Igbo Mass Readings December 14 2020, Mọnde Izu Nke Atọ Oge Adventi

Igbo Mass Readings December 14 2020, Mọnde Izu Ụka Nke Atọ n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.

Igbo Mass Readings December 14 2020, Mọnde Izu Ụka Nke Atọ n'Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.
Igbo Mass Readings December 14 2020, Mọnde Izu Ụka Nke Atọ n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.

EKPERE MMEGHE

Dinwenụ, nụrụ olu anyị nke anyị na-ebuli elu n’ekpere. Mee ka ìhè nke ọbịbịa nke Gị zọpụta anyị n’ọchịchịrị nke njọ. Site na Dinwenụ anyị Jesu Kristi ….

Ihe Ọgụgụ Nke Mbụ         24:2-7, 15-17.

Ihe Ọgụgụ ewetara n’akwụkwọ Ọnụọgụgụ

Mgbe Balam chere ihu n’ịkpa, hụ ndị Izrel ka ha nọ n’agbụrụ n’agbụrụ. Mmụọ nke Chineke dakwasịrị ya, o wee buo amụma nke a sị: Ozi Balam nwa Beọ, okwu nwoke ahụ nke na-ekwu ihe miri emi. Nke pụrụ ịnụzu ihe Chineke na-ekwu.

Eji m anya na-eke gbaa na-ahụ ọhụ nke sị n’aka Chineke nke pụrụ ime ihe niile. Ụlọikwu ndị Izrel mara mma nke ukwuu, dịka igu nkwụ nke a tụrụ n’ọgbara dị ogologo ma ọ bụ dịka ubi nke a kụrụ n’akụkụ osimiri, dịka achara aloos nke Yahweh kụrụ, ma ọ bụ osisi sida nke na-eto n’akụkụ iyi!

Mmiri ga ezoro ha nke ukwuu, si n’ite mmiri ha na-awụsi. Ha ga-aghakwa mkpụrụ n’ubi ha nke mmiri dere nke ọma.

Eze ha ga-adị elu karịa Agag. A ga-ebuli alaeze ya elu. Mgbe ahụ ọ bụkwara amụma nke a, sị: Ozi Balam nwa Beọ, okwu nwoke ahụ nke na-ahụ ihe dị omimi, onye pụrụ ịnụzu ihe Chineke na-ekwu, onye maara nzube nke onye kacha elu, eji m anya na-eke gbaa na ahụ ọhụ nke si n’aka Chineke nke pụrụ ime ihe niile.

Ana m ahụ mba Izrel n’ogologo afọ ndị na-abịanụ Otu eze ga-esi na mba ahụ wapụta, dịka kpakpando na-eke gbaa. Eze ahụ ga-esi n’Izrel waa dịka ọnwa, Ọ ga-ejikwa mkpara ya si n’akụkụ tigbuo  ndị ndu Moab niile, werekwa ike ya tidaa ndị Set nan ganga ha niile.

ABỤỌMA NA AZỊZA: Ps. 25:4-5. 6-7. 8-9.

Azịza: Mee ka m mata ụzọ gị, O Onyenwenayị.

1.Mee  ka m mata ụzọ gị O Onyenweanyị,

kuziere m ụzọ gị.

Dube m n’ụzọ eziokwu gị, ma kụzibere m

N’ihina na ọ bụ gị bụ Chineke onye nzọpụta m. Azịza.

2. Cheta ebere gị, O Onyenweanyị,

chetakwa ịhụnanya gị na-enweghị ube nke

Ị gosịrị site na mgbe ochie.

Echetakwala mmehie niile m mere mgbe m dị na nwata,

Kama cheta m n’ịhụnanya gị,

n’ihi ịdị mma gị, O Onyenweanyị. Azịza.

3. Onyenweanyị dị mma, bụrụkwa onye eziomume,

Ọ na-akụziri ndị mmehie ụzọ

Ọ na-eduzi ndị umeala n’ihe niile kwụ ọtọ,

Ọ na-akụziri ndị ogbenye ụzọ ya. Azịza.

MBEKU

ALLELUỊA ALLELUỊA:

Gosị anyị ịhụnaanya gị dị ọkpụ O Onyenweanyị, nyekwa anyị nzọpụta gị.

ALLELUỊA.

Oziọma maka December 14 2020 – Matiu  21:23-27

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere.

Mgbe Jesu batara n’ụlọnsọ, ndị isi nchụaja na ndị okenye ndị Juu bịakwutere ya ka Ọ nọ na-akụzi nkuzi jụọ ya sị, “Olee ike I ji eme ihe ndị a niile, onye nyere gị ike a?” Jesu zara ha sị, “Aga m ajụkwa ụnụ ọtụtụ ajụjụ.

Ọ bụrụ na ụnụ zaaa m ya, aga m agwa ụnụ ike m ji eme ihe ndị a niile. Ebee ka mmirichukwu nke Jọn si? O si n’eluigwe ka o si n’aka mmadụ?”

Ha bidoro rụrịtaba ụka n’etiti onwe ha na-asị, “Ọ bụrụ na anyị ekwuo sị, o si n’eluigwe; ọ ga-ajụ anyị sị; gịnị mere ụnụ ejighị kwenye nay a?

Ma ọ bụrụ na anyị sị, o si n’aka mmadụ, ụjọ ihe ndị mmadụ ga-eme na-atụ anyị n’ihi na onye ọ bụla kwere na Jọn bụ onyeamụma.”

Ha zara Jesu sị, “Anyị amaghị.” Jesu asị ha, Mụ onwe m agaghịkwa agwa ụnụ ike m ji eme ihe ndị a niile.

EKPERE NHUNYE

Nna, site n’ihe niile I nyere anyị, anyị na- ehunyere Gị achịcha na mmanya nke a. Ebe anyị na-efe Gị ugbu a, nara Onyinye anyị ma were nkwa ndụ ebighị ebi I kwere anyị gbaa anyị ume. Mezuoro anyị ihe ndị a site na Kristi Dinwenụ anyị. Amen.

EKPERE ANATACHAA ORIRI NSỌ

Nna, mee ka orikọ anyị nke a kwalite n’ime anyị ịhụ ihe nke eluigwe n’anya. Meekwa ka nkwa na nchekwube dị n’ime ya na-eduzi ụzọ anyị n’elu ụwa a. Anyị na-arịọ ihe ndị a site na Kristi Dinwenụ anyị. Amen.

IHE ỌGỤGỤ ỤNYAHỤ: Igbo Mass Readings December 13 2020, Izu Ụka nke Atọ n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.

IHE ỌGỤGỤ ECHI: Igbo Mass Readings December 15 2020, Tuezde Izu Ụka Nke Atọ n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.

Igbo Mass Readings December 14 2020, Mọnde Izu Ụka Nke Atọ n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.

Sonyere anyị na Facebook na Igbo Mass Readings 

error: Alert: Content is protected !!