Igbo Mass Readings October 24 2020 Satọdee Izu Iri Abụọ na Itoolu

Igbo Mass Readings October 24 2020, Satọdee Izu Iri Abụọ na Itoolu n’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings October 24 2020, Satọdee Izu Iri Abụọ na Itoolu n'Oge Adanyeghị n'Emume.
Igbo Mass Readings October 24 2020, Satọdee Izu Iri Abụọ na Itoolu n’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ    4:7-16

Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Pọl degaara ndị Efesọs.

Ma e nyere onye ọbụla amara dịka oke onyinye nkr Kristi si dị. E kwuru n’akwụkwọ nsọ sị, “Mgbe ọ rịgoro n’elu, O duuru igwe ndị e ji eji; ma nyekwa ụnụ mmadụ onyinye.”

N’ikwu, “Ọ rigoro” gịnị ka ọ pụtara ma ọ bụghị na o buuru ụzọ zida n’ime ala mmụọ? Onye ahụ nke zidaranụ bụkwa onye ahụ nke rigoronụ n’ebe kacha elu, ka o wee mejuo ihe niile.

Onyinye ya bụ na ụfọdụ ga-abụ ụmụazụ, ụfọdụ ndịamụma, ụfọdụ ndị nkwusa oziọma, ụfọdụ ndị ụkọchukwu na ndị nkuzi.

Nke a bụ maka ịkwụdobe ndị nsọ maka ọrụ nke ije ozi, iji rụlite ahụ nke Kristi, ruo mgbe anyị niile ga-eru ịdịnootu nke okwukwe na ịmazu onye Nwa Chineke bụ, wee topụta mmadụ zuru oke n’ime Kristi.

Ka anyị ghara ịbụzi ụmụaka, ndị ifufe nkuzi asị nke ndị aghụghọ na-efegharị ihu na azụ na-ebugharịkwa.

Kama site n’ikwu eziokwu n’ịhụnaanya, anyị ga-eto n’ụzọ ọbụla n’ime Kristi onye bụ isi. Onye jikọrọ ahụ niile wee mee ka ha bụrụ otu.

Mgbe akụkụ ahụ ọbụla na-arụ ọrụ ya nke ọma, ọ na-eme ka ahụ na-eto, na-arụlitekwa onwe ya n’ịhụnaanya.

ABỤỌMA NA AZỊZA: Ps. 122:1-2, 3-4, 4-5.

Azịza: Añụrị juru m obi mgbe m nụrụ ha kwuru sị, ka anyị gaa n’ụlọ nke Chineke.

  1. Añụrị juru m obi mgbe m nụrụ ha kwuru sị,

ka anyị gaa n’ụlọ nke Chineke.

Ugbu a, anyị kwụzị

n’ọnụụzọ ama gị, O Jerusalem. Azịza.

2. A rụrụ Jerusalem dịka obodo

e jikọtara ọnụ nke ọma.

Ọ bụ na  ya ka agbụrụ niile na-aga

agbụrụ nke Izrel. Azịza.

3. Inye Onyenweanyị ekele

dịka o siri nye n’iwu.

Ebe ahụ ka e dobere oche ikpe eze,

Ocheeze nke ụlọ Devid. Azịza.

MBEKU        I Jemis 1:18

Alleluịa, Alleluịa:

Chineke Nna jiri okwu nke eziokwu ahụ mee ka anyị pụta iche. Meekwa ka anyị bụrụ ụdị mkpụrụ mbụ nke ihe o kere eke.

Alleluịa.

Oziọma maka October 24, 2020 – Luk 13:1-9

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

O nwere ụfọdụ nọ ebe ahụ n’oge ahụ ndị kọọrọ Jesu maka ndị Galili ahụ Paịlet gburu, were ọbara ha gwọkọta n’ihe aja ha.

Jesu wee jụọ ha sị, “Ụnụ cheere na ndị Galili ndị a nwụrụ n’ụzọ dị otu a bụ ndị mmehie karịa ndị Galili ndị ọzọ?

Agwa m ụnụ, mba; ma ọ bụrụ na ụnụ echegharịghị ụnụ niile ga-anwụ otu ha siri nwụọ.

Mọbụ, kedụ maka mmadụ iri na asatọ ahụ ndị ụlọnche elu dakwasịrị, tigbuo ha na Saịlọm, ụnụ na-eche na ha bụ ndịọjọọ karịa ndị niile bị n’obodo Jerusalem.

Agwa m ụnụ, mba, belụsọ ma ụnụ chegharịrị ụnụ niile ga-anwụ otu ha siri nwụọ.” Jesu ji ụkabụilu gwa ha sị, “Otu nwoke nwere osisi fiig nke ọ kụrụ n’ubi ya.

Ọ bịara chọọ mkpụrụ n’elu ya ma ọ hụghị. O wee sị onye na-elekọta ubi ya, “Lee, kamgbe afọ atọ ka m na-abịa na-achọ mkpụrụ n’osisi fiig a ma ahụghị m.

Ya mere, gbudaa ya; gịnị mere ọ ga-eji na erikọ nri dị n’ala ubi? Ma ọ zara ya sị, ‘Nna m ukwu, hapụkwa ya n’afọ a, ka m gwuo ala gburugburu ukwu ya, wụnye ya agbụgbọ.

Ọ bụrụ na ọ mịa mkpụrụ n’afọ ọzọ, ọ dị mma; ma ọ bụrụ na ọ mịghị, Ị nweziri ike gbudaa ya.”

IHE ỌGỤGỤ ỤNYAHỤ: Igbo Mass Readings October 23 2020, Fraịdee Izu Iri Abụọ na Itoolu n’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ ECHI:  Igbo Mass Readings October 25 2020, Ụka Iri Atọ n’oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings October 24 2020, Satọdee Izu Iri Abụọ na Itoolu n’Oge Adanyeghị n’Emume.

Sonyere anyị na Facebook na Igbo Mass Readings 

error: Alert: Content is protected !!