Igbo Mass Readings November 23 2020, Mọnde Izu nke Iri Atọ na Anọ

Igbo Mass Readings November 23 2020, Mọnde Izu nke Iri Atọ na Anọ n’oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings November 23 2020, Mọnde Izu nke Iri Atọ na Anọ n'oge Adanyeghị n'Emume.
Igbo Mass Readings November 23 2020, Mọnde Izu nke Iri Atọ na Anọ n’oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ              14:1-3, 4-5.

Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Mkpughe.

Mụ onwe m bụ Jọn, lere anya hụ Nwaatụrụ ahụ ka o guzo n’ugwu Zayọn, ya na otu narị puku mmadụ, puku iri anọ na anọ, ndị e dekwasara aha ya na aha Nna ya n’egedegeihu ha.

Anụkwara m otu olu si n’eluigwe nke na-ekwo ka mmiri na-adakwa ka egbe elu. Olu ọzọ m nụrụ dịka ukwe ndị na-akpọ ụbọakwara, mgbe ha nọ n’elu ụbọ ha.

Otu narị puku na iri puku anọ na anọ ahụ guzo, chee ocheeze ahụ, anụ anọ ahụ dị ndụ na ndị okenye ahụ ihu, na-abụ abụ.

Ha na-abụ abụ ọhụrụ, nke naanị ha bụ ndị a a gbapụtara n’ụwa, pụrụ ịmụta. Ndị a bụ ndị na-emerụghị onwe ha site n’ịkwaiko.

N’ihina ha dị ọcha ka ụmụagbọghọ na-amaghị nwoke. Ha na-eso Nwaatụrụ ahụ ebe ọbụla ọ na-aga.

Ha bụ ndị a gbapụtara n’etiti mmadụ ịbụụrụ Chineke na Nwaatụrụ ahụ mkpụrụ mbụ. Ọ dịghịkwa ụgha ọbụla ahụrụ n’ọnụ ha. Ha enweghịkwa ntụpọ ọbụla.

ABỤỌMA NA AZỊZA:       Ps. 24:1-2, 3-4, 5-6.

Azịza:  Onyenweanyị, Ọ bụ ụdị ndị dị otu a na-achọ ihu Chineke nke Jekọb.

1.Chineke new ụwa na ihe niile dị nay a,

Ụwa na ndị niile bi n’ime ya;

Ọ bụ ya wụkwasara ya n’elu mmiri

Ọ bụ ya wuru ya n’elu osimiri. Azịza.

2. Onye nwere ike irigoro n’ugwu nke Onyenweanyị?

Onye nwere ike ịnọ n’ebe ya dị nsọ?

Onye aka ya na obi ya dị ọcha

Onye anaghị etinye obi ya n’ihe efu. Azịza.

3. Onye dị otu a ga-anata ngọzi n’aka Onyenwenayị,

Ọ ga-anatakwa eziomume n’aka Chineke onye nzọpụta ya.

Ọ bụ ụdị ndị dị otu a na-achọ Onyenweanyị,

Ndị na-achọ ihu Chineke nke Jekọb! Azịza.

MBEKU          Mkpughe 2:10.

Alleluịa, Alleluịa:

Bụrụ onye kwesịrị ntụkwasịobi ruo n’ọnwụ, Dinwenụ na-ekwu; Aga m enyekwa gị okpueze nke ndụ.

Alleluịa.

Oziọma maka November 23 2020 – Luk  21:1-4.

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Jesu letịrị anya elu, hụ ndị ha ọgaranya ka ha na-etinye ego ha n’ime igbe onyinye. Ọ hụrụ otu nwanyị ajadu dara ogbenye nke tụnyere ntakịrị mkpụrụ ego ọlaọkụ abụọ.

Ọ gwara ha sị, “N’ezie agwa m ụnụ, nwaanyị ajadu a dara ogbenye tinyere ego karịa ha niile.

N’ihina ha niile nyere site n’akụnụụba ha, ma nwaanyị a sitere n’ụkọ ya tinye ihe niile o nwere.

IHE ỌGỤGỤ ỤNYAHỤ: Igbo Mass Readings November 22 2020, Ụka Nke Ikpeazụ n’oge Adanyeghị n’Emume – Ụka Onyenweanyị Jesu Kristi, Eze Ụwa Niile.

IHE ỌGỤGỤ ECHI:   Igbo Mass Readings November 24 2020, Ncheta Andru Dunglac na Ndị Otu Ya.

Igbo Mass Readings November 23 2020, Mọnde Izu nke Iri Atọ na Anọ n’oge Adanyeghị n’Emume.

Sonyere anyị na Facebook na Igbo Mass Readings 

error: Alert: Content is protected !!