Igbo Mass Readings November 20 2020, Fraịdee Izu Iri Atọ na Atọ Oge

Igbo Mass Readings November 20 2020, Fraịdee Izu Iri Atọ na Atọ n’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings November 20 2020, Fraịdee Izu Iri Atọ na Atọ n'Oge Adanyeghị n'Emume.
Igbo Mass Readings November 20 2020, Fraịdee Izu Iri Atọ na Atọ n’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ     10:8-11

Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Mkpughe.

Olu nke ahụ m nụrụ mbụ si n’eluigwe daa gwakwara m ọzọ sị, “Gaa nara akwụkwọ mpịakọta ahụ nke ghere oghe n’aka mmụọọma ahụ nke debere otu ụkwụ n’elu oke osimiri, nke ọzọ n’elu ala.”

Agakwuuru m mmụọọma ahụ, gwa ya ka o nye m akwụkwọ mpịakọta ntakịrị ahụ. Mana ọ sịrị m: “Nara ya rie, ọ ga-elu ilu n’ime afọ gị ma ọ ga-atọ ka mmanụ añụ n’ọnụ gị.”

Anaara m mmụọọma akwụkwọ mpịakọta ntakịrị ahụ, rie ya; ọ tọrọ ka mmanụ añụ n’ọnụ m, mana mgbe m richara ya o luru m ilu n’afọ.

Ọ gwara m okwu ọzọ sị, “Ị ghaghị ibu amụma nye ọtụtụ agbụrụ, ọtụtụ mba, asụsụ dị icheiche na ọtụtụ ndị eze.”

ABỤỌMA NA AZỊZA:  Ps. 119:14, 24, 72, 103, 111, 131.

Azịza: Lee ka okwu gị siri dị m ụtọ n’ọnụ.

1.Ana m enwe añụrị n’iso iwu gị

Kama akụnụụba niile nke ụwa a. Azịza

2. Iwu gị na-atọ m ụtọ

na-adụkwa m ọdụ. Azịza.

3. Iwu siri n’ọnụ gị pụta ka mma

Karịa puku kwuru puku ọlaọcha na ọlaedo. Azịza.

4. Lee ka okwu gị siri dị m ụtọ,

ọ dị ụtọ karịa mmanụ añụ n’ọnụ m. Azịza.

5. Iwu gị na-ewetara obi m añụrị,

ha bụ ihe nke m ketara ruo mgbe ebighịebi. Azịza.

6. Eghebere m ọnụ na-eku ume

N’ihina agụụ nke iwu gị. Azịza.

MBEKU          Jọn 14:5

Alleluịa, Alleluịa:

Mụ onwe m bụ ụzọ, eziokwu na ndụ, Dinwenụ na-ekwu; Ọ dịghị onye ọbụla ga-abịakwute Nna m Ọ bụghị site na m.

Alleluịa.

Oziọma maka November 20 2020 – Luk 19:45-48

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Jesu banyere n’ime ụlọnsọ Chineke malite ịchụpụ ndị nọ ebe ahụ na-ere ahịa. Ọ gwara ha sị, “E dere ya, Ụlọ m ga-abụ ụlọ ekpere, ma ụnụ emegharịala ya ka ọ bụrụ ụlọ ndị ohi.

Ọ na-akuzikwa ihe ụbọchị niile n’ụlọnsọ. Ndịisi nchụaja, ndị ode-akwụkwọ na ndịisi nke ndị Juu nọ na-achọ ụzọ ha ga-esi gbuo ya, ma o nweghị ihe ha hụrụ ha nwere ike ime, n’ihina mmadụ niile kwenyere n’okwu ya.

IHE ỌGỤGỤ ỤNYAHỤ: Igbo Mass Readings November 19 2020, Tọọzde Izu Iri Atọ na Atọ n’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ ECHI: Igbo Mass Readings November 21 2020, Ncheta Nkubata Nke Vegin Marịa Dị Ngọzi

Igbo Mass Readings November 20 2020, Fraịdee Izu Iri Atọ na Atọ n’Oge Adanyeghị n’Emume.

Sonyere anyị na Facebook na Igbo Mass Readings 

error: Alert: Content is protected !!