Igbo Mass Readings December 7 2020, Ncheta Ambrose Dị Asọ

Igbo Mass Readings December 7 2020, Ncheta Ambrose Dị Asọ – Mọnde Izu Abụọ n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyi.

Igbo Mass Readings December 7 2020, Ncheta Ambrose Dị Asọ - Mọnde Izu Abụọ n'Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyi.
Igbo Mass Readings December 7 2020, Ncheta Ambrose Dị Asọ – Mọnde Izu Abụọ n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyi.

EKPERE MMEGHE

Dinwenụ, zọpụta anyị na njọ anyị ma mekwaa ka anyị zuo oke. Nụrụ ekpere anyị ma kwadokwaa anyị isoro n’emume iwereahụ nke Nwa Gị, Onye Gị na Ya dị ndụ, na-achị eze, n’ịdịkọ n’otu nke Mmụọ Nsọ, Otu Chukwu, site n’ụwatụwa niile. Amen.

Ihe Ọgụgụ Nke Mb      35:1-10

Ihe Ọgụgụ ewetara n’akwụkwọ Onye Amụma Aịzaya

Ka ịkpa na ala kpọrọ nkụ ñụrịa ọñụ, ka ala ọkpọọ nweta obi añụrị wee mịpụta ifuru osisi mara mma.

Ọ ga-achawapụta nke ukwuu, were ukwe tie mkpu ọñụ. A ga-enye ya otito nke Lebanọn, ebube nke Kamel na Sharọn.

Ha ga ahụ otito nke Osebụrụwa anyị. Meenụ ka aka na esighi ike sie ike, ka ikpere na-ama jijiji sie ike.

Ụnụ ga-agwa ndị niile egwu na-atụ, “Obi sie ụnụ ike, ụnụ atụla egwu, lee Chineke ụnụ na-abịa ịbọrọ ụnụ ọbọ site n’ịkwụghachi ndị iro ụnụ ụgwọ.

Ọ ga-abịa zọpụta ụnụ. Mgbe ahụ, anya ndị kpuru isi ga-emepe, ndị ntị chiri ga-anụ ihe.

Mgbe ahụ, onye ngwọrọ ga-awụli elu dịka ele, ndị ogbi ga-ekwe ukwe añuri. Mmiri ga-esi n’ọzara sọpụta, iyi ga-ejukwa n’ịkpa.

Ala ọkpọọ ga-abụ ebe ọdọ mmiri, ala kpọrọ nkụ ga-abụ isiiyi. Ebe obibi nkịta-ọhịa ga-aghọ apịtị.

Achara niile ga-adị ka eriri na ụdọ. Ụzọ awara awara ga-adị ebe ahụ, a ga-akpọ ya ụzọ Nsọ.

Onye adịghị ọcha agaghị esi ebe ahụ gafee. Ndị nzuzu agaghị eme ihe nzuzu ọbụla n’ebe ahụ.

A gaghị enwe ọdụm n’ebe ahụ, a gaghịkwa enwe anụọhịa ọbụla na-eyi egwu n’ime ya.

Ọ bụ sọọsọ ndị a zọpụtarala ga-aga na ya. Ndị nke Osebụrụwa a agbapụtara agbapụta ga-alọghachi azụ, na-ekwe ukwe ọñụ na Zayọn, ha ga-enwe añụrị ebeebe n’onwe ha.

Ha ga-enweta obi añụrị na nke ha. Iru ụjụ na ịma ọsụ niile ga-agbafu n’ebe ha nọ.

ABỤỌMA NA AZỊZA: Ps. 85: 9-10. 11-12. 13-14.

Azịza: Chineke ụnụ ga-abịa ịzọpụta ụnụ.

1. Ana m ege ntị n’ihe Chineke,Onyenweanyị na-ekwu

ihe ọ na-ekwu bụ udo maka ndị nke ya

N’ezie nzọpụta ya dị nsọ maka ndị na atụrụ ya egwu,

ka ebube ya wee nọgide n’ala anyị. Azza.

 2. Ịhụnanya na okwukwe amakụọla,

eziomume na udo ebiela ọma.

