Igbo Mass Readings November 13 2020, Fraịdee Izu Iri Atọ na Abụọ Oge

Igbo Mass Readings November 13 2020, Fraịdee Izu Iri Atọ na Abụọ n’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings November 13 2020, Fraịdee Izu Iri Atọ na Abụọ n'Oge Adanyeghị n'Emume.
Igbo Mass Readings November 13 2020, Fraịdee Izu Iri Atọ na Abụọ n’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ         4-9

Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Jọn nke Abụọ.

Añụrịrị m oke ọñụ ịhụ na ụfọdụ n’ime ụmụ gị na-eso eziokwu dịka otu Nna si nye anyị n’iwu.

Ugbu a, ana m arịọ gị ezi nwaanyị, ọ bụghị ka a ga-asị na m na-edere gị iwu ọhụrụ kama, ọ bụ nke anyị nwetarala site na mbido na anyị ga-ahụrịta onwe anyị n’anya. Nke a bụ ịhụnaanya, na anyị ga-eso iwu ya niile.

Nke a bụ iwu ya ahụ, dịka ụnụ nụrụla na mbido, na ụnụ ga na-ebi ndụ ịhụnaanya. Ọtụtụ ndị nduhie ejula n’ụwa.

Ndị a bụ ndị na-ekwenyeghị na Jesu Kristi bịara n’ụdị mmadụ. Onye dị otu a bụ onye nduhie na onyeiro Kristi.

Lezienụ anya ka ụnụ ghara ịtụfu ihe ahụ nke ụnụ rụrụ ọrụ ụnụ n’uju. Onye ọbụla na-anaghị anọgide na nkuzi nke Kristi enweghị Chineke. Ma onye ọbụla na-anọgide na nkuzi ahụ nwere Nna na Nwa.

ABỤỌMA NA AZỊZA:   Ps. 119:1, 2, 10, 11, 17, 18.

Azịza: Ngọzi dịrị ndị na-eso iwu nke Onyenweanyị.

1.Ngọzi dịrị ndị omume ha kwụ ọtọ,

na-eso iwu nke Onyenweanyị. Azịza.

2. Ngọzi dịrị ndị niile na-edobe ihe niile Chineke nyere n’iwu

ndị ji obi ha niile achọ ya. Azịza.

3. Eji m obi m niile achọ gị,

ekwela ka m jehie ụzọ n’iwu gị. Azịza.

4. Ejisiri m okwu gị ike n’ime obi m,

ka m wee ghara ime njọ megide gị. Azịza.

5. Nye nwodibo gị ngọzi gị n’uju

 ka m wee dị ndụ dobe okwu gị. Azịza.

6. Meghee anya m ka m wee hụ

ihe ịtụnanya dị n’iwu gị. Azịza.

MBEKU       Ps. 119:35, 29.

Alleluịa, Alleluịa:

Tụgharịa obi m n’ụzọ iwu gị; kụziere m ụzọ gị Onyenweanyị.

Alleluịa.

Oziọma maka November 13 2020 – Luk 17:26-37

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Otu ọ dị n’oge nke Noa, otu ahụ ka ọ ga-adịkwa n’ụbọchị Nwa nke mmadụ ahụ.

Ndị mmadụ nọ na-eri, na-añụ na-alụkọrịtakwa di na nwunye, ruo n’ụbọchị Noa banyere n’ụgbọ, oke mmiri wee bịa laa ha niile n’iyi.

Otu ahụ ka ọ dịkwa n’oge nke Lọt, ha na-eri, na-añụ, na-azụrịtakwa ahịa, na-akụ mkpụrụ, na-arụkwa ụlọ. ma ụbọchị Lọt siri Sodọm gbapụ, ọkụ na nkume dị ọkụ siri n’eluigwe zoo ka mmiri rechapụ ha niile.

Otu ahụ ka ọ ga-adị n’ụbọchị a ga-egosịpụta Nwa nke mmadụ. N’ụbọchị ahụ, onye ọbụla nọ n’elu ụlọ arịtukwala ịbịa kwapụ ngwa ụlọ ya dị n’ime ụlọ.

Otu aka ahụ, onye nọ n’ubi, ya alaghachikwala n’ụlọ. Chetanụ nwunye Lọt. Onye ọbụla nke na-achọ irita ndụ ya, ga-atụfu ya; ma onye ọbụla nke tụfuru ndụ ya ga-echekwa ya.

Agwa m ụnụ, n’abalị ahụ, mmadụ abụọ ga-edina n’elu akwa. A ga-akpọrọ otu onye hapụ nke ọzọ.

Ụmụnwaanyị abụọ ga-anọ na-akwọ ihe, a kpọrọ otu, hapụ nke ọzọ. Ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya sị, “Ebee ka ihe ndị a ga-eme Onyenweanyị?” Jesu zara ha sị: “N’ebe ozu dị, n’ebe ahụ ka udele ga-ezukọkwa.”

IHE ỌGỤGỤ ỤNYAHỤ: Igbo Mass Readings November 12 2020, Ncheta Josaphat Dị Asọ.

IHE ỌGỤGỤ ECHI:  Igbo Mass Readings November 14 2020, Satọdee Izu Iri Atọ na Abụọ n’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings November 13 2020, Fraịdee Izu Iri Atọ na Abụọ n’Oge Adanyeghị n’Emume.

Sonyere anyị na Facebook na Igbo Mass Readings 

error: Alert: Content is protected !!