Igbo Mass Readings October 8 2020 Tọzde Izu Iri Abụọ na Asaa Oge Nkiti

Igbo Mass Readings October 8 2020, Tọọzdee Nke Izu Iri Abụọ na Asaa Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings October 8 2020, Tọọzdee Nke  Izu Iri Abụọ na Asaa Oge Adanyeghị n'Emume.
Igbo Mass Readings October 8 2020, Tọọzdee Nke Izu Iri Abụọ na Asaa Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ              3:1-5

Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Pọl dị Asọ degaara Galatịa

Ewo! ụnụ ndị Galeshịa enweghị uche! Onye megharịrị ụnụ anya, ụnụ bụ ndị e mere ka ọnwụ Jesu Kristi n’elu obe bụrụ ihe were ụnụ anya?

Ka m jụọ ụnụ otu ihe: Ụnụ natara Mmụọ Nsọ site n’ịrụ ọrụ iwu chọọrọ ka ọ bụ site na nkuzi nke okwukwe? 

Ụnụ dị oke nzuzu? Ụnụ malitere site n’ike nke Mmụọ Nsọ, ma ugbu a ụnụ na-akwusịzi n’ike nke anụahụ? Ụnụ tara ọtụtụ ahụhụ dị otu a n’efu? 

Ọ bụrụ n’ezie na ọ bụ n’efu, ka m jụkwaa ụnụ ajụjụ ọzọ. Mmụọ Nsọ ahụ Chineke nyere ụnụ, na ọrụ ebube ọ rụrụ n’etiti ụnụ, o mere ha n’ihi iwu ụnụ dobere ka ọ bụ n’ihina ụnụ nụrụ ma kwerekwa n’oziọma?

ABỤỌMA NA AZỊZA: Lk 1:69-70, 71-72, 73-75.

Azịza: Ngọzi dịrị Dinwenụ Chineke nke Izrel maka na ọ bịara leta ndị nke ya.

  1. O welitere anyị Onyenzọpụta

site n’agbụrụ Devid nwodibo ya;

Otu o siri kwuo n’oge ochie

site n’ọnụ ndị amụma ya. Azịza.

2. Na a ga-azọpụta anyị site n’aka ndị iro anyị

na sitekwa n’aka ndị niile kpọrọ anyị asị,

Gosi ebere nke o kwere nnanna anyị ha na nkwa

bịa chetakwa ọgbụgbandụ ya dị nsọ. Azịza

3. Ọ ñụụrụ nnanna anyị bụ Abraham iyi,

Kwekwa nkwa na ya ga-azọpụta anyị n’aka ndị iro anyị

ka anyị nwee ike na-ekpere ya n’atụghị egwu ọbụla

N’ịdị nsọ na eziomume n’ihu ya

ụbọchị niile nke ndụ anyị. Azịza.

Mbeku      Ps. 19:9

Alleluịa, Alleluịa:

Okwu gị Onyenweanyị na-enye obi añụrị. Nkụzi gị bụ ihe e ji ahụ ụzọ

Alleluịa.

Oziọma maka October 8, 2020 – Luk 11:5-13

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Onye n’ime ụnụ nwere enyi ga-agakwuru ya n’etiti abalị sị ya, ‘Enyi m, binye m ogbe achịcha atọ; n’ihina otu enyi m si n’ije pụta n’ụlọ m.

Enweghịkwa m ihe oriri ọbụla m ga-enye ya.’ Ma ọ ga-esi n’ime ụlọ zaghachi sị, ‘Esogbula m, anyị emechiela ụzọ ugbu a, mụ na ụmụaka m alabaala ụra, agaghị m enwe ike ikuli nye gị ihe ọbụla?’

Agwa m ụnụ, ọ bụ ezie na ọ gaghị ekuli nye ya ihe ọbụla n’ihina ọ bụ enyi ya, ma n’ihi nsogbu ya ọ ga-ekuli nye ya ihe ọbụla dị ya mkpa.

Ya mere agwa m ụnụ, rịọnụ, a ga-enye ụnụ, chọọnụ, ụnụ ga-achọta, kụọnụ aka, a ga-emeghere ụnụ.

N’ihina onye ọbụla na-arịọnụ na-arịọta, onye ọbụla na-achọnụ na-achọta, onye ọbụla na-akụ aka ka a ga-emeghere.

Kedụ nna n’etiti ụnụ nwa ya ga-arịọ azụ, o nye ya agwọ; mọbụ ọ rịọ ya akwa, o nye ya akpị?

Ọ bụrụ na ụnụ bụ ndị ọjọọ maara otu e si enye ụmụ ụnụ onyinye dị mma, nna ụnụ nke bi n’igwe aghaghị inye ha Mmụọ Nsọ bụ ndị niile na-arịọ ya!”

IHE ỌGỤGỤ ỤNYAHỤ: Igbo Mass Readings October 7 2020, Nne Anyị Dị Asọ, Ezenwanyị Nke Rosarị.

IHE ỌGỤGỤ ECHI:  Igbo Mass Readings October 9 2020, Fraịde Izu Iri Abụọ na Asaa n’Oge Adanyeghị n’Emume

Igbo Mass Readings October 8 2020, Tọọzdee Nke Izu Iri Abụọ na Asaa Oge Adanyeghị n’Emume.

Sonyere anyị na Facebook na Igbo Mass Readings

error: Alert: Content is protected !!