Igbo Mass Readings December 15 2020, Tuezde Izu Nke Atọ Oge Adventi

Igbo Mass Readings December 15 2020, Tuezde Izu Ụka Nke Atọ n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.

Igbo Mass Readings December 15 2020, Tuezde Izu Ụka Nke Atọ n'Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.
Igbo Mass Readings December 15 2020, Tuezde Izu Ụka Nke Atọ n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.

EKPERE MMEGHE

Nna, Onye ịhụnanya, Ị kegharịala ụwa site n’aka Jeus Kristi Nwa Gị. Biko mee  ka ọbịbịa Ya zọpụta anyị ma tinyekwa ndụ ọhụrụ n’ime anyị. Site na Dinwenụ anyị Jesu Kristi ……

Ihe Ogugu Nke Mbụ     3:1-2, 9-13

Ihe Ọgụgụ ewetara n’akwụkwọ Onye Amụma Zefanaya

Azị gbaa gị bụ onye nnupụisi rụkwara arụ, obodo mmegbu! Ọ naghị ege ntị n’olu ọbụla, nke ọ na-anabata ntụzi aka ọbụla.

Ọ naghị atụkwasa obi na Yahweh, nke ọ na-anọketa Chukwu ya nso. Aga m agbanwe okwu ndị mmadụ niile ka ọ bụrụ ihe dị ọcha ka ha niile wee na-akpọku aha nke Yahweh, ma werekwa otu obi fee ya.

Site n’ofe osimiri Etiopia ndị na-akpọku m, bụ ada ndị nke m gbasasịrị agbasasị, ga-ebute ihe onyinye m.

N’ụbọchị ahụ, agaghị emenye ụnụ ihere n’ihi omume ụnụ, nke ụnụ jiri nupụrụ m isi; n’ihi na aga m esite n’etiti ụnụ wezuga ndị na-añụrị ọñụ na mpako ha, ụnụ agaghị enwe  ọnụ ọjọọ n’ugwu nke m dị nsọ.

N’ihi na aga m ahapụ n’etiti ụnụ ndị dị nwayọọ ma dịkwa umeala n’obi. Ha ga-achọ nchedo n’aha nke Yahweh, bụ ndị a hapụrụ n’Izrel; ha agaghị emehie ma ọ bụ kwuo ụgha, nke a na-ahụ n’ọnụ ha ire nduhie. Ma ha ga-akpa nri zuokwa ike, o nweghị onye ga-emenye ha egwu.

ABỤỌMA NA AZỊZA: Ps: 34:2-3. 6-7. 17-18. 19-23.

Azịza: OnyenweanOnyenweayị na-anụ mkpu akwa nwogbenye.

1.Aga m eto Onyenweanyị oge niile,

Otitio Ya ga-adị n’egbugbere ọnụ m mgbe ọbụla

Mkpụrụobi m na-egorị n’Onyenweanyị,

ka ndị umeala nụrụ ma ñụrịa. Azịza

2. Ihu ọbụla chere n’ebe Onyenweanyị nọ na-amụke amụke,

Ihere anaghị eme ya ma ọlị.

Onyenweanyị na-anụ mkpu akwa nwogbenye

Ọ na-enyekwara ya aka na nsogbu ya niile. Azịza

3. Mana Onyenweanyị na-agbarụ ihu n’ebe ndị ajọomume nọ,

Ọ na-eme ka a ghara ichetakwa ha n’ụwa.

Ndị eziomume kpọkuru Onyenweanyị, Ọ zara ha,

wee zọpụta ha na nsogbu ha niile. Azịza

4. Onyenweanyị na-anọ ndị obi loghara elogha nso,

na-enyere ndị dara mba na mmụọ aka.

Onyenweanyị na-azọpụta ndụ ndị odibo ya,

ndị niile gbabara na ya agaghị akwụ ụgwọ ọbụla. Azịza

ALLELUỊA:

ALLELUỊA ALLELUỊA:

Bịa O Onyenweanyị, atụfula oge, gbaghara njọ ndị nke gị.

ALLELUỊA.

Oziọma maka December 15 2020 – Matiu 21:28-32             

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere.

Jesu gwara ndịisi nchụaja na ndị okenye ndị Juu sịọ: “Gịnị ka ụnụ chere maka otu nwoke mụtara ụmụ abụọ. Ọ gwara nke mbụ sị, “Nwa m gaa ọrụ n’ugbo vaịn m taa.

Ma ọ zara ya sị, “Agaghị m aga.” E mechaa o chegharịa gaa ọrụ ahụ. Nwoke ahụ gakwuru nwa ya nke abụọ gwakwa ya otu ihe ahụ, ma ọ zara ya sị, “Nna m aga m aga.” Mana ọ gaghị.

N’ime ụmụ abụọ ndị a olee nke mere uche nke nna ya? Jọn onye na-eme mmirichukwu bịara igosị ụnụ ụzọ eziomume. Ụnụ ekwenyeghị na ya ma ndị ọnaụtụ na ndị akwụna kwenyere na ya. Ọ bụladị mgbe ụnụ hụrụ nke a, ụnụ emechaghị chegharịa kwere na ya.”

EKPERE NHUNYE

Dinwenụ, ewezuga Gị o nweghị ihe anyị bụ. Ebe I ji ebere Gị na-echekwaba anyị, nara ekpere na onyinye anyị ndị a. Anyị na-arịọ ihe ndị a site na Kristi Dinwenụ anyị. Amen.

EKPERE ANATACHAA ORIRI NSỌ

Nna, Ị na-enye anyị nri nke si n’eluigwe. Site na iketa oke n’ihe omimi nke a, kuziere anyị iji amamihe na-eso ihe nke ụwa a ma hụkwa ihe nke eluigwe n’anya. Mezuoro anyị ihe ndị a site na Kristi Dinwenụ anyị. Amen.

Follow us on Social Media to get Daily Igbo Mass Readings Update:

IHE ỌGỤGỤ ỤNYAHỤ: Igbo Mass Readings December 14 2020, Mọnde Izu Ụka Nke Atọ n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.

IHE ỌGỤGỤ ECHI:  Igbo Mass Readings December 16 2020, Wednezde Izu Ụka Nke Atọ n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.

Igbo Mass Readings December 15 2020, Tuezde Izu Ụka Nke Atọ n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.

error: Alert: Content is protected !!