Igbo Mass Readings October 23 2020 Fraịdee Izu Iri Abụọ na Itoolu

Igbo Mass Readings October 23 2020, Fraịdee Izu Iri Abụọ na Itoolu n’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings October 23 2020, Fraịdee Izu Iri Abụọ na Itoolu n'Oge Adanyeghị n'Emume.
Igbo Mass Readings October 23 2020, Fraịdee Izu Iri Abụọ na Itoolu n’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ    4:1-6

Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Pọl dị asọ degaara ndi Efesọs.

Mụ onwe m bụ onye mkpọrọ nke Dinwenụ, na-arịọ ụnụ, ka ụnụ bie ndụ kwesịrị ọkpụkpọ nke a kpọrọ ụnụ.

Werenụ ịdị umeala niile, ịdị nwayọ na ndidi na-anaranụ ibe ụnụ n’ịhụnaanya. Nwekwaanụ obi ịnụ ọkụ iji kwado ịdịkọ n’otu nke Mmụọ Nsọ na-enye na njikọ nke udo.

E nwere otu ahụ, otu Mmụọ dịka e siri kpọọ ụnụ n’otu nchekwube nke dịịrị ọkpụkpọ a kpọrọ ụnụ.

Otu Dinwenụ dị, otu okwukwe na otu mmirichukwu, otu Chineke na Nna nke anyị niile, onye kacha ihe niile, onye ihe niile sitere na ya na onye nọkwa n’ime ihe niile.

ABỤỌMA NA AZỊZA:    Ps. 24:1-2, 3-4, 5-6.

Azịza: Onyenwenayị, Ọ bụ ụdị ndị dị otu a na-achọ ịhụ ihu gị.

  1. Chineke nwe ụwa na ihe niile dị n’ime ya,

Ụwa na ndị niile bi n’ime ya;

Ọ bụ ya wụkwasara ya n’elu mmiri

Ọ bụ ya wuru ya n’elu osimiri. Azịza.

2. Onye nwere ike irigoro n’ugwu nke Onyenweanyị?

Onye nwere ike ịnọ n’ebe ya dị nsọ?

Onye aka ya na obi ya dị ọcha,

Onye anaghị etinye obi ya n’ihe efu. Azịza.

3. Onye dị otu a ga-anata ngọzi n’aka Onyenwenayị,

Ọ ga-anatakwa eziomume n’aka Chineke onye nzọpụta ya.

Ọ bụ ụdị ndị dị otu a na-achọ Onyenweanyị,

Ndị na-achọ ihu Chineke nke Jekọb! Azịza.

MBEKU    Ps. 27:11

Alleluịa, Alleluịa:

Kụziere m ụzọ gị O Dinwenụ. Dube m n’ụzọ kwụ ọtọ.

Alleluịa.

Oziọma maka October 23, 2020 – Luk 12:54-59

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Jesu gwakwara igwe mmadụ ahụ sị, “Mgbe ọbụla ụnụ hụrụ urukpu ka o si n’ọdịda anyanwụ na-arịgo, ụnụ na-ekwu ozigbo sị, ‘Mmiri ozuzo na-abịa’; ọ na-emekwa otu ahụ ụnụ siri kwuo.

Mgbe ụnụ hụkwara ikuku si na ndịda ugwu ka ọ na-eku, ụnụ na-asị, ‘Oke ekpomọkụ ga-adị’; ọ na-emekwa otu ahụ. Ụnụ ndị abụọ!

Ụnụ maara out e si akọwa ihu ụwa na ihu igwe, gịnị mere na ụnụ amaghị otu e si akọwa ihe na-eme n’oge a? Gịnị mere na ụnụ anaghị ekpebiri n’onwe ụnụ ihe dị mma?

Ka gị na onye gbara gị akwụkwọ na-aga n’ụlọikpe, gbaa mbọ ka gị nay a kpezie n’ụzọ tupu okwu eruo na ntị onye ọkaikpe,

ka ọ ghara ịdọkpụrụ gị nye onye ọkaikpe, onye ọkaikpe arara gị nye onye nlekọta ụlọ mkpọrọ, onye nlekọta ụlọ mkpọrọ akwaba gị n’ụlọ mkpọrọ.

Agwa m gị, ị gaghị esi n’ebe ahụ pụta ruo mgbe ị ga-akwụghachi, ọ bụladị ego nta ikpeazụ I ji n’ụgwọ.”

IHE ỌGỤGỤ ỤNYAHỤ: Igbo Mass Readings October 22 2020, Tọọzdee Izu Iri Abụọ na Itoolu n’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ ECHI: Igbo Mass Readings October 24 2020, Satọdee Izu Iri Abụọ na Itoolu n’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings October 23 2020, Fraịdee Izu Iri Abụọ na Itoolu n’Oge Adanyeghị n’Emume.

Sonyere anyị na Facebook na Igbo Mass Readings 

error: Alert: Content is protected !!