Igbo Mass Readings November 27 2020, Fraịdee Izu Iri Atọ na Anọ

Igbo Mass Readings November 27 2020, Fraịdee nke Izu Ụka Iri Atọ na Anọ n’oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings November 27 2020, Fraịdee nke Izu Ụka Iri Atọ na Anọ n'oge Adanyeghị n'Emume.
Igbo Mass Readings November 27 2020, Fraịdee nke Izu Ụka Iri Atọ na Anọ n’oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ          20:1-4, 11-21:2.

Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Mkpughe.

Mgbe ahụ, ahụrụ m otu Mmụọọma ka o si n’eluigwe na-arịdata, o jikwa igodo nke olulu ahụ na-enweghị njedebe, ya na otu nnukwu ịnyagba igwe buru ibu.

O jidere anụndọgbu ahụ, agwọ ochie ahụ, onye bụ ekwensu na ajọ mmụọ, kee ya agbụ otu puku afọ.

Mmụọọma ahụ tụbara ya n’olulu ahụ na-enweghị njedebe, kpuchie ma gbachie ya, mechibido ya ụzọ nke ọma ka ọ ghara ịpụta ghọgbuo mba niile ọzọ ruo mgbe puku afọ ndị a ga-agwụcha.

Mgbe afọ ndị a gachara, aghaghị ịhapụ ya nwa oge. M wee hụ ọtụtụ ocheeze, ndị nọ n’elu ya bụ ndị e nyere ike ikpe ụwa ikpe.

Ahụkwara m mkpụrụobi niile e gburu egbu n’ụwa a n’ihina ha gbaara Jesu akaebe, kwusakwaa okwu Chineke. Ha akpọghị isiala nye anụọhịa ahụ mọbụ ihe oyiyi ya. Ha enweghị akara anụọhịa ahụn’egedege ihu ha mọbụ n’aka ha.

Ha dịkwara ndụ ọzọ sorokwa Kristi chịa eze otu puku afọ. Ahụrụ m nnukwu ocheeze ọcha na onye nọkwasara n’elu ya.  Ụwa na urukpu si n’ihu ya gbapụ.

O nweghịkwa ebe a chọtara ha ọzọ. Ahụrụ m ndị niile nwụrụ, ma ndị ukwu ma ndị nta ka ha guzo n’ihu ocheeze ahụ, e kpughekwara ọtụtụ akwụkwọ ikpe.

O meghekwara akwụkwọ ọzọ nke bụ akwụkwọ nke ndụ. E wee kpee ndị niile nwụrụ anwụ ikpe dịka ihe e dere n’akwụkwọ ikpe si dị, na ndị ha mere na ndụ ha.

Oke osimiri hapụrụ ndị niile nwụrụ anwụ nọ n’ime ya. Ọnwụ na Alammụọ hapụkwara ndị niile nwụrụ anwụ nọ n’ime ha, ha bilie.

E jiri ihe niile ha metara kpee ha ikpe. A tụbara ọnwụ na Alammụọ n’ime ọdọ ọkụ; A tụbara ndị niile aha ha na-adịghị n’ime akwụkwọ nke ndụ n’ime ọdọ ọkụ ahụ.

M wee hụ eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ. Eluigwe nke mbụ na ụwa nke mbụ agabigala. Oke osimiri adịghịkwa.

Ahụkwara m obodo nsọ ahụ bụ Jerusalem ka o si n’eluigwe n’ebe Chineke nọ na-agbadata. A kwadoro ya, chọọ yam ma, dịka nwaanyị gaje izute dị ya.

ABỤỌMA NA AZỊZA:       Ps. 84:2, 3, 4-5, 7.

Azịza: Lee, ebe obibi Chineke dị n’etiti ndị mmadụ.

1. Ọ na-agụ m nnukwu agụụ

ka m bata n’ogige Osebụrụwa

ka mkpụrụobi m na anụahụ m

na-ekwere Chineke dị ndụ ukwe ọnụ. Azịza.

2. Ka o si dị nnụnụ ebelebe na-achọtara onwe ya ụlọ obibi,

nnụnụ eleke achọtara onwe ya akwụ

ebe ọ ga-edote ụmụ ya

n’akụkụ ebe nchụaja gị, Onyenweanyị onye pụrụ ime ihe niile,

Onye bụ eze m na Chineke m. Azịza.

3. Ha bụ ndị a gọziri agọzi ndị bi n’ụlọ gị

na-ekwere gị ukwe otito oge niile.

ndị ike ha sị na gị bụ ndị agọziri agọzi,

ka ha na-aga ike ha na-abawanye. Azịza.

MBEKU          Matiu 24:42, 44.

Alleluịa, Alleluịa:

Na-echenụ nche, dịrị kwanụ njikere n’ihina ụnụ amaghị oge nwa nke mmadụ ga-abịa.

Alleluịa.

Oziọma maka November 27 2020  – Luk 21:29-33.

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Jesu tụkwaara ha ilu a: “Leenụ osisi fiig na osisi ndịọzọ, mgbe ọbụla ụnụ hụrụ ka ha na-epupụta akwụkwọ ndụ ọhụrụ maranụ na udummiri adịla nso.

Otu aka ahụ, mgbe ọbụla ụnụ hụrụ ka ihe ndị a na-emezu maranụ na Alaeze Chineke dị nso.

N’eziokwu agwa m ụnụ, ọgbọ a agaghị agabiga maọlị, ruo mgbe ihe ndị a ga-emezu. Eluigwe na ụwa ga-agabigakwa, ma okwu m niile agaghị agabiga maọlị.

IHE ỌGỤGỤ ỤNYAHỤ: Igbo Mass Readings November 26 2020, Tọọzde nke Izu Ụka Iri Atọ na Anọ n’oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ ECHI: Igbo Mass Readings November 28 2020, Satọdee nke Izu Ụka Iri Atọ na Anọ n’oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings November 27 2020, Fraịdee nke Izu Ụka Iri Atọ na Anọ n’oge Adanyeghị n’Emume.

Sonyere anyị na Facebook na Igbo Mass Readings 

error: Alert: Content is protected !!