Igbo Mass Readings November 29 2020, Ụka nke Mbu n’Oge Adventi Yr B

Igbo Mass Readings November 29 2020, Ụka nke Mbu n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị – Afọ Nke Abụọ.

Igbo Mass Readings November 29 2020, Ụka nke Mbu n'Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị - Afọ Nke Abụọ.
Igbo Mass Readings November 29 2020, Ụka nke Mbu n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị – Afọ Nke Abụọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ   63:16-17, 19, 64:2-7

Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye Amụma Aịzaya.

Isi Okwu: Tiwapụ eluigwe gbadata

Onyenweanyị, Ị bụ Nna anyị. Onye Nzọpụta Anyị bụ aha ochie Gị. Onyenweanyị, gịnị kapatara I jiri hapụka anyị na-agahierị, na-ahapụkwa ụzọ Gị?

Gịnị kpatara I jiri hapụ ka anyị kpọchie obi, ghara ịtụrụ Gị egwu? Kpọghachie anyị azụ, n’ihi ụmụodibo Gị, na agbụrụ ahụ Ị họọrọ ka ha bụrụ ndị nke Gị.

Ewoo! Ọ ga-ama mma ma a sị Gị tiwaa eluigwe gbadata! Ka ugwu ukwu gbazee n’ihu Gị! Ka a hụ ihe na-emebeghị mbụ; nụ ihe na-anụbeghị mbụ!

Anya ahụbeghị; ntị anụbeghị na e nwere chi dị ka Gị; Onye na-arụ ọrụ ebube maka ndị tụkwasara Ya obi. Ị na-eduzi ndị kwụbara aka ọtọ; ndị bụ iwu Gị n’obi.

Iwe were Gị mgbe anyị bụ ndị njọ. O teela anyị na-enupụrụ Gị isi. Anyị niile dị ka ndị rụrụ arụ. Ịkwụba aka ọtọ anyị ahụ dị ka nkịrịka akwa ruru inyi.

Anyị niile akpọnwụọla ka ahịhịa. Mmehie anyị na-ebugharị anyị ka ikuku. O nweghị onye kpọkuru aha Gi; nke a na-enwe onye metụrụ ụñara imetụ Gị aka.

Maka na Ị zolahara anyị ihụ Gị, bịakwa tụhapụ anyị ka anyị na-agwọtọgharị na njọ anyị.

Onyenweanyị, n’ezie Ị bụ Nna anyị. Anyị bụ ụrọ; Gị bụ Ọkpụite. Anyị niile bụ ọrụ aka Gị.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA:   Ps. 80:2-3, 15-16, 18-19, Az. 4

Azịza: Chineke nke igwe ndị agha, kpọghachi anyị azụ. Mee ka ihu Gị chakwasị anyị, ka anyị wee nweta nzọpụta.

1.Onye nche nke Izrel, tọọ ntị n’ala nụrụ olu anyị. Si n’oche eze ebe I ji ndị Mmụọma gbakwasị ụkwụ, chawapụta. Kpalite ike Gị, bịa zọpụta anyị. Azịza.

2. Chineke nke igwe ndị agha, anyị na-arịọ Gị, chee anyị ihu ọzọ kwa. Si n’eluigwe ledata anya n’ala ka Ị hụ. Azịza.

3. Ka enyemaka Gị nọnyere Onye Ị họtara ahọta; Onye I jiri aka Gị nye mgbasike. Mgbe ahụ, anyị agaghịkwa agbalaha Gị ọzọ. Nye anyị ndụ ọhụrụ, ka anyị wee na-akpọku aha Gị. Azịza.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ            1:3-9

Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Ozi Mbụ Pọl dị asọ degaara Ndị Kọrịnt.

Isi Okwu: Anyị na-eche ka e gosi anyị Onyenweanyị Jesu Kristi.

Ka Chineke Nna na Onyenweanyị Jesu Kristi zitere ụnụ amara na udo. Ana m ekele Chineke akwụsịghị akwụsị, maka amara niile dị iche iche, ụnụ natara site na Jesu Kristi.

Ana m ekele Ya, na O mere ka ụnụ baa ụba n’ọtụtụ ụzọ dị iche iche; ọ kachasị n’inwe ndị nkụzi na ndị na-ekwu okwuchukwu.

N’ezie, ịgbara Kristi akaebe siri ike n’etiti ụnụ; nke pụtara na Ọ gbawaghị ụnụ aka onyinye nke Mmụọ Nsọ, ebe ụnụ na-eche ka e gosi Onyenweanyị, Jesu Kristi.

O ga-eme ka ụnụ guzosie ike; ka a ghara ịta ụnụ ụta ruo n’ụbọchị ikpeazụ; nke bụ ụbọchị Onyenweanyị Jesu Kristi.

N’ihi na mgbe Chineke kpọrọ ụnụ oku, O jikọtara ụnụ na Nwa Ya, Jesu Kristi. Chineke bụ Onye a ga-atụkwasa obi.

ALLELUỊA             Abụọma 85:8

Alleluịa, Alleluịa:

Onyenweanyị, gosị anyị ebere Gị. Nyekwa anyị nzọpụta Gị.

Alleluịa.

Oziọma maka November 29 2020 – Mak 13:33-37

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere

Isi Okwu: Mụrụ anya, n’ihi na ị maghị mgbe onye nwe ụlọ ga-eji bata.

Jesu gwara Ụmụazụ Ya sị: “Na-echenụ nche. Mụrụnụ anya, n’ihina ụnụ amaghị mgbe oge ahụ ga-abụ. Ọ dị ka nwoke gara mba ọzọ.

Mgbe ọ na-ahapụ ụlọ, ọ gwara ụmụodibo ya lekọtawa ihe ya; bịakwa kenye nke ọ bụla ọrụ nke ya. Ọ gwara onye nche ọnụ ụzọ ka ọ mụrụ anya.

N’ihi ya, mụrụnụ anya, maka na ụnụ amaghị mgbe nna ukwu nwe ụlọ ga-abata: ọ bụ n’anyasị, ka ọ bụ n’etiti abalị, ka ọ bụ mgbe okeọkpa bere akwa, ka ọ bụ n’ụzọ ụtụtụ?

Ọ bụrụ na ya bata mgbe a na-atụghị anya ya, ya ahụkwala gị ebe ị na-arahụ ụra. Ihe M gwara ụnụ ka M gwara mmadụ niile: ‘Mụrụnụ anya!’”

IHE ỌGỤGỤ ỤNYAHỤ: Igbo Mass Readings November 28 2020, Satọdee nke Izu Ụka Iri Atọ na Anọ n’oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ ECHI:   Igbo Mass Readings November 30 2020, Emume Andru Dị Nsọ, Nwaazụ.

Igbo Mass Readings November 29 2020, Ụka nke Mbu n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị – Afọ Nke Abụọ.

Sonyere anyị na Facebook na Igbo Mass Readings 

error: Alert: Content is protected !!