Igbo Mass Readings November 1 2020 Emume Ndị Nsọ Niile

Igbo Mass Readings November 1 2020 Emume Ndị Nsọ Niile.

Igbo Mass Readings November 1 2020 Emume Ndị Nsọ Niile.
Igbo Mass Readings November 1 2020 Emume Ndị Nsọ Niile.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ      7:2-4, 90-14

Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Mkpughe

Isi Okwu:  Ahụrụ m nnukwu igwe mmadụ ndị dị ọtụtụ n’ọnụ ọgụgụ

Mgbe ahụ, ahụrụ m mmụọma ọzọ ka o si n’ọwụwa anyanwụ na-abọlite. O ji akara Chineke dị ndụ n’aka ya. O jiri olu ike tikuo mmụọma anọ ahụ, e kenyere ọrụ imebi ala na oke osimiri.

“Cherenụ!  Ụnụ emebikwala ala, ma ọ bụ oke osimiri, ma ọ bụ osisi, ruo mgbe a kachara ụmụodibo Chineke akara n’egedege ihu.” Mgbe ahụ ka m nụrụ ọnụ ọgụgụ ndị a kara akara ahụ.

Ha dị narị puku mmadụ, na iri puku mmadụ anọ na anọ, ndị si n’ọnụmara niile nke Izrel.

Mgbe ihe ndị a gasịrị, ahụrụ m nnukwu igwe mmadụ, ndị dị ọtụtụ n’ọnụ ọgụgụ. Ha si n’obodo niile, na agbụrụ niile, na ebo niile na asụsụ niile.

Ha guzoro n’ihu oche eze ahụ, na n’ihu Nwatụrụ ahụ. Ha niile yi uwe nzaru ala ọcha, bịakwa jide igu nkwụ n’aka ha.

Mkpu ha na-etisi ike bụ: “Chineke anyị, Onye nọ n’oche eze new mmeri! Ya na Nwatụrụ ahụ!”

Ndị mmụọma niile bịara nso oche eze ahụ na-agba ya gburugburu, na-agbakwa ocheeze ndị okenye ahụ gburugburu na ihe ekere eke anọ ahụ dị ndụ.

Ha kpọrọ isi ala na-efe Chineke na-asị: “Amen! Otito na ebube na amamihe na ekele na ugwu na ike na ikikere dịrị Chineke anyị, ebighị ebi, ebighị ebi, Amen.”

Otu n’ime ndị okenye ahụ jụrụ m sị: “Ị ma ndị a yi uwe nzaru ala ọcha? Ị ma ebe ha si bịa?” M zaa ya; “Nna m ukwu, i nwere i gwa m?”

O wee sị m: “Ndị a bụ ndị ahụ e megburu n’ihi okwukwe. Ebe ọ bụ na ha asachaala uwe nzaru ala ọcha ha n’ọbara nke Nwatụrụ, ugbu a ha guzoro n’ihu oche eze Chineke, na-efe Ya ehihie na abalị n’ebe Ya kacha nsọ.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA:       Ps. 23:1-6.  Az. 6

Azịza:  Ndị dị otu a na-achọ ihu Gị, O Dinwenụ.

  1. Ala na ihe niile dị n’ime ya bụkọta nke Osebụrụwa, Ụwa na ndị niile bi n’ime ya. Ọ bụ ya kwụbara ala n’elu oke osimiri. O mere ya ọ kwụsie ike n’elu mmiri. Azịza
  2. Olee onye ga-arigo n’ugwu nke Osebụrụwa? Olee onye ga-eguzo n’ụlọ nsọ ya? Ọ bụ naanị onye aka ya kwụ ọtọ, onye obi ya dị ọcha, onye anaghị achọ ihe efu ọbụla na ndụ ya. Azịza.
  3. Ọ ga-anata ngọzi n’aka Osebụrụwa, Ọ ga-anata ụgwọ n’aka Chineke onye na-azọpụta ya. Ndị dị otu a bụ ndị na-achọ ya, ndị na-achọ ihu Chineke nke Jekọb. Azịza.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ                 3:1-3

Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Mbụ Jọn dere

Isi Okwu: Anyị ga-ahụ ya ka o si dị n’ezi okwu.

