Igbo Mass Readings November 9 2020, Odido Nsọ Ụlọ Ụka Jọn Lateran

Igbo Mass Readings November 9 2020, Emume Odido Nsọ Ụlọ Ụka Jọn Lateran dị Nsọ.

Igbo Mass Readings November 9 2020, Emume Odido Nsọ Ụlọ Ụka Jọn Lateran dị Nsọ.
Igbo Mass Readings November 9 2020, Emume Odido Nsọ Ụlọ Ụka Jọn Lateran dị Nsọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ      47:1-2, 8-9, 12.

Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Izikel

Nwoke ahụ wee kpọghachikwa m azụ n’ọnụụzọ ụlọnsọ; ma lee, mmiri si n’okpuru ụlọnsọ ahụ agbapụta na-asọda ụzọ ọwụwa anyanwụ ụlọ ahụ (maka na ụlọ nsọ ahụ chere ọwụwa anyanwụ ihu).

Mmiri si okpuru aka nri ụlọnsọ ahụ asọda na ndịda ebe nchụaja. O sikwa n’ọnụzọama nke dị na mgbago ugwu dupụta m, dugharịa m okirikiri n’ezi ruo n’ọnụụzọama nke mpụta nke chere ihu n’ọwụwa anyanwụ ebe mmiri ahụ sin a ndịda ugwu na-asọpụta.

Ọ gwa m sị, “Mmiri a si n’ọwụwa anyanwụ asọda na-agbada na Araba; mana mgbe ọ banyere na mmiri ahụ anaghị asọ asọ mmiri ahụ ga-agbanwe dị mma ọñụñụ.

Ebe ọbụla mmiri ahụ gara, ihe ọbụla e kere eke na-egwu mmiri dị na ya ga-adị ndụ, a ga-enwe ọtụtụ azụ maka na mmiri a na-abanye ebe ahụ ka mmiri osimiri dịkwa ọhụrụ, ya bụ na ihe ọbụla dị nay a ga-adị ndụ ebe ọbụla mmiri ahụ sọgara.

N’akụkụ abụọ nke ikpere mmiri ahụ, ọtụtụ osisi dị iche iche a na-eri eri ga-eto.  Akwụkwọ ha agaghị akpọnwụ akpọnwụ, nke mkpụrụ ga-akọ ha n’elu; ma ha ga na-amị mkpụrụ ọhụrụ ọnwa ọbụla maka na mmiri ha ji eto si n’ebe dị nsọ agbapụta. A ga-eji mkpụrụ ha eme ihe oriri werekwa akwụkwọ ha agwọ ọrịa.”

ABỤỌMA NA AZỊZA YA:  Ps. 45:1-2, 5-6, 8-9.

Azịza: Lee ka ụlọ obibi gị siri makarichaa mma, Osebụrụwa pụrụ ime ihe niile.

1. Ọ na-agụ m nnukwu agụụ,

ka m bata n’ogige Osebụrụwa,

ka mkpụrụobi m na anụahụ m

na-ekwere Chineke dị ndụ ukwe ọñụ. Azịza.

2. Ka o si dị, nnụnụ ebelebe na-achọtara onwe ya ụlọ obibi,

nnụnụ eleke achọtara onwe ya akwụ,

ebe ọ ga-edote ụmụ ya n’akụkụ ebe nchụaja gị,

Onyenweanyị onye pụrụ ime ihe niile,

onye bụ eze m na Chineke m. Azịza.

3. Ha bụ ndị agọziri agọzi, ndị bi n’ụlọ gị

na-ekwere gị ukwe otito oge niile.

Ndị ike ha si na gị bụ ndị agọziri agọzi,

ndị bụ n’obi ha ụzọ a na-esi eru Zayọn.  Azịza.