Irube isi ga-esi n’ala pulite,

eziomume ga-esi n’elu ledata anya. Azza.

3. Ee, Onyenweanyị ga-enye anyị ọganaihu,

ala anyị ga-amịta mkpụrụ, bawanye.

Eziomume ga-aga n’ihu ya,

udo ga na eso nzọ ụkwụ ya. Azza.

MBEKU

ALLELUỊA ALLELUỊA:

Meenụ ka ụzọ ya kwụrụ ọtọ mmadụ niile ga-ahụkwa nzọpụta nke Chineke.

ALLELUỊA.

Oziọma maka December 7 2020 – Luk 5: 17-26

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Otu ụbọchị, mgbe Jesu na-akụzi ihe, ndị Farisii na ndị nkụzi iwu nọ ebe ahụ, ndị si n’obodo niile nke Galili, Judia na Jerusalem bịa, ike nke Dinwenụ dinyekwaara Jesu ka o wee gwọọ ndị ọrịa.

Ụfọdụ ụmụnwoke butere otu nwoke ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ n’elu akwa ya, ha chọrọ ụzọ ibubata ya n’ụlọ, dọba ya n’ukwu Jesu.

Ebe ọ bụ na ha enweghị ike ibuba ya n’ime ụlọ ha meghee oghere n’elu ụlọ buda ya n’akwa ya n’etiti ebe Jesu nọ.

Ma mgbe Jesu hụrụ okwukwe ha, Ọ sịrị, “Nwoke, a gbagharala gị njọ gị niile!”

Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii bidoro jụba sị, “Onye bụ nwoke a na-ekwu arụ? Onye pụrụ ịgbaghara njọ ma ọ bụghị Chineke?”

Mgbe Jesu matara ihe ha na ajụ, Ọ sịrị ha, “Gịnị mere ụnụ jị ajụ ajụjụ a n’obi ụnụ?

Olee nke ka mfe, ị sị: ‘A gbagharala njọ gị niile, ka ọ bụ ị sị, ‘Bilie, were ụkwụ gị gaharịba?

Ma iji mee ka ụnụ mara na nwa nke mmadụ nwere ike n’elu ụwa ịgbaghara njọ,” Ọ sịrị nwoke ahụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, “Ana m agwa gị, bilie buru akwa gị laba.”

Nwoke ahụ biliri ozigbo, buru ihe o ji edina ala lawa, na-eto Chiiieke. Ihe a tụrụ igwe nmadụ ahụ n’anya nke mere ha ji too Chineke sị, “Anyị ahụla ihe anyị na-ahụbeghị mbụ taa.”

EKPERE NHUNYE

Nna, site n’ihe niile I nyere anyị, anyị na- ehunyere Gị achịcha na mmanya nke a. Ebe anyị na-efe Gị ugbu a, nara Onyinye anyị ma were nkwa ndụ ebighị ebi I kwere anyị gbaa anyị ume. Mezuoro anyị ihe ndị a site na Kristi Dinwenụ anyị. Amen.

EKPERE ANATACHAA ORIRI NSỌ

Nna, mee ka orikọ anyị nke a kwalite n’ime anyị ịhụ ihe nke eluigwe n’anya. Meekwa ka nkwa na nchekwube dị n’ime ya na-eduzi ụzọ anyị n’elu ụwa a. Anyị na-arịọ ihe ndị a site na Kristi Dinwenụ anyị. Amen.

IHE ỌGỤGỤ ỤNYAHỤ: Igbo Mass Readings December 6 2020, Ụka nke Abụọ n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.

IHE ỌGỤGỤ ECHI:   Igbo Mass Readings December 8 2020, Ịtụrụ Ime N’ejighị Njọ Nke Marịa Dị Ngọzi Nwaanyị na-amaghị Nwoke.

Igbo Mass Readings December 7 2020, Ncheta Ambrose Dị Asọ – Mọnde Izu Abụọ n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta.

Sonyere anyị na Facebook na Igbo Mass Readings 

error: Alert: Content is protected !!