Igbo Mass Readings October 31 2020 Satọdee Izu Iri Atọ n’Oge Nkiti

Igbo Mass Readings October 31 2020, Satọdee Izu Iri Atọ n’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings October 31 2020, Satọdee Izu Iri Atọ n'Oge Adanyeghị n'Emume.
Igbo Mass Readings October 31 2020, Satọdee Izu Iri Atọ n’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ              4:7-16

Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Pọl degaara ndị Filipi.

Gịnị bụzi nke a? Naanị ihe na-enye obi añụrị bụ na a na-ekwusa Kristi n’ụzọ ọbụla, n’ụzọ aghụghọ, mọbụ n’ụzọ eziokwu.

Ee, aga m enwe añụrị. Ama m na site n’ekpere ụnụ na site n’enyemaka Mmụọ nke Jesu Kristi, aga m apụta na mkpọrọ nwere onwe m.

Enwere m ntụkwasịobi na olileanya siri ike na ihere agaghị eme m n’ụzọ ọbụla. Site n’agbamume zuru oke, ugbu a na mgbe niile a ga-asọpụrụ Kristi n’ahụ m, na ndụ mọbụ n’ọnwụ. N’ebe m nọ, ịdị ndụ bụ Kristi, ịnwụ anwụ bụkwa uru.  

N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na ọ bụ ịdị ndụ n’anụahụ nke a bụụrụ m ịrụpụta ọrụ bara uru, enweghị m ike ikwu nke m ga-ahọrọ. Anọ m n’oke nsogbu n’etiti ha abụọ.

Ọ na-agụ m agụụ ịhapụ ụwa nke a gakwuru Jesu, n’ihina ọ kaara m mma ime otu a. Ma n’ihi ụnụ, ọ dịkarịrị mkpa ka m dịkwuo ndụ n’anụahụ.

Nke a were m anya, na aga m anọkwu ka m wee nọnyere ụnụ maka ịga n’ihu na ọñụ ụnụ n’okwukwe, ya bụ n’ime m, ụnụ ga-enwe nnukwu ihe iji nwee otito n’ime Jesu Kristi n’ihi mbịaghachi m ọzọ n’ebe ụnụ nọ.

ABỤỌMA NA AZỊZA:       Ps. 42:1, 2, 4..

Azịza: Akpịrị na-akpọ m nkụ maka Chineke, Chukwu nke ndị dị ndụ.

  1. Dịka otu agụụ mmiri si na-agụ nne ele,

Otu ahụ ka agụụ si na-agụ m maka gị O Chineke m. Azịza.

2. Akpịrị na-akpọ m nkụ maka Chineke, Chukwu nke ndị dị ndụ,

Kedụ oge m ga-enwe ike jee hụ ihu nke Chineke? Azịza.

3. Echetara m ihe ndị a niile obi m  wee jụọ m oyi,

Otu m na-esi eduru igwe mmadụ a,

ọñụ juru obi abanye n’ụlọ Chineke,

were añụrị na-ekwe ukwe inye ekele. Azịza.

MBEKU        Matt 11:25

Alleluịa, Alleluịa:

Ana m ekele gị Nna Dinwenụ nke eluigwe na ụwa, n’ihina ị kpugheere ụmụntakịrị ihe omimi nke alaeze.

Alleluịa.

Oziọma maka October 31 2020 – Luk 14:1, 7-11

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

N’otu ụbọchị Sabat, ka Jesu gara oriri n’ụlọ otu onye ọchịchị onye so n’otu ndị Farisii, ndị mmadụ nọ na-ele ya anya.

Mgbe Jesu hụrụ otu ndị a kpọrọ oriri si ahọrọ isi oche, Ọ gwara ha sị, “Mgbe ọbụla onye ọbụla kpọrọ gị oku oriri agbamakwụkwọ, ejila aka gị gaa nọdụ n’isi oche, eleghị anya onye kpọrọ gị oriri kpọkwara onye ọzọ ka gị nwee nsọpụrụ.

Mgbe ahụ onye ahụ ụnụ oriri ga-abịa sị gị, “Biliere nwoke a n’oche’. Oga ahụ, ị ga-eji ihere gaa nọdụ n’oche dịkarịsị ala. Mgbe a kpọrọ gị oriri, gaa nọdụ n’oche dịkarịsị ala, ka ọ ga-abụ mgbe onye kpọrọ gị oriri bịara, o nwere ike sị gị,

‘Enyi m, gbagoo n’isi oche.’ Mgbe ahụ, ị ga-enwe nsọpụrụ n’ihu ndị niile a kpọrọ gị na ha oriri. N’ihina onye ọbụla buliri onwe ya elu, a ga-ebuda ya ala; ma onye ọbụla budara onwe ya, a ga-ebuli ya.

IHE ỌGỤGỤ ỤNYAHỤ: Igbo Mass Readings October 30 2020, Fraịdee Izu Iri Atọ n’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ ECHI:   Igbo Mass Readings November 1 2020 Emume Ndị Nsọ Niile.

Igbo Mass Readings October 31 2020, Satọdee Izu Iri Atọ n’Oge Adanyeghị n’Emume.

Sonyere anyị na Facebook na Igbo Mass Readings 

error: Alert: Content is protected !!