Igbo Mass Readings October 27 2020 Tuezdee Izu Iri Atọ n’Oge Nkiti

Igbo Mass Readings October 27 2020, Tuezdee Izu Iri Atọ n’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings October 27 2020, Tuezdee Izu Iri Atọ n'Oge Adanyeghị n'Emume.
Igbo Mass Readings October 27 2020, Tuezdee Izu Iri Atọ n’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ   5:21-33.

Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Pọl degaara ndị Efesọs.

Na-asọpụrịtaranụ onwe ụnụ n’ihi nkwanye ugwu dịịrị Kristi. Ndị bụ nwunye, na-asọpụrụnụ di ụnụ, dịka o kwesịrị Dinwenụ.

Di bụ isi nwunye ya, dịka Kristi si bụrụ isi nke nzukọ bụ ahụ ya ma bụrụkwa n’onwe ya, onye nzọpụta ya.

Ya bụ, ka ndị bụ nwunye sọpụrụ dị ha n’ihe niile dịka nzukọ Kristi si na-asọpụrụ ya n’ihe niile.

Ndị bụ di, hụnụ nwunye ụnụ n’anya dịka Kristi siri hụ nzukọ ya werekwa ndụ ya nye n’ihi ya, o siri otu a doo ya nsọ, ebe o jirila okwu ahụ dịka mmiri, sachaa ya.

Ka o wee chee nzukọ ahụ n’ihu onwe ya dịka ihe dị ebube nke enweghị ntụpọ, ihu ndọlị, mọbụ ihe dị otu ahụ, ka o wee dị nsọ n’enweghị ntụpọ.

N’ụzọ dị otu a, ndị bụ dị kwesịrị ịhụ nwunye ha n’anya dịka ahụ nke ha. Onye na-ahụ nwunye ya n’anya bụ onwe ya ka ọ na-ahụ n’anya.

N’ihina o nweghị nwoke ọbụla na-akpọ anụahụ ya asị, kama, ọ na-azụ ya ma na-echekwa ya dịka Kristi si eme nzukọ ya; n’ihina anyị bụ akụkụ ahụ ya.

“Ọ bụ n’ihi nke a ka nwoke ga-eji hapụ nne na nna ya, ya na nwunye ya ejikọọ. Ha abụọ abụrụ otu ahụ.”

Nke a bụ nnukwu ihe omimi nke na-arụtụ aka n’ebe Kristi na nzukọ ya nọ. Otu o sila dị, ka onye ọbụla n’ime ụnụ hụ nwunye ya n’anya dịka onwe ya, ka nwunye hụkwa na ọ na-asọpụrụ di ya.

ABỤỌMA NA AZỊZA:  Ps. 128:1-2, 3, 4-5.

Azịza: Ngọzi na-adịrị ndị na-atụrụ Chineke egwu.

  1. Ngọzi na-adịrị ndị na-atụrụ Chineke egwu,

na-eso ụzọ ya.

Ihe aka gị kụtara ka ị ga-eri,

añụrị na ọganiihu ga-abụ nke gị. Azịza.

2. Nwunye gị ga-adị ka osisi vaịn,

na-amị mkpụrụ n’ime ụlọ gị,

ụmụ gị ga-adị ka osisi oliv

gbaa oche nri gị gburugburu. Azịza.

3. Lee otu ahụ ka a ga-esi gọzie onye ahụ,

nke na-atụrụ Chineke egwu.

Ka Onyenweanyị si na Zayọn gọzie gị.

ụbọchị ndụ gị niile. Azịza.

Mbeku          Jemis 1:21.

Alleluịa, Alleluịa:

Werenụ nwayọọ nara okwu ahụ nke a kụrụla n’obi ụnụ dịka mkpụrụ, nke pụrụ ịzọpụta mkpụrụobi ụnụ.

Alleluịa.

Oziọma maka October 27 2020 – Luk 13:18-21.

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Jesu jụrụ ọzọ sị, “Gịnị ka alaeze Chineke dịka ya? Gịnị ka m ga-eji tụnyere ya? Ọ dịka mkpụrụ osisi Mọstad nke otu onye weere kụọ n’ubi.

O toro, bụrụ nnukwu osisi, ụmụnnụnụ abịa rụọ akwụ n’alaka ya.” Jesu jụkwara ọzọ sị, “Gịnị ka m ga-eji tụnyere alaeze Chineke?

Ọ dịka ihe na-eko achịcha nke nwaanyị weere gwakọọ ya na akpa ntụọka atọ, ruo mgbe ha koro.”

IHE ỌGỤGỤ ỤNYAHỤ: Igbo Mass Readings October 26 2020, Mọndee Izu Iri Atọ n’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ ECHI:  Igbo Mass Readings October 28 2020, Wednezdee Izu Iri Atọ n’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings October 27 2020, Tuezdee Izu Iri Atọ n’Oge Adanyeghị n’Emume.

Sonyere anyị na Facebook na Igbo Mass Readings 

error: Alert: Content is protected !!