Igbo Mass Readings December 11 2020, Fraịde Izu Abụọ Oge Adventi

Igbo Mass Readings December 11 2020, Fraịde Izuụka nke Abụọ n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.

Igbo Mass Readings December 11 2020, Fraịde Izuụka nke Abụọ n'Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.
Igbo Mass Readings December 11 2020, Fraịde Izuụka nke Abụọ n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.

EKPERE MMEGHE

Chineke ji ike niile, nyere anyị aka ka anyị were nchekwube na-atụ anya ọbịbịa nke onye nzọpụta anyị. Mee ka anyị na-ebi ndụ etu O siri kụziri anyị, dịrị nkwadebe iji ịhụnaanya na okwukwe na-anụ ọkụ nabata Ya. Site na Dinwenụ anyị Jesu Kristi

Ihe Ọgụgụ Nke Mbụ    48:17-19

Ihe Ọgụgụ ewetara n’akwụkwọ Onye Amụma Aịzaya

Nke a ka Chineke, onye nzọpụta ụnụ na onye Nsọ nke Izrel kwuru: “Abụ m Osebụrụwa Chineke ụnụ, onye na-akụziri ụnụ ihe maka ọdị mma nke ụnụ, onye na-edu ụnụ n’ụzọ ụnụ kwesịrị isi na-aga.

N’ezie, a sị na ụnụ gere ntị n’iwu m, udo gaara na-ehuru ụnụ dịka mmiri iyi, eziomume ụnụ dịka ebili oke osimiri.

Ụmụ ụnụ gaara adị ka aja dị n’ala, ụmụụmụ ụnụ dịka mkpụrụ aja. A gaghị ehichapụ aha ha ehichapụ ma ọ bụ kpochapụ ha n’ebe m nọ.

ABỤỌMA NA AZỊZA: Ps: 1, 1-2, 3.4.6.

Azịza: Ndị na-eso gị Onyenweanyị ga-enwe ìhè nke ndụ.

1.Añụrị ga-adịrị nwoke ahụ nke anaghị eso ndụmọdụ onye ajọomume

ma ọ bụ na-akwụgharị n’ụzọ ndị ome njọ,

ma ọ bụ n’otu ndị na-ekwutọ Chineke;

Kama ọ na-enwe añụrị n’ebe iwu Onyenweanyị dị

ma na-achịgharị iwu ya n’obi ya ehihie na abalị. Azịza.

2. Ọ dị ka osisi a kụrụ n’akụkụ iyi,

nke na-amịpụta mkpụrụ ya n’oge ya,

nke akwụkwọ ya anaghị akpọnwụ akpọnwụ,

ihe niile ọ na-eme na-agara ya nke ọma. Azịza.

3. Ọ dịghị otu a n’ebe ndị ajọ mmadụ nọ,

Mba, n’ihi na ha dịka afụrụ ọka nke ikuku na-ebugharị

N’ihi na Onyenweanyị na-echekwaba ụzọ ndị eziomume,

mana ụzọ ndị ajọ mmadụ na-eduba n’ịla n’iyi. Azịza

MBEKU

ALLELUỊA ALLELUỊA:

Onyenweanyị na-abịa, ganụ zute ya ọ bụ eze nke udo.

ALLELUỊA.

Oziọma maka December 11 2020 – Matiu 11: 16-19

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere.

Jesu gwara igwe mmadụ ahụ sị: “Ma gịnị ka m ga-eji atụnyere ọgbọ a? Ọ dị ka ụmụntakịrị ndị nọ n’ọma ahịa na-akpọ ibe ha oku; ‘Anyị gbuuru ụnụ ọja, ma ụnụ agbaghị egwu; anyị tiri mkpu akwa, ma ụnụ erughị ụjụ’.

Jọn bịara na-ebu ọnụ na-asọkwa mmanya, ha sị na ajọ mmụọ bi n’ime ya. Nwa nke mmadụ abịa, na-eri na-añụ, ha sị, ‘Lee onye oke oriri na onye añụmañụ, enyi ndị ọnaụtụ na ndị omenjọ!’ ma amamiihe egosipụtala onwe ya site n’ezi ọrụ ya.

EKPERE NHUNYE

Dinwenụ, ewezuga Gị onweghị ihe anyị bụ. Ebe I ji ebere Gị na-echekwaba anyị, nara ekpere na onyinye anyị ndị a. Anyị na-arịọ ihe ndị a site na Kristi Dinwenụ anyị. Amen

EKPERE ANATACHAA ORIRI NSỌ

Nna, Ị na-enye anyị nri nke si n’eluigwe. Kụziere anyị ịdị n’ebi ndụ n’usoro amamiihe Gị; meekwa ka anyị na-ahụ ihe nke eluigwe n’anya site n’iketa oke n’ihe omimi ndị a. Mezuoro anyị ihe ndị a site na Kristi Dinwenụ anyị. Amen.

IHE ỌGỤGỤ ỤNYAHỤ: Igbo Mass Readings December 10 2020, Tọọzde Izuụka nke Abụọ n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.

IHE ỌGỤGỤ ECHI:  Igbo Mass Readings December 12 2020, Satọdee Izuụka nke Abụọ n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.

Igbo Mass Readings December 11 2020, Fraịde Izuụka nke Abụọ n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.

Sonyere anyị na Facebook na Igbo Mass Readings 

error: Alert: Content is protected !!