Igbo Readings November 2 2020, Mkpụrụobi Ndị Niile Kwerenụ Gara Aga

Igbo Mass Readings November 2 2020, Ncheta Mkpụrụobi Ndị Niile Kwerenụ Gara Aga.

Igbo Mass Readings November 2 2020, Ncheta Mkpụrụobi Ndị Niile Kwerenụ Gara Aga.
Igbo Mass Readings November 2 2020, Ncheta Mkpụrụobi Ndị Niile Kwerenụ Gara Aga.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ      25:6-9

Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Aịzaya

Isi Okwu:  Onyenweanyị ga-akpọ nnukwu oriri bịakwa hichaa onye ọ bụla anya mmiri.

Ọ bụ n’ugwu nke a ka Onyenweanyị nke igwe ndị agha ga-akpọrọ agbụrụ niile oke oriri; oke oriri nke jupụtara na nri gbara abụba na mmanya bụ ọkachamma.

N’ugwu nke a, Ọ ga-ebibi ihe nfuchi ahụ fuchiri agbụrụ niile, na ihe mkpuchi ahụ e jiri kpuchi mba niile. Ọ ga-ala ọnwụ n’iyi ruo mgbe ebighị ebi.

Onyenweanyị Chineke ga-ehicha anya mmiri n’ihu niile. Ọ ga-esi n’ụwa niile wepụ nkwulu a na-ekwulu ndị nke Ya.

N’ụbọchị ahụ, a ga-asị: “Lee Chineke anyị, Onye anyị na-ele anya na Ọ ga-azọpụta anyị. Ka anyị ñụrịanụ ọñụ bịakwa nwee obi añụrị na Ọ zọpụtala anyị.” N’ihi na aka nke Onyenweanyị ga-anọzi n’elu ugwu a.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA:       Ps. 22 Az. 1

Azịza:  Dinwenụ bụ onye nche m onwekwaghị ihe m ga-achọ

  1. Chineke bụ onye nche m, o nwekwaghị ihe m ga-achọ. Ebe ahịhịa ndụ juru eju, ka Ọ na-enye m ezumike. Ọ na-eduga m na mmiri ka m zuru ike, ka m wee kute ume. Azịza.
  2. Ọ na-edu m n’ụzọ kwụ ọtọ, Ọ na-eme ka aha Ya siri dị. Ọ bụrụgodụ na m na-aga n’ọchịchịrị, egwu ọ bụla agaghị atụ m. I ji mkpara na ngụ Gị nọdebe m. Ọ bụ ha na-enye m añụri. Azịza.
  3. Ịhụnaanya na obiọma ga na-eso m ụbọchị ndụ m niile. A gam ebi n’ụlọ nke Chineke; biri na ya, ebighị ebi, ebighị ebi.  Azịza.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ        3:1-3

Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Pọl dị Asọ degaara Ndị Rom

Isi Okwu:  Ebe Ọ nwụrụ iji mee ka a gụnye anyị na ndị eziomume, O nwere ike ịhapụ ịzọpụta anyị ugbu a n’oke iwe Chineke?

Olile anya ahụ adịghịkwa aghọ anyị ahịa. N’ihi na Chineke wụsara ịhụnaanya Ya n’ime obi anyị site n’aka Mmụọ Nsọ ahụ O nyere anyị.

N’ihi na mgbe anyị nọ n’enweghị ike imere onwe anyị ihe ọ bụla, mgbe oge Chineke kara ruru, Kristi nwụrụ n’ihi ndị na-amaghị Chineke.

Ọ bụ ihe siri ike mmadụ ịnwụ n’ihi onye ezi omume. E leghị anya, e nwere ụdị mmadụ nwere ike ijisi ike nwụtara onye ezi omume.

Ma ihe gosịrị na ịhụnaanya Chineke hụrụ anyị pụrụ iche bụ na, oge anyị ka dị n’ime njọ, Kristi nwụrụ n’ihi anyị.

Ọ pụtara na ebe a gụrụla anyị na ndị ezi omume ugbu a site n’ọbara Ya, o were anya na a ga-azọpụta anyị n’iwe Chineke, site n’aka Ya.

Anyị bụrụla ndị iro Chineke na mbụ. Ma O mere ka anyị na Ya dị na mma site n’ọnwụ nke Nwa Ya.

Ebe anyị na Chineke dị na mma ugbu a, o were anya na Ọ ga-enye anyị nzọpụta zuru oke, site na ndụ Kristi.

Ma ọ bụghị naanị nke a: Anyị na-añụrịkwa ọñụ n’ime Chineke site n’Onyenweanyị Jesu Kristi, Onye mere ka anyị na Chineke dị na mma ugbu a.

ALLELUỊA        Jọn 6:39.

Alleluịa, Alleluịa:

Dinwenụ kwuru: “Ọ bụ uche Nna M na M agaghị atụfụ onye ọ bụla n’ime ndị niile O nyefere M n’aka, kama, aga M akpọlite ha n’ụbọchị ikpeazụ.

Alleluịa.

Oziọma maka November 2 2020 – Jọn 6:37-40

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere

Isi Okwu: Onye ọ bụla kweere na Nwa Ya ahụ, nwere ndụ ebighị ebi; aga M akpọlitekwa ya n’ụbọchị ikpeazụ.

Jesu gwara igwe mmadụ ahụ sị: “Ndị niile Nna M na-enye M ga-abịakwute M. Agaghị M achụpụ onye ọ bụla bịakwutere M.

N’ihi na esi M n’eluigwe rịdata, ọ bụghị ime uche M, kama ime uche Onye zitere M. Nke a bụ uche Onye zitere M: Ka m ghara ịtụfu onye ọ bụla n’ime ndị niile O nyere M, kama ka M meek a ha si n’ọnwụ bilie n’ụbọchị ikpeazụ.

N’ihi na nke a bụ uche Nna M: Na onye ọ bụla hụrụ Nwa Ya, kwere na Ya, ga-enwe ndụ ebighị ebi. Aga M emekwa ka o si n’ọnwụ bilie n’ụbọchị ikpeazụ.”

IHE ỌGỤGỤ ỤNYAHỤ: Igbo Mass Readings November 1 2020 Emume Ndị Nsọ Niile.

IHE ỌGỤGỤ ECHI:   Igbo Mass Readings November 3 2020 Tuezdee Izu Iri Atọ na Otu n’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings November 2 2020, Ncheta Mkpụrụobi Ndị Niile Kwerenụ Gara Aga.

Sonyere anyị na Facebook na Igbo Mass Readings 

error: Alert: Content is protected !!