Igbo Mass Readings October 10 2020 Satọde Izu Iri Abụọ na Asaa Oge Nk

Igbo Mass Readings October 10 2020, Satọde Izu Iri Abụọ na Asaa n’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings October 10 2020, Satọde Izu Iri Abụọ na Asaa n'Oge Adanyeghị n'Emume.
Igbo Mass Readings October 10 2020, Satọde Izu Iri Abụọ na Asaa n’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ  3:22-29

Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Pọl degaara ndị Galeshịa.

Mana Akwụkwọ Nsọ edobela ihe niile n’okpuru njọ ka e wee nye ndị kwere ekwe nkwa ahụ e kwere ha n’ime Jesu Kristi.

Ugbu a, tupu okwukwe abịa, anyị niile nọ n’okpuru iwu, a machibidoro anyị niile ruo mgbe a ga-ekpughere anyị okwukwe.

Ya bụ na iwu ahụ bụ onye nlekọta anyị ruo mgbe Kristi bịara, ka e wee gụnye anyị na ndị eziomume site n’okwukwe.

Mana ugbu a okwukwe bịara, anyị anọghịkwa n’okpuru onye nlekọta ahụ bụ iwu; n’ihina n’ime Jesu Kristi ụnụ niile bụ ụmụ Chineke site n’okwukwe.

Ka ụnụ niile ha, bụ ndị e mere mmirichukwu n’ime Kristi eyikwasala Kristi dịka uwe.

Nkewa nke na-adịbu n’etiti ndị Juu na ndị Grik, n’etiti ndị ohu na ndị nwe onwe ha, n’etiti ụmụnwoke na ụmụnwaanyị, apụghị ịchịkwa ọzọ n’ihina ụnụ niile bụ otu n’ime Jesu Kristi.

Ọ bụrụ na ụnụ bụ ndị nke Kristi ụnụ bụkwa ụmụ Abraham ndị ga-eketa ihe e kwere na nkwa.

ABỤỌMA NA AZỊZA:  Ps. 105: 2-3, 4-5, 6-7

Azịza: Onyenweanyị ga-echeta ọgbụgbandụ ya ebighịebi ebighịebi.

  1. Kweerenụ ya ukwe kụọrọnụ ya egwu

Kwupụtanụ ọrụ ịtụnanya ya niile!

Nwebenụ añụrị n’aha nsọ ya

Ka obi niile na-achọ Chineke ñụrịa. Azịza.

2. Chọbanụ Onyenweanyị na ike ya

Chọbanụ ihu nke Onyenweanyị mgbe niile

Chetanụ ọrụ ebube niile ọ rụrụ

ọrụ ịtụnanya ya niile na ikpe niile si n’ọnụ ya pụta. Azịza.

3. Ụnụ ụmụ Abraham bụ nwodibo ya

ụmụ Jekọb bụ onye nke ọ họọrọ!

Ọ bụ ya bụ Onyenweanyị na Chineke anyị

Ike ọchịchị ya gazuru ụwa niile. Azịza.

MBEKU      Lk 8:15

Alleluịa, Alleluịa:

Ha nwere isi ọma bụ ndị nụrụ okwu Chineke, were ikwesi ntụkwasịobi na obi dị mma jidesie ya ike, werekwa ndidi mịpụta mkpụrụ.

Alleluịa.

Oziọma maka October 10, 2020 – Luk 11:27-28

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Mgbe Jesu na-ekwu okwu ndị a, otu nwaanyị si n’etiti igwe mmadụ ahụ welie olu sị, “Ngọzi na-adịrị afọ nke mụrụ gị na ara Ị ñụrụ!”

Ma Jesu zara sị, “Ngọzi na-adịrị ha karịa, bụ ndị nụrụ okwu Chineke dobekwa ya!”

IHE ỌGỤGỤ ỤNYAHỤ: Igbo Mass Readings October 9 2020, Fraịde Izu Iri Abụọ na Asaa n’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ ECHI: Igbo Mass Readings October 11, 2020, Ụka Iri Abụọ na Asatọ n’oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings October 10 2020, Satọde Izu Iri Abụọ na Asaa n’Oge Adanyeghị n’Emume.

Sonyere anyị na Facebook na Igbo Mass Readings

error: Alert: Content is protected !!