Igbo Mass Readings November 19 2020, Tọọzde Izu Iri Atọ na Atọ Oge

Igbo Mass Readings November 19 2020, Tọọzde Izu Iri Atọ na Atọ n’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings November 19 2020, Tọọzde Izu Iri Atọ na Atọ n'Oge Adanyeghị n'Emume.
Igbo Mass Readings November 19 2020, Tọọzde Izu Iri Atọ na Atọ n’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ   5:1-10

Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Mkpughe.

Ahụrụ m n’aka  nri nke onye ahụ nọkwasara n’ocheeze ahụ, akwụkwọ mpịakọta nke e dere ihe n’ime ya na n’azụ ya.

E jikwa akara asaa nyachie ya. Ahụkwara m otu mmụọọma dị ike ka ọ na-ajụ n’oke olu sị, “Onye kwesịrị ịnyakapụ akara e ji nyachie akwụkwọ mpịakọta ahụ?

Onye pụrụ imeghe ya? Ọ dịghịkwa onye ọbụla nọ n’eluigwe mọbụ n’elu ụwa, mọbụ n’okpuru ụwa nwere ike ịsaghe akwụkwọ mpịakọta ahụ, mọbụ leba anya n’ime ya.

Ebere m akwa nke ukwuu n’ihina o nweghị onye ọbụla a hụrụ nke tozuru imeghe akwụkwọ mpịakọta ahụ mọbụ leba anya n’ime ya.

Mgbe ahụ otu n’ime ndị okenye ahụ sịrị m, “Ebela akwa, lee ọdụm nke agbụrụ Juda, mgbọrọgwụ

Devid emeriela, nke pụtara na ọ ga-emegheli akwụkwọ mpịakọta ahụ, ya na akara asaa ahụ e ji nyachie ya.”

Ahụrụ m otu Nwaatụrụ ka o guzoro n’etiti ocheeze ahụ na anụ anọ ahụ dị ndụ na ndị okenye ahụ gbara ya gburugburu.

Nwaatụrụ ahụ dịka e gburu ya egbu na mbụ. O nwere mpi asaa na anya asaa nke bụ Mmụọ asaa nke Chineke, ndị e zipụrụ n’ime ụwa niile.

Nwaatụrụ ahụ agaa nara akwụkwọ mpịakọta ahụ n’aka nri nke onye ahụ nọkwasara n’ocheeze ahụ.

Mgbe o weere akwụkwọ mpịakọta ahụ, anụ anọ ahụ dị ndụ, na ndị okenye iri abụọ na anọ ahụ dara n’ala n’ihu Nwaatụrụ ahụ.

Nke ọbụla n’ime ha ji ụbọ akwara, ha jikwa efere ọlaedo jupụtara na mgbaisiọma nke bụ ekpere ndị nsọ.

Ha na-ekwe ukwe ọhụrụ sị, “Itozuru ịnara akwụkwọ mpịakọta ahụ, ya na imeghe akara ahụ e ji nyachie ya.

N’ihina e gburu gị egbu, ma site n’ọbara gị, ị gbatarala Chineke ndị mmadụ site n’agbụrụ niile, asụsụ niile, ndị mmadụ niile na mba niile, i meela ka ha bụrụ agbụrụ ndịeze na ndị ụkọchukwu nye Chineke anyị; ha ga-achịkwa eze n’ụwa.

ABỤỌMA NA AZỊZA:  Ps. 149:1-2, 3-4, 5-6, 9.

Azịza: Nwaatụrụ ahụ emeela ka anyị bụrụ agbụrụ ndịeze na ndị ụkọchukwu nye Chineke anyị.

1.Kweerenụ Onyenweanyị ukwe ọhụrụ

ka ọgbakọ ndị kwere na  ya kweere ya ukwe otito

ka Izrel ñụrịa ọñụ n’ihi onye kere ya,

ka ụmụ Zayọn ñụrịa n’ihi onyeeze ha. Azịza.

2. Ka ha were ịgba egwu too aha ya,

Ka ha were ịgba na ụbọ akwara gbaara ya egwu.

N’ihina Onyenweanyị nwere ịhụnaanya n’ebe ndị nke ya nọ,

O kpubela ndị umeala okpu nke mmeri. Azịza.

3. Ka ndị nke ya ñụrịa na mmeri ha.

Ka ha daa n’ala n’ihu Chineke na-eto ya oge niile.

Ka nnukwu ukwe otito Chineke jupụta n’ọnụ ha,

nke a bụ otito nke ndị nke ya kwere ekwe. Azịza.

Mbeku       II Kor. 5:19

Alleluịa, Alleluịa:

Chineke sitere na Kristi na-eme ka ya na ụwa dị na mma. O tinyela n’aka anyị ozi banyere ụzọ o si eme ka ya na ụwa dị na mma.

Alleluịa.

Oziọma maka November 19 2020 – Luk 19:41-44.

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Mgbe Jesu bịaruru nso hụ nnukwu obodo ahụ bụ Jerusalem, o bere akwa maka ya sị, “A sị nnọọ na ị ma taa ihe ndị na-eweta udo! Ma ugbu a ezonahụla ya n’anya gị.

N’ihina ụbọchị ndị ahụ ga-adakwasa gị, mgbe ndịiro gị ga-akpagide gị, gbakwaa gị gburugburu n’akụkụ niile na-emegide gị.

Ha ga-akụtukwa gị na ụmụ gị n’ala, ha agaghị ahapụ otu mkpụrụ okwute n’elu ibe ya n’ime gị, n’ihina ị mataghị oge a bịakwutere gị.’

IHE ỌGỤGỤ ỤNYAHỤ: Igbo Mass Readings November 18 2020, Wednezdee Izu Iri Atọ na Atọ n’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ ECHI:   Igbo Mass Readings November 20 2020, Fraịdee Izu Iri Atọ na Atọ n’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings November 19 2020, Tọọzde Izu Iri Atọ na Atọ n’Oge Adanyeghị n’Emume.

Sonyere anyị na Facebook na Igbo Mass Readings 

error: Alert: Content is protected !!