Igbo Mass Readings December 10 2020, Tọọzde Izu Abụọ Oge Adventi

Igbo Mass Readings December 10 2020, Tọọzde Izuụka nke Abụọ n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.

Igbo Mass Readings December 10 2020, Tọọzde Izuụka nke Abụọ n'Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.
Igbo Mass Readings December 10 2020, Tọọzde Izuụka nke Abụọ n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.

EKPERE MMEGHE

Chineke Nna ji ike niile, mee ka anyị jupụta n’aụrị nke ịhụnaanya Gị ka anyị nwee ike ịkwado ụzọ maka Kristi Dinwenụ anyị. Site na Dinwenụ anyị Jesu Kristi.

Ihe Ọgụgụ Nke Mb      41:13-20

Ihe Ọgụgụ ewetara n’akwụkwọ Onye Amụma Aịzaya

Mụ onwe m bụ Osebụrụwa Chineke gị sekpụ gị n’aka nri, na-asị gị, “Ụjọ atụla gị.

Aga m enyere gị aka. Atụla egwu, gị bụ Jekọb dị nta dịka ahụhụ. Ụnụ atụla egwu ụmụ Izrel. Lee, aga m enyere ụnụ aka, ọ bụ Yahweh na-ekwu, onye nzọpụta ụnụ bụ onye Nsọ nke Izrel.

Lee, aga m eme ka ụnụ bụrụ igwe na-akwọ ọka dị ọhụrụ, nke eze ya dị nkọ. Ụnụ ga-egwutu ugwu niile, mekwaa ka ugwu nta niile ghọọ uzuzu aja.

Ụnụ ga-ayọcha ha; ikuku ga-ebufu ha; oke ikuku ga-ekposacha ha. Mana ụnụ ga-enweta oke ọñụ n’ime Chineke, n’ime onye Nsọ nke Izrel ka ụnụ ga-enweta otito.

Mgbe ndị ogbenye na ndị nọ na mkpagbu chọrọ mmiri ma ọdịghị nke dị, mgbe akpịrị na-akpọ ha nkụ, mụ bụ Yahweh ga-aza ha.

Mụ bụ Chineke nke Izrel agaghị agbahapụ ha.Aga m eme ka mmiri si n’ala ugwu kpọrọ nkụ na-erudata.

Aga m eme ka isiiyi na-asọpụta n’etiti ndagwurugwu niile. Aga m eme ka mmiri jupụta n’ịkpa, mekwaa ka isi mmiri site n’ala kpọrọ nkụ na-asọpụta.

Aga m akụ osisi sida, ụgba, achị na oliv n’ọzara. Aga m akụkọta osisi nkwụ, junipe na pine ọnụ n’ọzara.

Nke a ka mmadụ niile ga-ahụ, wee matakwa, ha ga-aghọta, tulekwa na ọ bụ Chineke rụrụ ha, na ọ bụ aka ọrụ onye nsọ nke Izrel.

ABỤỌMA NA AZỊZA: Ps: 145:1. 9. 10-11. 12-13.

Azịza: Onyenweanyị bụ Onye amara na onye obi ebere, ọ naghị ewe iwe ọsọọsọ, o jupụtara na ịhụnaanya.

1.Aga m enye gị otito, Chineke bụ eze m,

aga m eto aha gị ruo mgbe ebighị ebi.

Onyenweanyị na-egosị mmadụ niile obiọma ya

ebere nke Onyenweanyị na-erute ihe niile o kere. Azịza.

2. Onyenweanyị, ihe niile I kere ga-ekele gị,

ndị kwere na gị ga-agọzi gị.

Ha ga-ekwupụta ebube nke alaeze gị

ma kwupụtakwa ịdị ike gị. Azịza.

3. Ka mmadụ niile mata ọrụ ịtụnaanya gị niile,

na ebube dị elu nke alaeze gị.

Alaeze gị ga-adị ebeebe,

ọchịchị gị ga-adị na ndụdụgandụ niile. Azịza.

MBEKU

ALLELUỊA ALLELUỊA:

Ka eluigwe zodata mmiri dịka igirigi, ka urukpu zoo eziomume dịka mmiri, ka ala meghee, ka nzọpụta topụta.

ALLELUỊA.

Oziọma maka December 10 2020 – Matiu 11: 11-15

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere.

Jesu gwara igwe mmadụ sị: “N’ezie agwa m ụnụ, n’etiti ndị niile nwaanyị mụrụ, O nweghị onye ọbụla dị ukwuu karịa Jọn onye na-eme mmirichukwu; ma onye ahụ nke dịkarịchara nta n’alaeze eluigwe ka ya ukwu.

Site n’oge Jọn onye na-eme mmirichukwu ruo ugbu a, ndị mmadụ ji anyaike na izọ ụzọ abanye n’alaeze eluigwe.

Ndị na-emesi ihe ike na-abanye na ya. Tupu Jọn abịa, iwu Mosis na ndịamụma niile buru amụma banyere alaeze ahụ; ọ bụrụ na ụnụ dị nkwadebe ịnabata ya, ọ bụ ya bụ Elaịja ahụ nke ga-abịanụ.  Onye nwere nti ya nụrụ.

EKPERE NHUNYE

Nna, site n’ihe niile I nyere anyị, anyị na- ehunyere Gị achịcha na mmanya nke a. Ebe anyị na-efe Gị ugbu a, nara Onyinye anyị ma were nkwa ndụ ebighị ebi I kwere anyị gbaa anyị ume. Mezuoro anyị ihe ndị a site na Kristi Dinwenụ anyị. Amen.

EKPERE ANATACHAA ORIRI NSỌ

Nna, mee ka orikọ anyị nke a kwalite n’ime anyị ịhụ ihe nke eluigwe n’anya. Meekwa ka nkwa na nchekwube dị n’ime ya na-eduzi ụzọ anyị n’elu ụwa a. Anyị na-arịọ ihe ndị a site na Kristi Dinwenụ anyị. Amen.

IHE ỌGỤGỤ ỤNYAHỤ: Igbo Mass Readings December 9 2020, Wednezde Izuụka nke Abụọ n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.

IHE ỌGỤGỤ ECHI:   Igbo Mass Readings December 11 2020, Fraịde Izuụka nke Abụọ n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.

Igbo Mass Readings December 10 2020, Tọọzde Izuụka nke Abụọ n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.

Sonyere anyị na Facebook na Igbo Mass Readings 

error: Alert: Content is protected !!