Igbo Mass Readings December 4 2020, Fraịde Izu Mbu Oge Adventi

Igbo Mass Readings December 4 2020, Fraịde Izuụka nke Mbu n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.

Igbo Mass Readings December 4 2020, Fraịde Izuụka nke Mbu n'Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.
Igbo Mass Readings December 4 2020, Fraịde Izuụka nke Mbu n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.

EKPERE MMEGHE

Dinwenụ anyị Jesu Kristi, zọpụta anyị na njọ anyị ga. Bịa chekwaba anyị n’ajọ ihe niile ma duzie anyị n’ụzọ nzọpụta n’ihina ịdị ndụ na-achị eze, Gị na Nna na Mmụọ Nsọ, otu Chukwu, ebighị ebi, ebighị ebi. Amen.

Ihe Ogugu Nke Mbụ      29:17-24

Ihe Ọgụgụ ewetara n’akwụkwọ Onye Amụma Aịzaya

Yahweh wee kwuo sị: ọ bụ na ọ fọghị nwantịtị oge, mgbe Lebanọn ga-agbanwe bụrụ ezigbo ala ubi na-amịta mkpụrụ, ma ala ubi na-amịta ọtụtụ mkpụrụ aghọọ oke ọhịa?

N’ụbọchị ahụ ndị ntị chiri ga-anụ okwu si n’akwụkwọ ahụ, ndịisi, ndị ahụ naara ejegharị n’ọchịchịrị ga-emeghe anya ha, hụkwa ụzọ ọzọ.

Ndị umeala ga-enwekwa añụri ọhụrụ n’ime Chineke ndị ogbenye n’etiti ha ga-enwe añụrị n’ime onye Nsọ nke Isrel.

Maka na ndị obi ọjọọ agaghị adịkwa adị; ndị na-akwa Chineke emo agaghịkwa asị.

A ga-ekpochapụ ndị echiche ọjọọ niile; ndị ahụ na-ebo ndị aka ha dị ọcha ebubo na-esiri ndị na-adọ ha aka na ntị ọnya n’ọnụ ụzọama, na site n’ịrịọ arịrịọ na enweghị isi ka ikpe nkwụmọtọ ghara irute onye eziomume aka.

Ya mere, Osebụrụwa, Chineke nke ụlọ Jekọb na onye mgbapụta nke Abraham jiri kwuo sị, “Ihere agaghị emekwa Jekọb ọzọ, ọ agaghị enwekwa ihu mgbarụ ọzọ;

Maka na mgbe ọ hụrụ ụmụaka ya nke bụ aka ọrụ m, n’etiti ha, ha ga-edo aha m nsọ, ha ga-edo onye Nsọ nke Jekọb asọ.

Ha ga na-atụrụ Chineke nke Izrel egwu. Ndị niile mejọrọ n’ime mmụọ ga-amata ihe ma ndị niile na-atamu ntamu ga-anabata ndụmọdụ.”

ABỤỌMA NA AZỊZA: Ps: 27:1.4.13-14

Azịza: Dinwenu bu ihe m na nzoputa m.

1. Dinwenụ bụ ìhè na nzọpụta m,

onye ka m ga-atụ egwu?

Dinwenụ bụ ide nke ndụ m

onye ga-eyi m egwu! Azza.

2. Otu ihe ka m na-arịọ Dinwenụ,

otu ihe ka m na-achọ.

Ka m biri n’ụlọ nke Dinwenụ

ụbọchị niile nke ndụ m.

Ka m nweta ịdị ụtọ nke Dinwenụ,

ka m na-ahụ ya n’ụlọnsọ ya. Azza.

3. Ekwere m na m ga-ahụ ịdị mma nke

Chineke, n’ala ndị dị ndụ.

Chekwube na Dinwenụ.

Obi sie gị ike,

Tụkwasị ya obi, chekwube na ya. Azza.

MBEKU

ALLELUIA ALLELUIA:

Ka urukpu zoo eziomume dịka mmiri, ka ala meghee, ka nzọpụta topụta, ka o mee ka ikpe nkwụmọtọ topụtakwa.

ALLELUIA.

Oziọma maka December 4 2020 – Matiu 9:27-31.

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere.

Mgbe Jesu si Kapanaum pụọ, mmadụ abụọ kpuru isi sooro ya, ha na-eti mkpu sị, “Nwa Devid, meere anyị ebere.”

Mgbe Jesu batara n’ime ụlọ, ndị isi ahụ bịakwutere ya. Ọ jụọ ha sị, ụnụ kwere na m nwere ike ime ka ụnụ hụ ụzọ?”

Ha azaa ya sị, “Ee Onyenweanyị!” Jesu emetu ha aka n’anya sị, “Ya meere ụnụ ka okwukwe ụnụ si dị. Anya ha wee meghee.

Jesu dọsiri ha aka na ntị ike sị, “Ụnụ agwakwala onye ọbụla nke a.” Mana ha si ebe ahụ pụọ, na-agbasa ude Jesu n’akụkụ ala ahụ niile.

EKPERE NHUNYE

Dinwenụ, ewezuga Gị onweghị ihe anyị bụ. Ebe I ji ebere Gị na-echekwaba anyị, nara ekpere na onyinye anyị ndị a. Anyị na-arịọ ihe ndị a site na Kristi Dinwenụ anyị. Amen.

EKPERE ANATACHAA ORIRI NSỌ

Nna, Ị na-enye anyị nri si n’eluigwe. Kuziere anyị ịdị na-ebi ndụ n’usoro amamihe Gị; meekwa ka anyị na-ahụ ihe nke eluigwe n’anya site n’iketa oke n’ihe omimi ndị a. Mezuoro anyị ihe ndị a site na Kristi Dinwenụ anyị. Amen.

IHE ỌGỤGỤ ỤNYAHỤ: Igbo Mass Readings December 3 2020, Ncheta Francis Xavier dị asọ – Tọọzde Izuụka nke Mbu n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.

IHE ỌGỤGỤ ECHI:  Igbo Mass Readings December 5 2020, Satọde Izuụka nke Mbu n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.

Igbo Mass Readings December 4 2020, Fraịde Izuụka nke Mbu n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.

Sonyere anyị na Facebook na Igbo Mass Readings 

error: Alert: Content is protected !!