Igbo Mass Readings October 20 2020 Tuezdee Izu Iri Abụọ na Itoolu n’Oge

Igbo Mass Readings October 20 2020, Tuezdee Izu Iri Abụọ na Itoolu n’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings October 20 2020, Tuezdee Izu Iri Abụọ na Itoolu n'Oge Adanyeghị n'Emume.
Igbo Mass Readings October 20 2020, Tuezdee Izu Iri Abụọ na Itoolu n’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ              3:2-12.

Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Pọl degaara ndị Efesọs.

O doro m anya na ụnụ anụla na Chineke, site n’amara ya, enyela m ọrụ ilekọta ezinụụlọ ya nya maka ọdịmma ụnụ; otu e siri mee  ka m mata ihe omimi ahụ site na mkpughe, dịka m dere ya nwantịntị.

Mgbe ụnụ gụrụ nke a, ụnụ ga-achọpụta nghọta m banyere ihe omimi nke Kristi, nke e meghị ka ụnụ mmadụ mara n’ọgbọ gara aga dịka Mmụọ Nsọ siri kpugheere ya ụmụazụ na ndịamụma ya dị asọ ugbu a.

Otu a ka ndị mba ọzọ si soro anyị bụrụ ndị nketa, ndị otu ahụ na ndị ga-eketa nkwa ahụ n’ime Jesu Kristi, site n’oziọma.

N’ihina oziọma a, e mere m onye ozi dịka onyinye amara nke Chineke siri dị, nke e nyere m site n’ọrụ nke ike ya.

N’ebe  m nọ, n’agbanyeghị na m kacha dị nta n’etiti ndị nsọ niile, e nyere m ngọzi  nke a, ikwusara ndị mba ọzọ oziọma banyere akụ enweghị atụ nke juru n’ime Kristi;

mekwaa ka mmadụ niile hụ ihe bụ atụmaatụ nke ihe omimi e zoro n’ime Chineke onye kere ihe niile, ọtụtụ afọ.

Site na nzukọ ahụ, a ga-eme ka amamiihe Chineke n’ụdị ya dị icheiche bụrụ ihe ọchịchị na ike niile nke dị n’eluigwe ga-amata.

Nke a bụ n’usoro nke atụmaatụ ya dị ebeebe, nke e mezuru n’ime Jesu Kristi Dinwenụ anyị; bụ onye anyị nwere ntụkwasịobi na obi siri ike ịbịakwute site n’okwukwe anyị nwere na ya.

ABỤỌMA NA AZỊZA:   Aịzaya 12:2-3, 4, 5-6.

Azịza: Ụnụ ga-eji ọñụ kuru mmiri n’ụmi nke nzọpụta.

  1. Lee, Chineke bụ onye nzọpụta m;

enwere m nchekwube, egwu agaghị atụ m;

N’ihina Yahweh Chineke bụ ike m na ukwe m,

ọ bụ onye nzọpụta m.

Ụnụ ga-eji ọñụ kuru mmiri n’ụmi nke nzọpụta. Azịza.

2. Nyenụ Chineke ekele kpọkuonụ aha ya,

Meenụ ka a mata aka ọrụ ya n’ebe mba niile nọ,

Kwupụtanụ na aha ya dị elu. Azịza.

3. Bụọrọnụ Yahweh abụ ọma, n’ihina ọ rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube;

meenụ ka a nụ ya n’ụwa niile.

Tisienụ mkpu ike kweenụ ukwe ọñụ ụnụ ndị bi na Zayọn,

N’ihina onye nọ n’etiti ụnụ

bụ nnukwu onye dị nsọ nke Izrel. Aziza

Mbeku         Jọn 6:64, 69.

Alleluịa, Alleluịa:

Onyenweanyị, okwu gị bụ mmụọ bụrụkwa ndụ. Ọ bụ gị ji okwu nke ndụ ebeebe.

Alleluịa.

Oziọma maka October 20, 2020 – Luk 12:35-38

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Keenụ aji n’ume, ka ọkụ ụnụ na-enwukwa, dịkwanụ ka ndị na-eche nna ha ukwu mgbe ọ ga-esi n’oriri agbamakwụkwọ lọta, ka ha wee meghere ya ụzọ ngwangwa mgbe ọbụla ọ ga-alaghachi kụọ aka.

Ngọzi ga-adịrị ụmụodibo ahụ ndị nna ha ukwu ga-ahụ ka ha mụ anya mgbe ọ bịara; n’ezie agwa m ụnụ, ọ ga-eke akwa n’ukwu, mee ka ha nọdụ n’oche nri, bịa gbaara ha odibo.

Ọ bụrụ na ọ ga-abịa na nche nke abụọ mọbụ na nke atọ n’isi ụtụtụ hụ ha ka ha nọ na nche, ngọzi ga-adịrị ụmụodibo ahụ.”

IHE ỌGỤGỤ ỤNYAHỤ: Igbo Mass Readings October 19 2020, Mọndee Izu Iri Abụọ na Itoolu n’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ ECHI: Igbo Mass Readings October 21 2020, Wednezdee Izu Iri Abụọ na Itoolu n’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings October 20 2020, Tuezdee Izu Iri Abụọ na Itoolu n’Oge Adanyeghị n’Emume.

Sonyere anyị na Facebook na Igbo Mass Readings 

error: Alert: Content is protected !!