Igbo Mass Readings November 6 2020, Fraịdee Izu Iri Atọ na Otu Oge Nk

Igbo Mass Readings November 6 2020, Fraịdee Izu Iri Atọ na Otu n’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings November 6 2020, Fraịdee Izu Iri Atọ na Otu n'Oge Adanyeghị n'Emume.
Igbo Mass Readings November 6 2020, Fraịdee Izu Iri Atọ na Otu n’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ       3: 17-4:1.

Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Pọl dị asọ degaara ndi Filipi.

Ụmụnna m, soronụ na-eomi m. Na-elerenụ ụfọdụ n’ime ụnụ ndị na-eso ụkpụrụ anyị tọrọ anya.

Ọtụtụ n’ime ndị m na-agwa ụnụ mgbe niile maka ha, bụ ndị m ji anyammiri agwa ụnụ ugbu a, na-ebi ndụ dịka ndịiro nke obe Kristi.

Njedebe ndị dị otu a ga-abụ ila n’iyi. Afọ ha bụ chi ha, ihe kwesịrị ime ha ihere ka ha ji etu ọnụ. Ha na-atụkwasị uche naanị n’ihe nke ụwa.

Ebe obibi anyị dị n’eluigwe ebe anyị na-atụsị anya ike na onye nzọpụta anyị bụ Jesu Kristi ga-esi abịa, onye ga-agbanwe ahụ anyị dị ala ka ọ dị ka nke ya dị ebube site n’ike nke mere ka o dobe ihe niile n’okpuru ya.

Ụmụnna m, ndị m hụrụ n’anya na ndị agụụ ha na-agụsị m ike, ndị bụ añụrị m na okpueze m. Kwụdosienụ ike na Dinwenụ, ụnụ ndị m hụrụ n’anya.

ABỤỌMA NA AZỊZA:  Ps. 122: 1-2, 3-4, 4-5.

Azịza: Añụrị juru m obi mgbe m nụrụ ha kwuru sị, ka anyị gaa n’ụlọ nke Chineke.

  1. Añụrị juru m obi mgbe m nụrụ ha kwuru sị,

ka anyị gaa n’ụlọ nke Chineke.

Ugbu a, anyị kwụzi n’ọnụụzọ ama gị, O Jerusalem. Azịza.

2. A rụrụ Jerusalem dịka obodo

e jikọtara ọnụ nke ọma.

Ọ bụ na  ya ka agbụrụ niile na-aga

agbụrụ nke Izrel. Azịza.

3. Inye Onyenweanyị ekele

dịka o siri nye n’iwu.

Ebe ahụ ka e dobere oche ikpe eze,

Ocheze nke ụlọ Devid. Azịza.

MBEKU          Ps. 119:34.

Alleluịa, Alleluịa:

Nye m nghọta ka m wee mata iwu gị Onyenweanyị, wee nwee ike iji obi m niile dobe iwu gị.

Alleluịa.

Oziọma maka November 6 2020 – Luk 16: 1-8.

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Jesu gwara ndị ụmụazụ ya sị: “Ọ dị otu ọgaranya nke nwere onye na-elekọtara ya ezinụụlọ ya.

A na-ewetara ya ọtụtụ ebubo na onye nlekọta a na-emefusị akụnụụba ya. Ọ kpọrọ onye nlekọta ahụ, jụọ yua sị: ‘Gịnị bụ ihe a m na-anụ banyere gị?

Kọwaara m otu i si arụ ọrụ gị, n’ihina ị gaghịkwa abụ onye nlekọta ezinụụlọ m ọzọ.’ Onye nlekọta ahụ jụrụ onwe ya sị: ‘Gịnị ka m ga-eme, ebe ọ bụ na nna m ukwu na-achọ ịnapụ m ọrụ nke a?

Adighị m ike ịrụ ọrụ ugbo; ihere ga-emekwa m ị rịọ arịrịọ. Amatala m ihe mm ga-eme ka ndị mmadụ nwee ike ịnabata m n’ụlọ ha mgbe ọ chụpụrụ m ọrụ nlekọta a.’

N’ihi nke a ọ kpọrọ ndị niile ji nna ya ukwu ụgwọ n’otu n’otu. Ọ jụrụ onye nke mbụ sị, ‘Ụgwọ ite mmanụ ole ka i ji Nna m ukwu?’

Ọ zara ya sị, ‘Ọ bụ narị ite mmanụ.’ Ọ gwara ya sị, ‘Werenụ akwụkwọ ụgwọ gị, nọrọ ala ozigbo ka I dee iri ise.’ Ọ jụkwara onyeọzọ sị, ‘Ụgwọ akpa ọka ole ka i ji?’

Ọ zaa ya sị, ‘Otu narị akpa ọka.’ Onye nlekọta ahụ agwa ya sị, ‘Were akwụkwọ ụgwọ gị, dee iri asatọ.’

Nnaukwu ahụ toro onye nlekọta a na-ekwesịghị ntụkwasịobi n’ihi akọnuuche ya, n’ihina ụmụ nke ụwa a ji akọnuuche na-eso ndị ọgbọ ha karịa ụmụ nke ihe.”

IHE ỌGỤGỤ ỤNYAHỤ: Igbo Mass Readings November 5 2020, Tọọzdee Izu Iri Atọ na Otu n’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ ECHI:  Igbo Mass Readings November 7 2020, Satọdee Izu Iri Atọ na Otu n’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings November 6 2020, Fraịdee Izu Iri Atọ na Otu n’Oge Adanyeghị n’Emume.

Sonyere anyị na Facebook na Igbo Mass Readings 

error: Alert: Content is protected !!