Igbo Mass Readings October 7, 2020, Marịa, Ezenwanyị Nke Rosarị

Igbo Mass Readings October 7 2020, Nne Anyị Dị Asọ, Ezenwanyị Nke Rosarị.

Igbo Mass Readings October 7 2020, Nne Anyị Dị Asọ,  Ezenwanyị Nke Rosarị.
Igbo Mass Readings October 7 2020, Nne Anyị Dị Asọ, Ezenwanyị Nke Rosarị.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ        1:12-14

Ihe ọgụgụ e wetara n’Ọrụ Ndịozi

Mgbe ahụ ndịozi iri na otu ahụ siri n’ugwu a na-akpọ Olivet dị Jerusalem nso laghachi Jerusalem ihe dịka njem otu ụbọchị izuike.

Mgbe ha batara Jerusalem, ha rịgooro n’ime ụlọ ahụ dị n’ụlọ elu, ebe ha nọbu. Ndịozi ndị a bụ Pịta, Jọn, Jemis, Andru, Filip, Tọmọs, Batolomi na Matiu, Jemis nwa Alfeus, Saịmọn nke Zilọt na Judas nwa Jemis.

Ndị a niile ji otu obi nọgidesie ike n’ekpere, ha na ụmụnwaanyị ụfọdụ na Meri nne Jesu na ụmụnne ya.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA: Lk 1:46-47, 48, 49-50, 51-52, 53-54, 55-56

Azịza: Onye dị ike emeerela m nnukwu ihe, aha ya dị asọ

  1. Mkpụrụobi m na-eto Dinwenụ m

Mụọ m na añụrị na Chukwu onye nzọpụta m. Azịza.

2. Maka na o leele anya n’umeala odibo nwaanyị ya,

Site taata ndụdụgandụ niile ga na-akpọ m onye dị ngọzi.

Maka na onye dị ike emeerela m nnukwu ihe,

Aha ya dị nsọ. Azịza.

3. Obi ebere ya sin a ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ

Maka ndị na-atụrụ ya egwu.

O gosila ike aka ya,

ọ chụsachaala ndị nganga dị n’obi. Azịza.

4. O sila n’ocheeze budaa ndị ukwu,

Bulie ndị umeala.

O nyejuola ndị agụụ na-agụ afọ

hapụ ndị ọgaranya ka ha gbara aka laa. Azịza.

5. O nyerela Izrel nwodibo ya aka,

Na ncheta ebere ya.

dịka o si gwa nna anyị Abraham

na mkpụrụ ya ebeebe. Azịza.

MBEKU

Alleluịa, Alleluịa:

Jesu sịrị ya, “Mụ onwe m bụ ụzọ, eziokwu na ndụ. Ọ dịghị onye ọ bụla ga-abịakwute Nna ma ọ bughị site na m.

Alleluịa.

Oziọma maka October 7, 2020 – Luk 1:26-38

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

N’ọnwa nke isii, Chineke zigara Mmụọọma Gebrel ka ọ gaa n’obodo Galili a na-akpọ Nazaret; ka ọ gakwuru otu nwagbọghọ na amaghị nwoke, onye ikwunibe ya kwekọrịtara na otu nwoke aha ya bụ Josef, nke si n’agbụrụ Devid ga-alụ.

Aha nwagbọghọ ahụ bụ Marịa. Mmụọọma ahụ bịakwute Marịa sị ya, “Ekele, Ị jupụrụ na grasịa, Osebụrụ nọnyere gị!” Obi lọrọ ya mmiri nke ukwuu n’ụdị ekele a, nke mere na ọ malitere ịtụle n’uche ya ihe ụdị a pụtara.

Mmụọọma ahụ  sịrị ya, “Atụla egwu, Marịa, n’ihi na Ị natala ngọzi n’aka Chineke. Lee Ị ga-adị ime, mụta nwa nwoke; aha Ị ga-akpọ ya bụ Jesu.

Ọ ga-adị ukwuu, a ga-akpọkwa ya nwa onye kacha elu. Dinwenụ Chineke ga-enye ya ocheeze nna ya Devid.

Ọ ga-achị ezinụụlọ Jekọb ebeebe; alaeze ya agaghị enwe ọgwụgwụ.” Marịa jụrụ Mmụọọma ahụ sị, “O lee otu nke a ga-esi mee ebe ọ bụ amaghị m nwoke?”

Ma Mmụọọma ahụ zara ya sị, “Mmụọ Nsọ ga-abịakwasa gị; ike nke onye kacha elu ga-ekpuchi gị. N’ihi nke a, aga akpọ nwa ahụ Ị ga-amụ; Onye nsọ, nwa Chineke.

Lee, Elizabet onye ikwu gị, onye ndị mmadụ na-akpọ nwaanyị aga, atụrụla ime n’agadi ya; ugbu a ọ dị ime ọnwa isii. N’ihi na ebe Chineke nọ, o nweghị ihe nyịrị omume.”

Marịa kwuru sị, “Lee, abụ m odibo nwaanyị nke Osebụrụwa, ka o reere m ka Ị siri kwu.” Mmụọọma ahụ wee si n’ebe ọ nọ pụọ.

IHE ỌGỤGỤ ỤNYAHỤ: Igbo Mass Readings October 6 2020 Tuezde Izu Nke Iri Abụọ na Asaa n’oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ ECHI:  Igbo Mass Readings October 8 2020, Tọọzdee Nke Izu Iri Abụọ na Asaa Oge Adanyeghị n’Emume

Igbo Mass Readings October 7 2020, Nne Anyị Dị Asọ, Ezenwanyị Nke Rosarị.

Sonyere anyị na Facebook na Igbo Mass Readings

error: Alert: Content is protected !!