Igbo Mass Readings November 12 2020, Ncheta Josaphat Dị Asọ

Igbo Mass Readings November 12 2020, Ncheta Josaphat Dị Asọ.

Igbo Mass Readings November 12 2020, Ncheta Josaphat Dị Asọ.
Igbo Mass Readings November 12 2020, Ncheta Josaphat Dị Asọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ             7-20

Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Pọl dị Asọ degaara Filemọn.

Ụdị ịhụnaanya i nwere, nwanne m Filemọn, enyela m nnukwu obi ụtọ na ịgba ume. N’ihina Chineke emeela ka ndịnsọ nwee ume ọhụrụ site n’inye aka gị.

Ọ bụ ezie na dịka nwanne gị n’ime Kristi, anọ m n’ọnọdụ ịnye gị iwu banyere ihe kwesịrị ka i mee, ma agaghị m eme otu a.

Kama n’ihi ịhụnaanya, ọ ka mma ịrịọ gị arịrịọ. Ọ bụ ezie na mụ onwe bụ Pọl ahụ, onye nnọchite anya Kristi, na onye mkpọrọ ugbu a n’ihi Jesu Kristi.

Biko, ana m arịọ gị arịrịọ banyere nwa m bụ Onesịmus, onye m bụzi nna ya n’ime Kristi ugbu a m nọ n’ụlọmkpọrọ.

Ị ga-echeta n’oge gara aga, ọ dịghị uru Onesịmus baara gị, ma ugbu a, ọ baara mụ na gị uru. Ana m ezighachiri gị ya ugbu a, ya bụ, ọ bụ onwe m ka m na-ezitakwara gị.

Ọ gaara atọ m ụtọ ka mụ na ya nọdụ, oge a niile m nọ na mkpọrọ n’ihi oziọma ahụ, ka o jeere m ozi n’ọnọdụ gị.

Ma achọghị m ime ihe ọbụla n’enwetaghị nkwenye gị, ka ọ ghara ịdị ka i mere obiọma gị na mmanye. Kama achọrọ m ka i mee ihe si n’obi na uche gị pụta.

Eleghịanya, ihe e ji kewapụta Onesịmus n’ebe ị nọ nwa oge, bụ ka ị nwere ya oge niile.  Ọ bụghịkwa ohu ọzọ kama ọ karịrị ohu, maka na ọ bụzi nwanna nke a hụrụ n’anya n’ime Kristi, ọ kacha n’ebe mụ onwe m nọ.

Ọ ga-abụkwara gị nwanna karịchaa ma n’anụahụ nakwa n’ime Onyenweanyị. Ọ bụrụ ezie na i weere m dịka onye otu gị, nabata ya dịka i ga-esi nabata m.

Ọ bụrụ na o mejọrọ gị n’ụzọ ọbụla na mbụ, ọ bụrụkwa na o ji gị ụgwọ ọbụla, gụọ ya n’ụgwọ m ji gị.

Mụ bụ Pọl ji aka m dee nke a: Aga m akwụghachi gị. Otu ọ dị, a gaghị echetara gị echeta na i ji m ụgwọ buru ibu:

Ụgwọ i ji m bụ iwere onwe gị nye m! Nwanne m. meere m ihe a m na-arịọ gị n’ihi Onyenweanyị. Meekwa  ka obi m dị ọhụrụ n’ime Kristi.

ABỤỌMA NA AZỊZA:     Ps. 146:7, 8-9, 9-10.

Azịza: Añụrị bụ nke onye nwere Chineke nke Jekọb dịka onye enyemaka ya.

1.Onyenweanyị kwesịrị ntụkwasịobi ebeebe

Ọ na-enye ndị a na-emegbu emegbu ikpe nkwụmọtọ

Ọ na-enye ndị agụụ na-agụ nri,

Ọ na-emekwa ka ndị e ji eji nwere onwe ha. Azịza.

2. Onyenweanyị na-eme ka ndịisi hụ ụzọ.

Ọ na-ebulite ndị ibu arọ nyịdara  n’ala

Onyenweanyị hụrụ ndị eziomume n’anya.

Onyenweanyị na-echekwaba ndị ọbịa. Azịza.

3. Ọ na-echekwaba ndị na-enweghị nne na nna na ndị ajadu.

Onyenweanyị na-eme ka ihe siere ndị obi ọjọọ ike,

Onyenweanyị ga-achị eze ebeebe

Chineke gị, O Zayọn ga-achị site na ndụgandụ. Alleluịa. Azịza.

Mbeku       Ps. 145:13.

Alleluịa, Alleluịa:

Onyenweanyị dị ntụkwasịobi n’okwu ya niile, omume ya niile jupụtara n’obi ebere.

Alleluịa.

Oziọma maka November 12 2020 – Luk 17:20-25.

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Mgbe ndị Farisii jụrụ Jesu oge alaeze Chineke ga-abịa, Ọ zara ha sị: “Alaeze nke Chineke agaghị eji akara a ga-eji achọpụta ya abịa.

Ha agaghịkwa asị: ‘Lee ya ebe a! mọbụ Lee ya ebe ahụ!’  N’ihina ịgwa ụnụ eziokwu alaeze nke Chineke nọ n’etiti ụnụ.”

Jesu gwakwara ndị na-eso ụzọ ya sị, ‘Oga na-abịa mgbe ụnụ ga-achọ ịhụ otu n’ime ụbọchị nke nwa nke mmadụ ma ụnụ agaghị ahụ ya.

Ndị mmadụ ga-asị ụnụ, “Lee ya ebe ahụ!” Mọbụ, “Lee ya ebe a!” ụnụ agala, ụnụ esokwala ha.

N’ihi dịka otu amụma si egbu, ọkụ ya achakee site n’otu akụkụ nke urukpu ruo n’akụkụ nke ọzọ, otu a ka nwa nke mmadụ ga-adị n’ụbọchị nke ya.

Ma ọ ga-ebu ụzọ taa ọtụtụ ahụhụ, ọgbọ a ga-ajụkwa ya.

IHE ỌGỤGỤ ỤNYAHỤ: Igbo Mass Readings November 11 2020, Ncheta Martin nke Tours Dị Asọ

IHE ỌGỤGỤ ECHI: Igbo Mass Readings November 13 2020, Fraịdee Izu Iri Atọ na Abụọ n’Oge Adanyeghị n’Emume.    

Igbo Mass Readings November 12 2020, Ncheta Josaphat Dị Asọ.

Sonyere anyị na Facebook na Igbo Mass Readings 

error: Alert: Content is protected !!