Igbo Mass Readings December 5 2020, Satọde Izu nke Mbụ Oge Adventi

Igbo Mass Readings December 5 2020, Satọde Izuụka nke Mbu n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.

Igbo Mass Readings December 5 2020, Satọde Izuụka nke Mbu n'Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.
Igbo Mass Readings December 5 2020, Satọde Izuụka nke Mbu n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.

EKPERE MMEGHE

Chineke Nna anyị, Ị hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu were zite sọ otu Nwa Gị ka Ọ gbapụta anyị n’aka ike ọkpụtara-ọkpụ nke njọ na ọnwụ. Nyere anyị bụ ndị na-eche ọbịbịa Ya aka, ma dubata anyị ezi inwere-onwe-onye. Site na Dinwenụ anyị Jesu Kristi…

Ihe Ogugu Nke Mbụ   30:19-21, 23-26

Ihe Ọgụgụ ewetara n’akwkw Onye Amma Azaya

Osebụrụwa, Chineke, Onye nsọ nke Izrel ekwuo1a sị: Ee, ụnụ ndị Zayọn bi na Jerusalem; ụnụ agaghị ebekwa akwa ọzọ.

Ọ ga egosikwa ụnụ amara mgbe ọ nụrụ mkpu akwa ụnụ; ọ ga azọkwa ụnụ. Ọ bụ ezie na Chineke nyere ụnụ achịcha nke ntaramahụhụ, nakwa mmiri nke ịta ahụhụ, ma onye nkuzi ụnụ agaghị ezokwa onwe ya ọzọ, ụnụ ga-ahụ onye nkuzi ụnụ.

Ma ụnụ ga anụkwa okwu n’azụ ụnụ, nke na-asị, “Nke a bụ ụzọ, gabanụ na ya,” mgbe ụnụ tụgharịrị na-aka nri mọbụ n’aka ekpe ụnụ.

Ọ ga ezite mmiri ozuzo n’ebe ihe niile ụnụ kụrụ na-ala dị nakwa mkpụrụ nke ala mịpụtara, nke ga-aba ụba ma buokwa ibu.

N’ụbọchị ahụ ehi ụnụ ga-atakwa nri n’ebe ahịhịa bara ụba. Ma ehi ọrụ nakwa ịnyịnyaibu ụnụ nke na akọ ọrụ, ga erikwa ahịhịa dị ụtọ, dịkwa mma, bụ nke e ji ọgụ na ndụdụ kọpụta.

Mmiri ga agbapụta site n’elu ugwu ukwu na nke nta niile, n’ụbọchị nke oke ogbugbu mmadu, mgbe ụlọnche ha niile ga-ada.

Ihè ọnwa ga-achawa dịka nke anyanwụ, n’oge ahụ ìhè anyanwụ ga achawapụta okpukpu asaa dịka ìhè nke abalị asaa.

N’ụbọchị ahụ Osebụrụwa ga-ekechi ọnya ndị nke ya, ma gwọkwaa ha mmerụ ahụ nke ha nwetara site na-aka ya.

ABỤỌMA NA AZỊZA: Ps: 147: 1-2.3-4. 5-6.

Azịza: Ngozi diri ndi niile chekwubere na ya.

1. Toonu Chineke, n’ihina ọ dị mma,

ọ dị mma ikwere Chineke ukwe;

o kwesiri ikwere ya ukwe otito n’ihina ọdị obi ebere.

Onyenweanyị, onye na-ewugharị Jerusalem;

ọ bụ ya kpọghachiri ụmụ Izrel ndị a dọọrọ n’agha. Azza.

2. Ọ na-akasị ndị obi gbawara obi,

na-ekechikwa ọnya ha nile

Ọ maara ọnụọgụgụ kpakpando niile,

na enyekwa nke ọbụla aha ya. Azza.

3. Chineke anyị dị ukwuu onye ji ike niile,

Amamihe ya enweghịkwa ngwụcha.

Onyenweany na-ebulite ndị umeala

ma na-ebuda ndị obi ọjọọ n’ala. Azza.

MBEKU

ALLELUIA ALLELUIA:

N’ihi na Osebụrụwa bụ ọka-ikpe anyị, ọ bụkwa onye ndụ anyị. Chineke bụ eze anyị, ọ ga-azọpụta anyị.

ALLELUIA.

Oziọma maka December 5 2020 – Matiu 9:35-10:1, 6-8

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere.

Jesu na-agagharị n’obodo na n’ogbe ha niile, na akụzi nkụzi n’ụlọ nzukọ ha, na ekwusa oziọma nke alaeze Chineke, na-agwọkwa ọrịa na nrịanrịa ha niile.

Mgbe ọ hụrụ ọtụtụ igwe mmadụ ahụ, ebere ha mere ya, n’ihina ha nọ na nsogbu.

Ha enweghịkwa onye enyemaka, ha dịka atụrụ, na- enweghị onye nche. Jesu wee gwa ndị na-eso ụzọ ya sị, “Owuwe ihe ubi bara ụba, mana ndị ọrụ dị olemole.

Ya bụ, rịọnụ Dinwenụ nke owuwe ihe ubi ka o ziga ndị ọrụ n’ugbo ya.” Jesu kpọrọ ndị ụmụazụ ya iri na abụọ, nye ha ike ịchụpụ ajọ mmụọ na ịgwọ ọrịa na nrịanrịa niile dị icheiche.

O nyere ha iwu sị, “Kama jekwurunụ ụmụatụrụ furu efu nke ụlọ Izrel. Ka ụnụ na-aga, na-ekwunụ sị, “Alaeze eluigwe adịla nso.”

Gwọọnụ ndị ọrịa, kpolitenụ ndị nwụrụ anwụ, meenụ ndị ekpenta ka ha dị ọcha, chụpụkwanụ ajọ mmụọ. Ụnụ natara n’efu, nyekwanụ n’efu.

EKPERE NHUNYE

Dinwenụ, mee ka onyiye nke a anyị ji okwukwe na ịhụnaanya na-ehunyere Gị ghọọrọ anyị aja na-enweghị ngwụcha iji nye Gị otito. Meekwa ka ha bụrụ n’ezie Eucharịstịa anyị na nzọpụta anyị. Mezuoro anyị ihe ndị a site na Kristi Dinwenụ anyị Amen.

EKPERE ANATACHAA ORIRI NSỌ

Chineke Onye ebere, mee ka Eucharịstịa nke a wetara anyị enyemaka Gị, zọpụta anyị na njọ, ma kwadokwa anyị maka ọmụmụ nke onye nzọpụta anyị bụ Dinwenụ ebighị ebi, ebighị ebi. Amen.

IHE ỌGỤGỤ ỤNYAHỤ: Igbo Mass Readings December 4 2020, Fraịde Izuụka nke Mbu n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.

IHE ỌGỤGỤ ECHI:   Igbo Mass Readings December 6 2020, Ụka nke Abụọ n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.

Igbo Mass Readings December 5 2020, Satọde Izuụka nke Mbu n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.

Sonyere anyị na Facebook na Igbo Mass Readings 

error: Alert: Content is protected !!