Igbo Mass Readings November 30 2020, Emume Andru Dị Nsọ, Nwaazụ

Igbo Mass Readings November 30 2020, Emume Andru Dị Nsọ, Nwaazụ.

Igbo Mass Readings November 30 2020, Emume Andru Dị Nsọ, Nwaazụ.
Igbo Mass Readings November 30 2020, Emume Andru Dị Nsọ, Nwaazụ.

UKWE MBATA       Matt 4:18-19

Ka Jesu na-aga na-akụkụ osimiri Galili ọ hụrụ ụmụnne abụọ Pịta na Andru. Ọ sị ha, “Sonụ m! Aga m eme ụnụ ndị ọkụ mmadụ.”

EKPERE MMEGHE

Onyenweanyị, n’ime obiọma Gị nụrụ ekpere anyị. Ị kpọrọ Andru dị nsọ nwaazụ Gị ka okwusaa oziọma ma duzie nzukọ Gị n’okwukwe. Biko, mee ka ọ bụrụ ezigbo enyi anyị n’ihu Gị, bịakwa nyere anyị aka site n’ekpere ya. Site na Dinwenụ anyị Jesu ….

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ            10:9-18

Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Pọl degaara ndị Rom.

N’ihina ọ bụrụ na ị ga-ewere ọnụ gị kwupụta na Jesu bụ Onyenweanyị, ọ bụrụkwa na ị ga-ewere obi gị kwere na Chineke mere ka O si na n’ọnwụ bilie, a ga-azọpụta gị!

Ọ bụ site n’iji obi anyị kwere, ka Chineke ji gụnye anyị na ndị eziomume sitekwa n’iji ọnụ anyị kwupụta Kristi, ka e ji zọpụta anyị. Akwụkwọ Nsọ na-ekwu sị, “Onye ọbụla nke kwere na ya, Chineke agaghị ekwe ka ihere mee ya.”

Nke a bụ maka mmadụ niile, maka n’ime Kristi, o nweghị ihe dị iche n’etiti ndị Juu na ndị Grik. Chineke bụ Dinwenụ nke mmadụ niile.

Ọ na-egosikwa afọma ya n’ebe ndị na-akpọku ya nọ. Dịka Akwụkwọ Nsọ si kwuo, “Onye ọbụla nke na akpọku ya ga-enweta nzọpụta.”

Ma olee otu ụmụ mmadụ ga-esi akpọku onye ahụ nke ha na-ekweghị na ya? Ha ga-esi aghaa nụ ma ọ bụrụ na onye na-ezisa oziọma agwaghị ha okwu?

A ga-esi aghaa kwusa oziọma ahụ ma ọ bụrụ na e zipụghị ndịozi? Dịka Akwụkwọ Nsọ na-ekwu, “Lee ka ha si maa mma nke ukwu, bụ ụkwụ nke ndị na-ezisa oziọma!”

Ọ bụghị mmadụ niile narala oziọma ahụ. Aịzaya n’onwe ya kwuru sị, “Onyenweanyị, onye kwerela ihe anyị kwuru? Ya bụ, okwukwe si n’ọnụnụ pụta.

Ọnụnụ ahụ sikwara n’ikwusa okwu Kristi. Ka m jụọ: Ọ bụ na ha anụbeghị okwu Chineke? N’ezie, ha anụla ya. Dịka Akwụkwọ Nsọ si kwuo, “Ụdaolu ha agazuola ụwa niile, okwu ha eruola nsọtụ ụwa niile.

ABỤỌMA NA AZỊZA:   Ps. 19:1-2, 3-4.

Azịza:  Ozi ha na-eru nsọtụ ụwa niile.

1.Eluigwe na-ekwupụta ebube Chineke

Ihe niile dị na mbara Eluigwe na-ekwupụta ọrụ aka ya,

Ụbọchị niile na-ekwupụta ya,

Abalị ọbụla na-egosịpụta amamiihe nke Chineke. Azịza.

2. Ha anaghị ekwu okwu nke ha na-eme ụzụ nke mmadụ ga-anụ,

Mana olu ha na-agazu ụwa niile.

Ozi ha na-eru nsọtụ ụwa niile. Azịza.

MBEKU         

Alleluịa, Alleluịa:

“Sonụ m! Aga m eme ụnụ ndị ọkụ mmadụ.

Alleluịa.

Oziọma maka November 30 2020  – Matiu 4:18-22.

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere.

Ka Jesu na-aga n’akụkụ osimiri Galili, ọ hụrụ ụmụnne abụọ, Saịmọn onye a na-akpọ Pịta na Andru nwanne ya, ka ha na-awụnye ụgbụ ha na mmiri n’ihina ha bụ ndị ọkụ azụ.

Ọ sị ha, “Sonụ m! Aga m eme ụnụ ndị ọkụ mmadụ” Ozigbo ahụ, ha hapụ ụgbụ ha sobe ya. Mgbe Jesu si ebe ahụ na-aga, ọ hụrụ ụmụnne abụọ ọzọ bụ Jemis na Jọn ụmụ Zebedi, ka ha na nna ha nọ n’ụgbọ mmiri na-emezi ụgbụ ha.

Jesu kpọrọ ha. Ozigbo ahụ ha hapụrụ ụgbọmmiri ha na nna ha sobe ya.

EKPERE NHUNYE

Chineke Nna pụrụ ime ihe niile, Biko kwe ka onyinye ndị a anyị na-ebutere Gị n’ụbọchị taa bụ oriri nke Andru dị nsọ kwesị Gị ịnaranụ, bịakwa nye ndị niile ga-anata ya ndụ n’ime ha. Site na Kristi ….

UKWE ORIRI NSỌ           Jọn 1:41-42

Andru gwara nwanne ya bụ Saịmọn sị, “Anyị achọtala mezeya ahụ, Kristi; ọ kpọtaara ya Jesu.

EKPERE A NATACHAA ORIRI NSỌ

Onyenweanyị, mee ka anyị site na Sakramentị nke a anyị natara nye anyị ike iso nzọụkwụ Andru dị nsọ, nwaazụ Gị. Site n’iketa oke n’ahụhụ Kristi, biko kwe ka anyị soro Ya keta ndụ ebighị ebi n’eluigwe, ebe Ọ dị ndụ, na-achị, ebighị ebi. Amen.

IHE ỌGỤGỤ ỤNYAHỤ: Igbo Mass Readings November 29 2020, Ụka nke Mbu n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị – Afọ Nke Abụọ.

IHE ỌGỤGỤ ECHI:    Igbo Mass Readings December 1 2020, Tuezde Izuụka nke Mbu n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta.

Igbo Mass Readings November 30 2020, Emume Andru Dị Nsọ, Nwaazụ.

Sonyere anyị na Facebook na Igbo Mass Readings 

error: Alert: Content is protected !!