si, “I bu nna m” Chineke m na onye enyemaka m Aga m ahu ya n’anya ebeebe Ogbugbandų mu na ya ga-adi okpu. Az./

ALLELUIA ALLELUIA:
Bia n’etiti anyi Emmanuel, gi bu Chineke no n’etiti anyi, gi bu eze anyi, gi bukwa onye ikpe anyi, zoputa anyi Onyenweanyi na Chineke anyi. ALLELUIA.

ΟΖΙΟΜΑ: 1:67-79
Ihe ogugu ewetara n’ozioma di aso nke Luk dere.
Nna ya bu Zekaria juputara na Mmuo Nso, bue amuma si: “Ngozi diri Dinwenu Chineke nke Izrel makana o biara leta ma zoputakwa ndi nke ya. O weliterela anyi onyenzoputa site n’agburu Devid, nwodibo ya; Otu o siri kwuo n’oge ochie, site n’onu ndi amuma ya; Na a ga-azoputa anyi site n’aka ndi iro anyi, na sitekwa na-aka ndi niile kporo anyi asi. Gosi ebere nke o kwere nnanna anyi ha na nkwa, bia chetakwa ogbugbandu ya di nso O nuuru nnanna anyi bu Abraham iyi. Kwekwa nkwa na ya ga-azoputa anyi na-aka ndi iro anyi. Ka anyi nwee ike na-ekpere ya n’atughi egwu obula, n’idi nso na eziomume n’ihu ya ubochi niile nke ndu anyi.
Ma gi bu nwa, ka a ga-akpo onye amuma nke onye kacha elu; N’ihina I ga-aga n’ihu Dinwenu idoziri ya uzo ya niile. Ime ka ha nwee amamihe nke nzoputa site na mgbaghara nke njo ha. Site n’obi ebere nke Chineke anyi, o ga-eme ka anyanwu ututu biakwasa ndi nke ya; Inye ndi niile no n’ochichiri na onyinyo nke onwu ihè. Bia duzie ukwu anyi n’uzo nke udo.

Ozioma nke Oseburuwa Otito diri Gi, Kristi.

EKPERE NHUNYE

Nna, nara onyinye ndi a anyį na-ehunyere. Site n’iketa oke na Eucharistia nke a, zoputa anyi na njo ma nyekwara anyį aka iji okwukwe na atuanya obibia di otito nke Nwa Gi, Onye bu Dinwenu ebighi ebi, ebighi ebi. Amen.

EKPERE ANATACHA ORIRI NSO

Dinwenu, onyinye nke Eucharistia I nyere anyi emeela ka ndų anyi di ohuru. Mee ka anyį bu ndi nwere olileanya maka nnukwu oriri nke omumu Kristi na-anuri oge niile n’itunaanya nke ihunaanya Ya n’ihina o bu Dinwenu ebighi ebi, ebighi ebi. Amen.

error: Alert: Content is protected !!