Chetanụ ịhụnaanya Nna nwere n’ebe anyị nọ, site n’ime ka a kpọọ anyị ụmụ Chineke. N’ezie ọ bụ ihe anyị bụ. N’ihi na ụwa jụrụ ịnabata Ya, ka ụwa jiri jụ ịnabata anyị.

Ndị nọ m n’obi! Anyị aghọọlarị ụmụ Chineke ugbu a. Ma ihe anyị ga-abụ n’ọdịnihu apụtabeghị ihe.

Ihe anyị ma bụ, na mgbe a ga-eme ka ọ pụta ihe, anyị ga-adị ka Ya. Maka na anyị ga-ahụ Ya, ka o si dị n’ezi okwu.

Onye ọ bụla nwere nchekwube a, na-edebe onwe ya ọcha, bịakwa na-agba mbọ ịdị ọcha ka Kristi.

ALLELUỊA             Matiu 11:28

Alleluịa, Alleluịa:

Onyenweanyị kwuru sị: “Bịakwutenụ M, ụnụ niile ndị na-arụ ọrụ, ndị ibu na-anyịgbu. Aga M enye ụnụ ezumike.

Alleluịa.

Oziọma maka November 1 2020 – Matiu 5:1-12

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Isi Okwu: Ñụrịanụ, obi tọọkwa ụnụ ụtọ n’ihi na ụgwọ ọrụ dị ukwuu n’eluigwe.

Mgbe Jesu hụrụ igwe mmadụ ahụ, Ọ rịgooro n’elu ugwu, nọdụ ala. Ụmụ Ya bịara nọdụ Ya gburugburu. O bido ikwu okwu.

Lee ihe Ọ kụziiri ha: “Ngọzi dịrị ndị dara ogbenye n’ime mmụọ: Alaeze eluigwe bụ nke ha. Ngọzi dịrị ndị dị umeala: Ha ga-eketa ala.

Ngọzi dịrị ndị na-eru ụjụ: A ga-akasị ha obi. Ngọzi dịrị ndị ezi omume na-agụ agụụ ka nri, na ndị akpịrị na-akpọ nkụ maka eziomume: Ha ga-enwe afọ ojuju.

Ngọzi dịrị ndị obi ebere. A ga-emere ha ebere. Ngọzi dịrị ndị obi ha dị ọcha. Ha ga-ahụ Chineke anya. Ngọzi dịrị ndị na-ekpe udo. A ga-akpọ ha ụmụ Chineke.

Ngọzi dịrị ndị a na-emegbu emegbu n’ihi ezi omume. Alaeze eluigwe bụ nke ha.

“Ngọzi dịrị ụnụ, mgbe ndị mmadụ na-akọcha ụnụ, na-emegbu ụnụ, na-ebo ụnụ ebubo ụgha di iche iche, iji kwutọọ ụnụ n’ihi M.

Ñụrịanụ ọñụ n’ihi ya. Ka obi tọọkwa ụnụ ụtọ. N’ihina ụgwọ ụnụ buru nnukwu ibu n’eluigwe. Otu a ka ha si megbu ndị amụma bu ụnụ ụzọ bịa.”

IHE ỌGỤGỤ ỤNYAHỤ: Igbo Mass Readings October 31 2020, Satọdee Izu Iri Atọ n’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ ECHI:  Igbo Mass Readings November 2 2020, Ncheta Mkpụrụobi Ndị Niile Kwerenụ Gara Aga.

Igbo Mass Readings November 1 2020 Emume Ndị Nsọ Niile.

Sonyere anyị na Facebook na Igbo Mass Readings 

error: Alert: Content is protected !!