Igbo Mass Readings December 3 2020, Ncheta Francis Xavier dị asọ

Igbo Mass Readings December 3 2020, Ncheta Francis Xavier dị asọ – Tọọzde Izuụka nke Mbu n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.

Igbo Mass Readings December 3 2020,  Ncheta Francis Xavier dị asọ - Tọọzde Izuụka nke Mbu n'Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.
Igbo Mass Readings December 3 2020, Ncheta Francis Xavier dị asọ – Tọọzde Izuụka nke Mbu n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.

EKPERE MMEGHE

Nna, anyị chọrọ enyemaka Gị. Zọpụta anyị na njọ ma dubata anyị na ndụ. Werekwa ike Gị nyere anyị aka. Site na Dinwenụ anyị Jesu Kristi….

Ihe Ogugu Nke Mb       26:1-6

Ihe Ọgụgụ ewetara n’akwụkwọ Onye Amụma Aịzaya

N’ụbọchị ahụ, a ga-ekwe ukwe nke a na Juda: “Anyị nwere obodo e wusiri ike; Ọ na-akwụwa nzọpụta na ya dịka mgbidi siri ike.

Meghee ọnụ ụzọama, ka mba eziomume, mba nwere okwukwe bata. Ị na-eme ka o nwee udo zuru oke bụ onye ahụ nke obi ya dị n’ebe Ị nọ, n’ihi na ọ tụkwasịrịọ obi na gị.

Tụkwasanụ obi na Yahweh mgbe niile, n’ihina Yahweh Chineke bụ nkume mgbe ebighị ebi. N’ihina o butuola ndị bi n’ebe dị elu, n’obodo dị elu.

O wedaala ya, tọgbọ ya n’ala, tụrụọ ya n’aja. Ụkwụ ga-azọpịa ya, ụkwụ ndị ogbenye na nzọ ụkwụ ndị a na-emegbu emegbu.”

ABỤỌMA NA AZỊZA: Ps. 118:1. 8-9. 19-21. 25-27.

Azịza: Ngọzi dịrị onye ahụ na-abịa na aha Onyenweanyị

1. Nye Onyenweanyị ekele n’ihi na ọdị mma,

ebere ya enweghị njedebe.

Ọ ga-akara m mma, ịgbaba n’Onyenweanyị,

karịa ịtụkwasịobi m na ndị mmadụ

Ọ ga akara m mma ịgbaba na Chineke,

karịa ịtụkwasịobi n’ụmụ ndị eze. Azza.

2. Megheere m ụzọ nke eziomume

ka m bata bịa nye Onyenweanyị ekele.

Nke a bụ ọnụụzọ nke Onyenweanyị,

ebe ndị eziomume ga-esi bata

Ana m ekele gị n’ihi na Ị nụla olu m

Ị bụkwa onye nzọpụta m. Azza.

3. Biko Onyenweanyị, biko zọpụta anyị,

biko Onyenweanyị, biko nye anyị ọganihu

Ngozi dịrị onye ahụ na-abịa n’aha Onyenweanyị,

anyi na-eto gị site n’ụlọ Onyenweanyị

Osebụrụwa bụ Chineke, o ji ihu ọchi ele anyị, Azza.

MBEKU

ALLELUIA ALLELUIA:

Chọọ Chineke mgbe ọ ga ekwe nchọta, kpọkuo ya oge ọ nọ nso.

ALLELUIA.

Oziọma maka December 3 2020  – Matiu 7.2 1.24-27

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere.

Jesu gwara ndi na-eso ụzọ ya sị: “Ọ bụghị onye ọbụla nke na-akpọ m ‘Dinwenụ, Dinwenụ ga-aba n’alaeze eluigwe, kama ọ bụ onye na eme uche nke Nna m bi n’igwe.”

Onye ọbụla nke na anụ okwu m ndị a, na emekwa ha, dịka nwoke maara ihe, nke ruru ụlọ ya n’elu okwute; mmiri wee zoo, ide mmiri tojuo, ifufe bukwara ya ma ọ daghị, n’ihi na a tọrọ ntọala ya n’elu okwute;

Onye ọbụla nke na-anụ okwu ndị a, ma ọ naghi eme ha, dịka Onye nzuzu nke rụrụ ụlọ ya n’elu aja, mmiri zoro, ide mmiri tojuo, ifufe bukwara ya, o wee daa. Ọdịda nke ụlọ ahụ buru ibu nke ukwuu”

EKPERE NHUNYE

Nna, site n’ihe niile I nyere anyị, anyị na-ehunyere Gị achịcha na mmanya nke a. Ebe anyị na-efe Gị ugbua, nara Onyinye anyị ma were nkwa ndụ ebighị ebi Ị kwere anyị na nkwa gbaa anyị ume. Mezuoro anyị ihe ndị a site na Kristi Dinwenụ anyị. Amen.

EKPERE ANATACHAA ORIRI NSỌ

Nna, mee ka orikọ anyị nke a kwalite n’ime anyị ịhụ ihe nke eluigwe n’anya. Meekwa ka nkwa na nchekwube dị n’ime ya na-eduzi ụzọ anyị n’elu uwa a. Anyị na-arịo ihe ndị a site na Krist Dinwenụ anyị. Amen

IHE ỌGỤGỤ ỤNYAHỤ: Igbo Catholic Readings December 2 2020, Wednezde Izuụka nke Mbu n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.

IHE ỌGỤGỤ ECHI: Igbo Mass Readings December 4 2020, Fraịde Izuụka nke Mbu n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.

Igbo Mass Readings December 3 2020, Ncheta Francis Xavier dị asọ – Tọọzde Izuụka nke Mbu n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.

Sonyere anyị na Facebook na Igbo Mass Readings 

error: Alert: Content is protected !!