4. N’ihina otu ụbọchị n’ebe gị ka mma

karịa nnụkwuru nnụ afọ ebe ọzọ,

Ọ kaara m mma ịbụ onye nche ụzọ n’ụlọ nke Onyenweanyị,

karịa ibi n’ebe obibi ndị ajọ mmadụ. Azịza.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ           3:9-11, 16-17

Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Ozi Mbụ Pọl dị asọ degaara Ndị Kọrịnt

N’ihina anyị bụ ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ; ụnụ bụ ala ubi nke Chineke, na ụlọ ya.

Dịka amara nke Chineke nyere m si dị, na dịka ọkacha mara n’iwu ụlọ, atọrọ m ntọala, onyeọzọ na-ewukwasịkwa n’elu ya.

Ma onye ọrụ ọbụla ga-elezi anya otu o si ewukwasị n’elu ntọala ahụ. N’ihina ọ dịghị onye pụrụ ịtọ ntọala ọzọ, ma ọ bụghị nke ahụ Chineke tọrọla bụ Jesu Kristi.

Ọ bụ na ụnụ amaghị na ụnụ bụ ụlọ nsọ nke Chineke, na Mmụọ nke Chineke bikwa n’ime ụnụ? Ọ bụrụ na onye ọbụla emebie ụlọnsọ Chineke, Chineke ga-emebikwa onye ahụ. N’ihina ụlọ Chineke bụ ụlọ dị nsọ.

ALLELUỊA            

Alleluịa, Alleluịa:

N’ihina ugbu a, ahọrọla m ụlọ nsọ a ma dobekwa ya nsọ, ka aha m nọrọ ebe ahụ ebeebe, anya m na obi m ga-adịgide n’ebe ahụ.

Alleluịa.

Oziọma maka November 9 2020 – Jọn 2:13-22

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere

Mgbe oge Emume Ngabiga nke ndị Juu na-eru nso, Jesu gbagoro na Jerusalem. N’ime ụlọnsọ, ọ hụrụ ndị na-ere ehi, atụrụ na nduru, nakwa ndị na agbanwe ego ka ha nọ na-azụ ahịa.

Jesu  weere ụdọ meee ụtalị, si n’ụlọnsọ chụpụ ha niile, ma atụrụ, ma ehi. O kpudokwara oche ndị na-agbanwe ego ihu n’ala, fesachaa ego ha.

Ọ gwara ndị na-ere nduru sị, “Chịpụnụ ihe ndị a n’ebe a! Ụnụ emela ụlọ Nna m ka ọ bụrụ ụlọ ahịa!”

Ndị na-eso ụzọ ya chetara  na e dere sị, ‘Mmasị nke ụlọ gị na-anụ m ọkụ n’obi.” Ndị Juu jụrụ ya sị, “Olee akara Ị ga-egosị anyị banyere ime ihe ndị a?”

Jesu zara ha sị, “Mebienụ ụlọnsọ nke a, aga m arụghachikwa ya na mkpụrụ ụbọchị atọ.” Ndị Juu zaghachiri ya sị, “O were iri afọ anọ na isii iji rụọ ụlọnsọ a.

Ị ga-arụchi ya na mkpụrụ ụbọchị atọ?” Ma Jesu na-ekwu banyere ụlọnsọ nke bụ ahụ ya.

Mgbe o siri n’ọnwụ bilie, ndị na-eso ụzọ ya chetara na o kwuru okwu a. Ha wee kwere n’Akwụkwọ Nsọ na n’okwu Jesu kwuru.

IHE ỌGỤGỤ ỤNYAHỤ: Igbo Mass Readings November 8 2020, Ụka Iri Atọ na Abụọ n’oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ ECHI:  Igbo Mass Readings November 10 2020, Ncheta Leo Dị Asọ

Igbo Mass Readings November 9 2020, Emume Odido Nsọ Ụlọ Ụka Jọn Lateran dị Nsọ.

Sonyere anyị na Facebook na Igbo Mass Readings 

error: Alert: Content is protected !!