Igbo Mass Readings October 17 2020 Satọdee Izu Iri Abụọ na Asatọ n’Oge

Igbo Mass Readings October 17 2020, Satọdee Izu Iri Abụọ na Asatọ n’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings October 17 2020, Satọdee Izu Iri Abụọ na Asatọ n'Oge Adanyeghị n'Emume.
Igbo Mass Readings October 17 2020, Satọdee Izu Iri Abụọ na Asatọ n’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ    1:15-23

Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Pọl degaara ndị Efesọs.

N’ihi nke a, mgbe m nụrụ banyere okwukwe ụnụ nwere n’ime Dinwenụ anyị Jesu Kristi na ịhụnaanya ụnụ nwere n’ebe ndị nsọ niile nọ, ewepụghị m aka n’ikele Chineke banyere ụnụ.

Ana m echeta ụnụ n’ekpere. Ka Chineke nke Dinwenụ anyị Jesu Kristi, Nna nke otito, nye ụnụ mmụọ nke amamiihe na nke mkpughe iji mata ya.

Ana m arịọkwa ka Chineke meghee anya nke obi ụnụ, ka ụnụ wee mata ihe bụ nchekwube nke ọkpụkpọ ọ kpọrọ ụnụ, na ihe bụ akụ nke nketa ahụ dị ebube n’etiti ndị nsọ ya; na ihe bụ ịdị ukwu na-enweghị atụ nke ike ya n’ime anyị, bụ ndị kwere ekwe, dịka ọrụ nke ike aka ya siri dị.

Nke a bụ nke o mejupụtara n’ime Kristi mgbe o siri n’ọnwụ kulie ya, mekwaa ka ọ nọrọ n’aka nri ya n’alaeze eluigwe, ka ọ nọdụ n’ebe dị elu karịchaa ọchịchị niile na ike niile na ịbụ isi niile, bịa dịkwa elu karịa aha ọbụla a marala, ọ bụghị naanị n’ọgbọ nke a, kama ma ọgbọ nke ga-abịanụ.

Chineke edobekwala ihe niile n’okpuru ụkwụ ya, mekwaa ya isi ihe niile maka nzukọ ya, nke bụ ahụ ya, na uju nke onye ahụ na-emezu ihe niile jupụtara ihe niile.

ABỤỌMA NA AZỊZA: Ps. 8:1-2, 3-4, 5-6.

Azịza: I mere nwa gị nnaukwu ihe niile e kere eke.

  1. Onyenweanyị  Chineke anyị,

lee ka aha gị siri dị elu n’ụwa niile,

Ị buligo ebube gị elu karịa eluigwe.

Ụmụaka na ndị e ku n’aka na-ekwe ukwe ebube gị

Ị na-akwụsi ike n’ebe ndịiro gị nọ. Azịza.

2. M lee anya n’eluigwe i ji aka gị mee

ya na ọnwa na kpakpando i kere;

gịnị ka mmadụ bụ i ji eche echiche banyere ya

nwa nke mmadụ na ị na-eleta ya anya? Azịza.

3. N’agbanyeghị i mere ka o jiri obere ihe karịa ndị mmụọọma nta,

I jikwa ugwu na nsọpụrụ chọọ ya mma dịka okpueze

I mere ya nnaukwu ihe niile e kere eke

were ihe niile dobe n’okpuru ya. Azịza.

MBEKU        I Jọn 2:5

Alleluịa, Alleluịa:

Onye ọbụla nke na-edobe okwu ya, n’ezi, ịhụnaanya maka Chineke zuru oke n’ime ya.

Alleluịa.

Oziọma maka October 17, 2020 – Luk 12:8-12

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Agwa m ụnụ, onye ọbụla na-ekwupụta m n’ihu ndị mmadụ ka Nwa nke mmadụ ahụ ga-ekwupụta n’ihu ndị mmụọọma nke Chineke, ma onye ahụ nke na-agọnahụ m n’ihu ndị mmadụ, ka a ga-agọnahụ n’ihu ndị mmụọọma nke Chineke.

Onye ọbụla na-ekwu okwu megide Nwa nke mmadụ ahụ, a ga-agbaghara ya, ma a gaghị agbaghara onye ọbụla nke na-ekwutọ Mmụọ Nsọ.”

Mgbe ha kpụpụtara ụnụ n’ihu ụlọnzukọ ndị ọchịchị na ndịisi, ụnụ echegbula onwe ụnụ otu ụnụ ga-esi, mọbụ ihe ụnụ ga-aza, mọbụ ihe ụnụ ga-ekwu; n’ihina Mmụọ Nsọ ga-akụziri ụnụ n’oge ahụ ihe ụnụ kwesịrị ikwu.”

IHE ỌGỤGỤ ỤNYAHỤ: Igbo Mass Readings October 16 2020, Fraịdee Izu Iri Abụọ na Asatọ n’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ ECHI:  Igbo Mass Readings October 18, 2020, Ụka Iri Abụọ na Itoolu n’oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings October 17 2020, Satọdee Izu Iri Abụọ na Asatọ n’Oge Adanyeghị n’Emume.

Sonyere anyị na Facebook na Igbo Mass Readings 

error: Alert: Content is protected !!