Igbo Mass Readings November 14 2020, Satọdee Izu Iri Atọ na Abụọ Oge

Igbo Mass Readings November 14 2020, Satọdee Izu Iri Atọ na Abụọ n’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings November 14 2020, Satọdee Izu Iri Atọ na Abụọ n'Oge Adanyeghị n'Emume.
Igbo Mass Readings November 14 2020, Satọdee Izu Iri Atọ na Abụọ n’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ           5-8

Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Jọn nke Atọ

Onye m hụrụ n’anya, ọ bụ ihe kwesịrị ntụkwasịobi ka ị na-eme, mgbe ị na-agbara ụmụnna anyị odibo, ọkachakwa ndị ọbịa; ndị gbara akaebe maka ịhụnanya gị n’ihu nzukọ.

Ọ ga-adị mma ka I dupụ ha, otu o kwesịrị ije ozi nke Chineke. Ha apụọla nje m maka Chineke, n’anaghịkwa ndị na-amaghị Chineke ihe onyinye ọbụla.

Anyị kwesịrị ịkwado ndị dị otu a, ka anyị nwee ike iso bụrụ ndị ọrụ n’ime eziokwu.

ABỤỌMA NA AZỊZA:   Ps. 112:1-2, 5-6, 8, 9.

Azịza: Añụrị na-adịrị onye na-atụrụ Onyenweanyị egwu.

1. Añụrị na-adịrị onye na-atụrụ Onyenweanyị egwu.

Onye ji ọñụ na-edebe iwu ya!

Ụmụ onye dị otu a ga-abụ ndị nwere ike n’ụwa,

agbụrụ onye ezigbo omume ga-enweta ngọzi. Azịza.

2. Ezinụụlọ ya ga-enweta akụnụụba,

eziomume ya agaghị enwe mgbanwe.

N’ihina onye ezigbo omume

ga-achawapụta dịka ihe n’etiti ọchịchịịrị,

ọ dị ebere, ịhụnaanya na-akwụba aka ọtọ. Azịza.

3. Ya bụ ezigbo mmadụ anaghị ana ọmụrụnwa ma o binye ego,

ọ bụ onye eziokwu n’ihe niile ọ na-eme.

Ebe eziomume chedoro ya, ọ na-enwe ịkwụdosike,

ọ na-ahapụ ncheta ga-adị ebeebe n’azụ ya. Azịza.

MBEKU        Ps. 25: 4, 5.

Alleluịa, Alleluịa:

Kụziere m ụzọ gị, Onyenweanyị, dube m n’ụzọ eziokwu gị.

Alleluịa.

Oziọma maka November 14 2020 – Luk 18:1-8

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Jesu gwara ha ụkabụilu iji kuziere ha na ọ dị mkpa ka ha nọgide n’ekpere mgbe niile, ghara ịda mba.

Ọ gwara ha sị: “N’otu obodo, e nwere otu onye ọkaikpe nke na-anaghị atụrụ Chineke egwu, nke ọ na-asọpụrụ mmadụ ibe ya.  

E nwekwara otu nwaanyị isimkpe bikwa n’obodo ahụ, onye na-abịakwute ọkaikpe a kwa mgbe kwa mgbe, na-arịọ ya sị, ‘kpepụta m n’aka onye iro m.’

Na mbụ onye ọkaikpe a achọghị ịnụ arịrịọ nwaanyị a. Ma o mesịrị tụgharịa obi sị, ‘Ọ bụ eziokwu na adịghị m atụ egwu Chineke, adịghị m asọpụrụ mmadụ, ma n’ihi nsogbu nwaanyị isimkpe a na-enye m, aga m ekpepụta ya.

Ọ bụrụ na m emeghị otu a, ọ ga-abịagide na-esogbu m, agaghị m ezuru ya ike.’” Onyenweanyị kwukwara sị, “Nụrụnụ ihe onye ọkaikpe a, nke na-adịghị ekpe ikpe ziri ezi kwuru.

Ọ bụ na Chineke agaghị ekpepụta onye nke ya, onye na-akpọku ya ehihie na abalị? Ọ ga-egbu oge tupu ọ zọpụta ha?

Agwa m ụnụ, Ọ ga-ekpepụta ha ọsọọsọ. Ka o sila dị, mgbe nwa nke mmadụ ga-abịa Ọ ga-enwetekwa ndị nwere okwukwe n’elu ụwa?”

IHE ỌGỤGỤ ỤNYAHỤ: Igbo Mass Readings November 13 2020, Fraịdee Izu Iri Atọ na Abụọ n’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ ECHI:   Igbo Mass Readings November 15 2020, Ụka Iri Atọ na Atọ n’oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings November 14 2020, Satọdee Izu Iri Atọ na Abụọ n’Oge Adanyeghị n’Emume.

Sonyere anyị na Facebook na Igbo Mass Readings 

error: Alert: Content is protected !!