Igbo Mass Readings October 15 2020 Tọọzde Izu Iri Abụọ na Asatọ n’Oge

Igbo Mass Readings October 15 2020, Tọọzde Izu Iri Abụọ na Asatọ n’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings October 15 2020, Tọọzde Izu Iri Abụọ na Asatọ n'Oge Adanyeghị n'Emume.
Igbo Mass Readings October 15 2020, Tọọzde Izu Iri Abụọ na Asatọ n’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ   1:3-10

Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Pọl dị Asọ degaara Efesọs.

Ngọzi dịrị Chineke na Nna nke Dinwenụ anyị Jesu Kristi, onye sitere n’eluigwe were ngọzi niile nke mmụọ gọzie anyị n’ime Kristi.

Ọ họọrọ anyị n’ime Kristi tupu a tọọ ntọala ụwa, ka anyị dịrị ya nsọ n’enweghị ntụpọ ọbụla n’ihu ya.

O jiri ịhụnaanya nye anyị ọnọdụ, ka anyị bụrụ ụmụ ya site na Jesu Kristi dịka ọchịchọ nke uche ya siri dị.

Ọ bụ maka mbuli elu nke ngọzi ya dị otito, nke o nyere anyị n’efu n’ime Nwa ya ọ hụrụ n’anya.

N’ime ya ka anyị siri nweta nzọpụta site n’ọbara ya, ya na mgbaghara nke njọ anyị dịka otu ngọzi ya si baa ụba, nke o nyebigara anyị oke.

O jirila oke amamiihe na nghọta niile mee ka anta niile mee ka anyị mara ihe omimi nke dị n’obi ya,

dịka nzube ya si dị, nke ọ kwadobere n’ime Kristi, dịka atụmaatụ nke ga-emejupụta mgbe oge ruru, ịchịkọta ihe niile ndị dị n’eluigwe na ndị dị n’ụwa n’okpuru ya.

ABỤỌMA NA AZỊZA:  Ps. 98:1, 2-3, 3-4, 5-6.

Azịza: Onyenweanyị egosila ike nzọpụta ya.

  1. Kweerenụ Onyenweanyị ukwe ọhụrụ,

n’ihina ọ rụrụ ọrụ ebube,

aka nri ya na aka ya dị asọ

eweterela ya mmeri. Azịza.

2. Onyenweanyị egosila ike nzọpụta ya,

o meela ka mba niile mata eziomume ya,

Ọ chetala ịhụnaanya ya na ịkwụdosiike ya

n’ebe ezinụụlọ Izrel nọ. Azịza.

3. Akụkụ ụwa niile ahụla

nzọpụta nke Chineke anyị,

Ụwa niile tijerenụ Onyenweanyị mkpu ọñụ

Werenụ ukwe na mkpu ọñụ too ya. Azịza.

4. Kweerenụ Onyenweanyị ukwe,

Werenụ ụbọ akwara na ihe egwu dị icheiche

tiere Onyenweanyị egwu!

Werenụ opi igwe na mpi

Kwupụta na Onyenweanyị bụ eze. Azịza.

Mbeku      Ps. 19:9

Alleluịa, Alleluịa:

Okwu Chineke dị ndụ, dị ike Ọ bụkwa ihe nwere ike inyocha echiche na izu niile nke obi.

Alleluịa.

Oziọma maka October 15, 2020 – Luk 11:47-54

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Jesu kwuru sị, “Ahụhụ ga-adịrị ụnụ! N’ihina ụnụ na-arụ ili ndị amụma, ndị nna ụnụ ha gburu.

Ya bụ, ụnụ bụ ndị akaebe ma kwenyekwa n’ihe ndị nna ụnụ ha mere, n’ihina ha gburu ha, ụnụ arụọ ili ha.

Ọ bụ maka nke a ka Amamiihe nke Chineke ji kwuo sị, ‘Aga m ezigara ha ndị amụma, na ndịozi, ụfọdụ n’ime ha ka ha ga-egbu, takwa ha ahụhụ.’

Ya mere n’aka ọgbọ a ka Chineke ga-ajụ ese maka ọbara ndị amụma niile a gbafuru site na mbido nke ụwa, site n’ọbara Ebel ruo na nke Zekarịa, onye e gburu n’agbata ebe nchụaja n’ụlọnsọ.

Ee, agwa m ụnụ, a ga-ajụ ese ha n’aka ọgbọ a. Ahụhụ ga-adịrị ụnụ ndị ọkaiwu! N’ihina ụnụ ewepụla igodo e ji agbaghe ọnụụzọ amamiihe, ụnụ abanyeghị n’onwe ụnụ, ụnụ gbochikwara ndị na-agba mbọ ibanye.”

Mgbe Jesu si ebe ahụ pụọ, ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii bidoro isogbu ya na ịkpasu ya ikwu ọtụtụ okwu, na-esiri ya ọnya, ka ha mara na ga-ekwuhie ọnụ ka ha hụ ihe ha Ọ ga-eji jide ya.

IHE ỌGỤGỤ ỤNYAHỤ: Igbo Mass Readings October 14 2020, Wednezdee Izu Iri Abụọ na Asatọ n’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ ECHI:     Igbo Mass Readings October 16 2020, Fraịdee Izu Iri Abụọ na Asatọ n’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings October 15 2020, Tọọzde Izu Iri Abụọ na Asatọ n’Oge Adanyeghị n’Emume.

Sonyere anyị na Facebook na Igbo Mass Readings

error: Alert: Content is protected !!