Igbo Mass Readings November 16 2020, Mọndee Izu Iri Atọ na Atọ Oge

Igbo Mass Readings November 16 2020, Mọndee Izu Iri Atọ na Atọ n’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings November 16 2020, Mọndee Izu Iri Atọ na Atọ n'Oge Adanyeghị n'Emume.
Igbo Mass Readings November 16 2020, Mọndee Izu Iri Atọ na Atọ n’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ              1:1-4, 2:1-5

Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Mkpughe.

Mkpughe nke Jesu Kristi, nke Chineke nyere ya, iji gosị ụmụodibo ya, ihe ụfọdụ ga-emerịrị n’oge na-adịghị anya. Jesu mere ka odibo ya bụ Jọn mata ihe ndị a, site n’aka Mmụọọma ya nke o zigaara ya.

Jọn n’onwe ya kọrọ ihe niile ọ hụrụ,bịa site na ya gbaara okwu Chineke na ihe Jesu Kristi kwuru akaebe.  Ngọzi dịịrị onye ọbụla na-agụpụta okwu amụma nke a!

Ngọzi dịkwara ndị niile na-anụ ya na-edebekwa ihe niile e dere n’ime ya n’ihina oge adịla nso!

Jọn degaara nzukọ asaa ndị dị n’Eshịa akwụkwọ sị: Amara na udo nke sitere n’aka onye ahụ dị adị, onye ahụ dịbu na mbụ na onye ahụ ga-abịanụ, ya na, site na mmụọ asaa ahụ ndị nọ n’ihu ocheeze Chineke.

Dee akwụkwọozi degaara Mmụọọma nke nzukọ Kristi nọ n’Efesọs: Nke a bụ ozi nke onye ahụ ji kpakpando asaa n’aka iri ya, na nke na-ejegharị n’etiti ihe ndọba oriọna asaa ahụ e ji ọlaedo mee na-ezi ụnụ.

Amaara m ọrụ gị niile, mgbalị gị na ndidi gị. Amaara m na ị naghị anabata ndị ihe ọjọọ, kama ị nwaleela ndị kpọrọ onwe ha ụmụazụ ma ha abụghị, wee chọpụta na ha bụ ndị okwu asị.

Amakwa m na ị na-enwe ogologo ndidi, na-anabata ihe niile n’ihi aha m. Ike agwụbeghịkwa gị.

Nke a bụ iwe m n’ebe  ị nọ: ịhụnaanya gị n’ebe m nọ adịghịkwa ekpo ọkụ otu ọ dị na mbụ.

Cheta ebe dị elu nke i si na ya dapụ, chegharịa, na-arụkwa ọrụ gị dịka ị si arụ na mbụ. Ma ọ bụghị otu a, aga m abịakwute gị bupụ ihe ndọba oriọna gị n’ọnọdụ ya.

ABỤỌMA NA AZỊZA:  Ps. 1:1-2, 3, 4, 6.

Azịza:  Onye ọbụla nwetara mmeri, aga m ekwe ka ọ taa mkpụrụ osisi nke ndụ.

1.Aụrị ga-adịrị nwoke ahụ

nke anaghị eso ndụmọdụ onye ajọomume,

Mọbụ na-akwụgharị n’ụzọ ndị ome njọ

mọbụ nọdụ n’otu  ndị na-ekwutọ Chineke;

Kama ọ na-enwe aụrị n’ebe iwu Onyenweanyị dị

ma na-achịgharị iwu ya n’obi ya ehihie na abalị. Azịza.

2. Ọ dị ka osisi a kụrụ n’akụkụ iyi,

Nke  na-amịpụta mkpụrụ ya n’oge ya

nke akwụkwọ ya anaghị akpọnwụ akpọnwụ

Ihe niile ọ na-eme na agara ya nke ọma. Azịza.

3. Ọ dịghị otu a n’ebe ndị ajọ mmadụ nọ;

Mba, n’ihina ha dịka afụrụ ọka nke ikuku na-ebugharị.

N’ihina Onyenweanyị na-echekwaba ụzọ ndị eziomume

Mana ụzọ ndị ajọ mmadụ na-eduba n’ila n’iyi. Azịza.

MBEKU          Jọn 8:12.

Alleluịa, Alleluịa:

Abụ m ihe nke ụwa, Onyenwenayị na-ekwu. Onye ọbụla na-eso m ga-enwe ihe nke ndụ.

Alleluịa.

Oziọma maka November 16 2020 – Luk 18:35-43

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Ka Jesu na-abịaru Jeriko nso, otu onye isi nọdụrụ ala n’akụkụ ụzọ na-arịọ arịrịọ. Ọ nụrụ ụzụ igwe mmadụ ka ha na-agafe, o wee jụọ ihe kpatara ụzụ ji atụ.

Ha gwara ya sị, “Jesu onye Nazaret na-agafe!” O tiri mkpu sị, “Jesu, nwa Devid, meere m ebere!” 

Ndị nọ n’ihu baara ya mba, na-agwa ya ka o mechie ọnụ; o tisikwara mkpu ike karịa sị, “Jesu nwa Devid, meere m ebere!”

Jesu kwụsịrị, nye iwu ka e dutere ya onye isi ahụ. Mgbe ọ bịaruru ya nso ọ jụọ ya sị: “Gịnị ka ị chọrọ ka m meere gị?”

Ọ zara ya sị, “Onyenwe m, mee  ka m hụkwa ụzọ ọzọ.” Jesu gwara ya sị: “Hụbakwa ụzọ, okwukwe gị agwọọla gị.”

O bidoro hụba ụzọ ozigbo, soro ya na-aga, na-eto Chineke. Ndị mmadụ niile hụrụ nke a, nyere Chineke otito.

IHE ỌGỤGỤ ỤNYAHỤ: Igbo Mass Readings November 15 2020, Ụka Iri Atọ na Atọ n’oge Nkiti

IHE ỌGỤGỤ ECHI:     Igbo Mass Readings November 17 2020, Tuezdee Izu Iri Atọ na Atọ n’Oge Adanyeghị n’Emume, Ncheta Elizabet nke Họngarị dị asọ.

Igbo Mass Readings November 16 2020, Mọndee Izu Iri Atọ na Atọ n’Oge Adanyeghị n’Emume.

Sonyere anyị na Facebook na Igbo Mass Readings 

error: Alert: Content is protected !!