Igbo Mass Readings December 8 2020, Ịtụrụ Ime N’ejighị Njọ Nke Marịa

Igbo Mass Readings December 8 2020, Ịtụrụ Ime N’ejighị Njọ Nke Marịa Dị Ngọzi Nwaanyị na-amaghị Nwoke.

Igbo Mass Readings December 8 2020, Ịtụrụ Ime N'ejighị Njọ Nke Marịa Dị Ngọzi Nwaanyị na-amaghị Nwoke.
Igbo Mass Readings December 8 2020, Ịtụrụ Ime N’ejighị Njọ Nke Marịa Dị Ngọzi Nwaanyị na-amaghị Nwoke.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ      3:9-15, 20.

Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Jenesis

Isi Okwu: Aga eme ka enwee ịdị n’iro n’agbata ụnụ.

Mgbe Adam tachara mkpụrụ osisi ahụ, Onyenweanyị Chineke kpọrọ nwoke ahụ oku, jụọ ya sị: “Olee ebe Ị nọ?

Ọ zara sị: “Anụrụ m mkpọtụ Gị n’ime ogige. Egwu tụrụ m, n’ihina agba m ọtọ. Ya mere m ji zoo.

O wee jụọ ya sị: “Onye gwara gị na ị gba ọtọ? Ị taala mkpụrụ osisi ahụ M sị gị atala”?

Nwoke ahụ zara Ya: “Ọ bụ nwaanyị a I tinyekọtara mụ na ya; o nyere m mkpụrụ osis. M wee taa.”

Onyenweanyị Chineke jụrụ nwaanyị ahụ sị: “Ihe a I mere, ọ bụ gịnị? Nwanyị ahụ zaa Ya: “Ọ bụ agwọ nwara m ọnwụnwa. M wee taa ya.”

Mgbe ahụ, Onyenweanyị Chineke gwara agwọ: “N’ihi ihe a i mere, a bụọla gị ọnụ karịrị nke a bụrụ anụ niile na-aga n’ụkwụ anọ, na anụ ọhịa niile. Afọ ka ị ga-eji na-akpụ n’ala, na-ata aja ụbọchị ndụ gị niile.

Aga M eme ka e nwee ịdị n’iro n’agbata ụnụ; ka e nwee ịdị n’iro n’agbata gị na nwaanyị; n’agbata mkpụrụ gị na mkpụrụ ya. Ọ ga-azọpịa gị isi. Ma ị ga-ata ya n’ikiri ụkwụ.

Nwoke ahụ kpọrọ nwunye ya ‘Iiv’, maka na ọ bụ nne ndị niile dị ndụ.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA:   Ps. 97:1-4. Az. 1.

Azịza: Kweerenụ Onyenweanyị ukwe ọhụrụ, maka na Ọ rụọla ọrụ ebube.

1. Kweerenụ Onyenweanyị ukwe ọhụrụ,

maka na Ọ rụọla ọrụ ebube.

Aka Ya enwetarala Ya mmeri

Ogwe aka Ya dị nsọ! Azịza.

2. Onyenweanyị emeela ka a mata nzọpụta Ya.

O kpugheela ikpe nkwụmọtọ Ya n’ihu mba niile.

O chetala obi ọma Ya na ịkwụdosike ike nke O nwere n’ebe obi Izrel nọ. Azịza.

3. Akụkụ ụwa niile ahụla nzọpụta Chineke anyị.

Ala niile, kweerenụ Onyenwean Onyenweanyị ukwe añụrị.

Tienụ mkpu ọñụ! Kweenụ ukwe otito. Azịza.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ     1:3-6, 11-12.

Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Pọl dị asọ degaara Ndị Efesọs.

Okwu: Tupu e mee ụwa, ọ họọrọ anyị.

Ekele dịrị Chineke Nna Onyenweanyị Jesu Kristi, Onye jiri ngọzi niile nke mmụọ dị n’eluigwe gọzie anyị n’ime Kristi.

