Igbo Mass Readings October 26 2020 Mọndee Izu Iri Atọ n’Oge Nkiti

Igbo Mass Readings October 26 2020, Mọndee Izu Iri Atọ n’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings October 26 2020, Mọndee Izu Iri Atọ n'Oge Adanyeghị n'Emume.
Igbo Mass Readings October 26 2020, Mọndee Izu Iri Atọ n’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ    4:32-5:8

Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Pọl degaara ndị Efesọs.

Kama nweenụ afọọma, obinrọ, na-agbagharịtanụ ibe ụnụ otu Chineke si gbaghara ụnụ n’ime Kristi.

Bụrụnụ ndị na-eñomi Chineke dịka ụmụ ya ọ hụrụ n’anya. Na-agakwanụ n’ime ịhụnaanya, dịka Kristi siri hụ anyị n’anya ma were ndụ ya nye Chineke maka anyị, dịka aja na onyinye nke isiụtọ.

Ịkwaiko, ndụ ruru inyi mọbụ anyaukwu ekwesịghị ịkpọ aha n’etiti ụnụ dịka o kwesịrị ndị nsọ.

Ka a ghara inwe iru inyi ọbụla, nke a na-enwe okwu nzuzu, mọbụ ihe na-abaghị n’ihe ndị ekwesịghị ekwesị, kama ka e nwee inye ekele.

Maranụ nke a, na ọ dịghị onye ọbụla na-akwa iko, mọbụ onye adịghị ọcha, mọbụ onye anyaukwu (nke bụ onye na-ekpere arụsị) nwere oke ọbụla n’alaeze nke Kristi na Chineke.

Ụnụ ekwela ka onye were okwu efu rafuo ụnụ. Ọ bụ n’ihi omume ọjọọ ndị a ka iwe Chineke ji abịakwasị ndị anaghị erubere ya isi.

Ụnụ na ndị dị otu a enwela mmekọ. Na mgbe mbụ, ụnụ bụ ọchịchịrị ma ugbu a, ụnụ bụ ihe n’ime Dinwenụ. Na-ebinụ ndụ ka ụmụ nke ihe.

ABỤỌMA NA AZỊZA: Ps. 1:1-2, 3, 4, 6.

Azịza:  Bụrụnụ ndị na-eñomi Chineke dịka ụmụ ya ọ hụrụ n’anya.

  1. Añụrị ga-adịrị nwoke ahụ nke anaghị eso

ndụmọdụ onye ajọomume,

mọbụ na-akwụgharị n’ụzọ ndị ome njọ

mọbụ nọdụ n’otu ndị na-ekwutọ Chineke;

Kama ọ na-enwe añụrị n’ebe iwu Onyenweanyị dị

ma na-achịgharị iwu ya n’obi ya ehihie na abalị. Azịza.

2. Ọ dị ka osisi

a kụrụ n’akụkụ iyi,

nke na-amịpụta mkpụrụ ya n’oge ya,

nke akwụkwọ ya anaghị akpọnwụ akpọnwụ,

ihe niile ọ na-eme na-agara ya nke ọma. Azịza.

3. Ọ dịghị otu a n’ebe ndị ajọ mmadụ nọ

Mba, n’ihina ha dịka afụrụ ọka nke ikuku na-ebugharị.

N’ihina Onyenwenayị na-echekwaba ụzọ ndị eziomume,

mana ụzọ ndị ajọ mmadụ na-eduba n’ila n’iyi. Azịza.

MBEKU          Ps. 119:27

Alleluịa, Alleluịa:

Mee ka m ghọta ihe iso ụzọ gị pụtara, ka m wee nwee ike ịchịgharị ọrụ ịtụnaanya gị n’obi m.

Alleluịa.

Oziọma maka October 26 2020 – Luk 13:10-17.

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

N’otu ụbọchị izu ike, Jesu nọ n’otu ụlọnzukọ ndị Juu na-akuzi ihe. N’ebe ahụ, e nwere nwaanyị nke mmụọ nrịanrịa ji ihe dịka afọ iri na asatọ.

Ọ rọọla nwanyị ahụ o nweghịkwa ike iguzozi eguzo.  Mgbe Jesu hụrụ ya, Ọ kpọrọ ya sị ya, “Nwaanyị, e meela ka ị pụọ na nrịanrịa gị.” Jesu bikwasara ya aka ya abụọ, ozigbo nwaanyị guzozie, wee too Chineke.

Iwe were onyeisi ụlọnzukọ ahụ, n’ihina Jesu gwọrọ ọrịa n’ụbọchị Sabat; maka nke a ọ gwara ndị mmadụ sị, “Ọ dị ụbọchị isii iwu nyere mmadụ ike ịrụ ọrụ, bịanụ n’ụbọchị ndị ahụ ka a gwọọ ụnụ, ọ bụghị n’ụbọchị sabat.”

Onyenwenayị zara ya sị, “Ụnụ ndị ihu abụọ! O nwere onye n’ime ụnụ na-anaghị atọpụ ehi ya mọbụ ịnyịnyaibu ya n’ụlọ anụ, duga ya ka ọ ñụọ mmiri n’ụbọchi izuike?

Ọ bụ na nwaanyị a bụ ada nke si n’agbụrụ Abraham, onye Ekwensu kere agbụ, kamgbe afọ iri na asatọ ekwesịghị ka a tọpụ ya agbụ n’ụbọchị izuike?”

Ka ọ na-ekwu nke a, ihere mere ndịiro ya niile, ma ndị mmadụ niile nwere añụrị maka ihi ọrụ ebube nke ọ rụrụ.

IHE ỌGỤGỤ ỤNYAHỤ: Igbo Mass Readings October 25 2020, Ụka Iri Atọ n’oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ ECHI: Igbo Mass Readings October 27 2020, Tuezdee Izu Iri Atọ n’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings October 26 2020, Mọndee Izu Iri Atọ n’Oge Adanyeghị n’Emume.

Sonyere anyị na Facebook na Igbo Mass Readings 

error: Alert: Content is protected !!