Igbo Mass Readings December 1 2020, Tuezde Izu nke Mbu Oge Adventi

Igbo Mass Readings December 1 2020, Tuezde Izuụka nke Mbu n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.

Igbo Mass Readings December 1 2020, Tuezde Izuụka nke Mbu n'Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.
Igbo Mass Readings December 1 2020, Tuezde Izuụka nke Mbu n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.

EKPERE MMEGHE

Nna Onye ebere na Onye ntasịobi, nyere anyị aka n’adịghị ike ma tọhapụ anyị n’agbụ nke njọ. Nụrụ ekpere anyị ka anyị nwee ike ịñuri n’ọbịbịa nke Nwa Gị, Onye Gị na Ya dị ndụ na-achị n’ịdịkọ n’otu nke Mmụọ Nsọ, otu Chukwu site n’ụwatụwa niile. Amen.

Ihe Ogugu Nke Mb                  11:1-10

Ihe Ọgụgụ ewetara n’akwụkwọ Onye Amụma Aịzaya

Ome ga-esi n’ukwu osisi nke Jesse pụta, alaka ga-etopụta na mgbọrọgwụ ya. Mmụọ nke Osebụrụwa ga-adakwasa ya, mmụọ nke amamihe na nghọta, mmụọ nke ndụmọdụ na ike, mmụọ nke ọmụma na iwu nke chukwu.

Ịtụ egwu nke Chukwu ga-abụ ihe na-atọ ya ụtọ. Ọ gaghị eji naanị ihe anya na-ahụ kpee ikpe, nke aga-eji naanị ihe ọ nụrụ na ntị wee kpebie okwu. Kama eziomume ka ọ ga-eji kpeere ndị ogbenye ikpe; o ga-enye ndị dị umeala n’ụwa ikpe nkwụmọtọ.

Okwu ya ga-abụ mkpara igwe ga-akụtu ụwa, ikpe ya ga-ewetara ndị ajọ mmadụ ọnwụ. Eziomume ga-abụ akwa ọ ma n‘ukwu ya, ịkwụdosike ga-abụ ajị o kere n‘ukwu ya.

Nkịta ọhịa na ụmụ atụrụ ga-ebi otu ebe, agụ na ụmụ ewu ga edina. Nwa ehi na ọdụm na nwa ọdụm ga-anọkwa otu ebe; Obere nwa ga na edu ha; Ehi na edi ga na-edina otu ebe; ọdụm ga na-ata ahịhịa ka ehi.

Nwa na-añụ ara ga-egwu egwu n‘ọnụ agwọ, nwa na-eto eto ga-amanye aka n‘ọnụ agwọ ajụaja.

Ha agaghị emebi ma ọ bụ merụọ mmadụ ahụ n’elù ugwu m dị nsọ, n’ihi na ụwa ga-ejùpụta n’amamihe nke Yahweh dịka otu mmiri si jupụta n’osimiri.

N’ụbọchị ahụ, mgbọrọgwụ nke Jesse, ga akwụrụ dịka ihe akara n’ihu mmadụ niile. Mba niile ga-achọba ya, ebe obibi ya ga adị ebube.

ABỤỌMA NA AZỊZA: Ps. 72:1.7-8. 12-13.17.

Azịza: N’oge ya eziomume ga-achawapụta, udo ga-adịkwa ruo na njedebe ụwa.

1. Nye eze ikpe nkwụmọtọ gị, O Chineke,

nyekwa nwa eze eziomume nke gị,

Ka o were nwee ike ịchị ndị nke gị n’ụzọ ziri ezi,

nyekwa ndị ogbenye ikpe ziri ezi. Azza

2. N’oge ya eziomume ga-achawapụta,

udo ga-adịkwa ruo na njedebe ụwa,

Alaeze ya ga-esi n’osirniri ruo n’osimiri,

bido na mmiri ruo n’isi ngwụcha nke ụwa. Azza

3. Ọ ga-atọhapụ onye ogbenye kpọkuru ya,

na ndịọ niile chọrọ enyemaka ya.

Ọ ga-emere ndị ogbenye na ndị esighị ike ebere,

na azọpụta ndụ ha. Azza

4. Ngọzi dịrị aha ya ebeebe,

ka ọ dịgide dịka anyanwụ

ka agbụrụ niile dị n’ụwa nweta ngọzi na ya

ka mba niile kpọọya onye dị ngọzi. Azza

ALLELUỊA:

ALLELUỊA ALLELUỊA:

Lee, Onyenweanyị ga-abịa n’ebube, Ọ ga-emepe anya ndị nke ya.

ALLELUỊA.

Oziọma maka December 1 2020 – Luk 10:21-24

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

N’otu oge ahụ, obi tọrọ Jesu ụtọ site na Mmụọ Nsọ, o wee sị, Ekelee m gị Nna, Dinwenụ nke eluigwe na ụwa, n’ihi na I zobere ihe ndị a n’ebe ndị amamihe na oke mmụta nọ, ma kpugheere ha ụmụntakịrị.

Ee Nna, otu a ka o si masị uche gị dị nsọ. Nna m enyefeela m ihe niile na-aka. Ọ dịghịkwa onye ọ bụla maara onye Nwa ahụ bụ ma ọ bụghị Nna, ma ọ bụ onye Nna ahụ bụ ma ọ bụghị Nwa ahụ, na onye ọ bụla nke Nwa ahụ chọrọ ikpughere ya.

Jesu tụgharịrị gwa ndị na-eso ụzọ ya na nzuzo sị, “Ngọzi dịrị anya hụrụ ihe ụnụ hụrụ! Ana m agwa ụnụ na ọtụtụ ndị amụma na ndị eze mgbe ochie chọsiri ike ịhụ ihe ụnụ na-ahụ, ma ha ahụghị ha, na ịnụ ihe ụnụ na-anụ, ma ha anụghị ha.”

EKPERE NHUNYE

Dinwenụ, ewezuga Gị onweghị ihe anyị bụ. Ebe I ji ebere Gị na-echekwaba anyị nara ekpere na onyinye anyị ndị a. Anyị na-arịọ Gị ihe ndị a site na Kristi Dinwenụ anyị. Amen.

EKPERE ANATACHAA ORIRI NSỌ

Nna, Ị na-enye anyị nri nke si n’eluigwe. Site n’iketa oke n’ihe omimi nke a, kuziere anyị iji amamihe na-eso ihe nke ụwaa ma hụkwa ihe nke eluigwe n’anya. Mezuoro anyị ihe ndị a site na Kristi Dinwenụ anyị. Amen.

IHE ỌGỤGỤ ỤNYAHỤ: Igbo Mass Readings November 30 2020, Emume Andru Dị Nsọ, Nwaazụ.

IHE ỌGỤGỤ ECHI:   Igbo Mass Readings December 2 2020, Wednezde Izuụka nke Mbu n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.

Igbo Catholic Readings December 1 2020, Tuezde Izuụka nke Mbu n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta.

Sonyere anyị na Facebook na Igbo Mass Readings 

error: Alert: Content is protected !!