Tupu e mee ụwa, ọ họọrọ anyị. Ọ họọrọ anyị n’ime Kristi ka anyị dị asọ, ghara ibu mmerụ ma ọ bụ ntụpọ; ka anyị bie ndụ ịhụnaanya n’ihu Ya. O kpebielarị na anyị ga-abụ ndị O jiri mere ụmụ site na Jesu Kristi.

Ọ bụ maka ebumnobi obiọma Ya ka O jiri mee ka anyị bụrụ ndị ga-eto ebube nke amara Ya, nke bụ ọgọ O meere anyị n’ime Onye ahụ Ọhụrụ n’anya.

ALLELUỊA       Luk 1:28

Alleluịa, Alleluịa:

Ekele Marịa, ị jupụtara n’amara. Osebụrụwa nọnyere gị. Ị dị ngọzi n’etiti ụmụnwanyị niile.

Alleluịa.

Oziọma maka December 8 2020 – Luk  1:26-38

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Isi Okwu: Ekele! I jupụtara n’amara. Osebụrụwa nọnyere gị.

Chineke zigara mmụọọma Gebrel n’otu obodo Galili a na-akpọ Nazaret. O zigara ya otu nwagbọghọ na-amaghị nwoke, nke nwoke a na-akpọ Josef, onye si n’obi Devid na-achọ ịlụ. Aha nwagbọghọ ahụ na-amaghị nwoke bụ Marịa.

Mmụọọma bakwuru Ya sị ya: “Ekele! I jupụtara n’amara. Osebụrụwa nọnyere gị.” Okwu a gbara ya gharịị, nke na ọ jụwara onwe ya ihe ụdị ekele a pụtara.

Ma mmụọọma gwara ya: “Marịa! Ụjọ atụla gị! Chineke hụrụ gị n’anya nke ukwuu. Gee ntị! Ị ga-atụrụ ime, mụta nwa nwoke. Aha ị ga-akpọ Ya bụ Jesu. Ọ ga-abụ nnukwu mmadụ.

Aga akpọ Ya Nwa nke Onye Kacha Elu. Onyenweanyị Chineke ga-enye Ya oche eze nna Ya Devid. Ọ ga-achị n’obi Jekọb ruo mgbe ebighị ebi. Ọchịchị Ya agaghị enwe ọgwụgwụ.

Marịa jụrụ mmụọọma sị: “Olee otu nke a ga-esi eme, ebe ọ bụ na amaghị m nwoke?

Mmụọọma zara ya: “Mmụọ Nsọ ga-adakwasị gị. Ike nke Onye Kacha Elu ga-eji nnyọgọ Ya kpugide gị. N’ihi ya, Nwa ahụ ga-adị asọ. A ga-akpọkwa Ya Nwa Chineke.

Matakwuo ihe a. Nwanne gị nwannyị Elizabet atụrụla ime nwa nwoke, ugbu a o meerela agadi.

Onye ahụ ndị mmadụ na-akpọ nwanyị aga dị ime ọnwa isii ugbu a, n’ihina o nweghị ihe karịrị Chineke n’omume.

Marịa e wee sị: “Abụ m odibo nwanyị nke Osebụrụwa. Ya reere m otu i si kwuo.” Mmụọọma wee hapụ ya, lawa.

IHE ỌGỤGỤ ỤNYAHỤ: Igbo Mass Readings December 7 2020, Ncheta Ambrose Dị Asọ – Mọnde Izu Abụọ n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta.

IHE ỌGỤGỤ ECHI:  Igbo Mass Readings December 9 2020, Wednezde Izuụka nke Abụọ n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.

Igbo Mass Readings December 8 2020, Ịtụrụ Ime N’ejighị Njọ Nke Marịa Dị Ngọzi Nwaanyị na-amaghị Nwoke.

Sonyere anyị na Facebook na Igbo Mass Readings 

error: Alert: Content is protected !!