Igbo Mass Readings November 3 2020 Tuezdee Izu Iri Atọ na Otu Oge Nk

Igbo Mass Readings November 3 2020, Tuezdee Izu Iri Atọ na Otu n’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings November 3 2020, Tuezdee Izu Iri Atọ na Otu n'Oge Adanyeghị n'Emume.
Igbo Mass Readings November 3 2020, Tuezdee Izu Iri Atọ na Otu n’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ              2:5-11.

Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Pọl degaara ndị Filipi.

Nweenụ ụdị obi ahụ dị n’ime Jesu Kristi n’etiti ụnụ. Onye agbanyeghị na ọ dị n’ụdị Chukwu, mana o weghị onwe ya na ya na Chukwu ha dịka ihe a ga-ejide aka.

O buturu onwe ya ala, were onwe ya n’ọnọdụ odibo, a mụọ ya n’ụdị mmadụ. A hụrụ ya n’ụdị nke mmadụ, o buturu onwe ya ala wee rube isi ruo n’ọnwụ, ọnwụ n’elu obe.

N’ihi nke a Chineke buliri ya elu, nye ya aha kacha aha niile, ka o wee bụrụ na n’aha Jesu ka ikpere niile ga-egbu n’ala ma n’eluigwe, ma n’ụwa ma n’okpuru ụwa, ire niile ga-ekwupụta na Jesu Kristi bu Dinwenụ maka otito nke Chukwu Nna.

ABỤỌMA NA AZỊZA:       Ps. 22:26-27, 28-30, 31-32.

Azịza: Aga m eto gị n’ihu nnukwu ọgbakọ ndị nke gị.

  1. Aga m emejupụta nkwa m kwere Gị

n’ihu ndị niile na-atụrụ  egwu.

Ndị ogbenye ga-eriju afọ

Ndị niile na-achọ Onyenweanyị ga-eto ya,

ka ha nwee ogologo ndụ. Azịza.

2. Ụwa niile ga-echeta ihe ndị a

wee laghachikwute Onyenweanyị

Ezinụụlọ niile dị n’ụwa

ga-akpọrọ ya isi ala.

N’ihina ọchịchị niile bụ nke Onyenweanyị,

Ọ na-achị mba niile!

Ndị niile na-enwe ọganihu n’ụwa

Ga-akpọrọ ya isiala

Otu aka ahụ ndị niile nwụrụ anwụ. Azịza.

3. Mkpụrụobi m ga-adị ndụ maka Onyenwean maka Onyenweanyị,

Ụmụ m niile ga-efe ya;

ndị mmadụ ga-ekwupụta Onyenweanyị n’agbụrụ niile;

Ma ndị nke ga-abịa n’ihu ha ga-ekwupụta ịdị  mma ya

N’etiti ụmụ ndị a mụbeghị

Ihe ndị a niile bụ ihe Onyenweanyị mere. Azịza.

Mbeku       Efesọs 1:17-18.

Alleluịa, Alleluịa:

Ka Chineke nke Dinwenụ anyị Jesu Kristi meghee anya nke obi ụnụ, ka ụnụ wee mata ihe bụ nchekwube nke ọkpụkpọ ọ kpọrọ ụnụ.

Alleluịa.

Oziọma maka November 3 2020 – Luk 14:15-24.

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Mgbe otu onye n’ime ndị ha na Jesu nọ na nri nụrụ ihe o kwuru, ọ sịrị Jesu, “Ngọzi na-adịrị onye ga-eso n’oriri nke alaeze Chineke!”

Ma Jesu sịrị ya, “O nwere otu nwoke kpọrọ nnukwu oriri, kpọkwa ọtụtụ mmadụ. Mgbe oge oriri ruru, nwoke a wee zipụ nwodibo ya, ka ọ sị ndị a kpọrọ oriri, “Bịanụ, n’ihina a kwadoola ihe niile.”

Ma ha niile bidoro n’otu n’otu inye ụsa. Onye mbụ gwara ya sị, “Azụrụ m ala ubi, aga m agarịrị hụ ya taa. Biko ewela iwe na agaghị abịalị.”

Onye ọzọ wee sị, “Azụrụ m ehi iri na-arụ ọrụ n’ubi, aga m eje ile ha, biko ewela iwe na agaghị m abịalị.”

Onye ọzọ wee sị, Alụrụ m nwaanyị ọhụrụ, n’ihi ya agaghị m ahapụ ya abịa.” Nwodibo ahụ lara kọọrọ nna ya ukwu ihe a.

N’iwe nna nwe ụlọ wee sị nwodibo ya, “Gaa ọsịsọ n’ama niile, na ụzọ niile nke obodo, kpọrọ m ndị ogbenye, ndị ọlụsị, ndị isi na ndị ngwọrọ.”

Na nwa oge, nwodibo ahụ asị, “Nna anyị e meela ihe I kwuru ma ọnọdụ fọdụrụ.” Nna ukwu ahụ sịrị nwodibo ahụ,

“Gaa na nnukwu okporo ụzọ niile, na ụzọ ubi niile, manye ndị mmadụ ka ha bata ka ụlọ m wee ju. N’ihina agwa m ụnụ, ọ dịghị otu n’ime ndị ahụ a kpọrọ ha jụ ga-edetụ nri m ọnụ.

IHE ỌGỤGỤ ỤNYAHỤ: Igbo Mass Readings November 2 2020, Ncheta Mkpụrụobi Ndị Niile Kwerenụ Gara Aga.

IHE ỌGỤGỤ ECHI:      Igbo Mass Readings November 4 2020 Wednezdee Izu Iri Atọ na Otu n’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings November 3 2020 Tuezdee Izu Iri Atọ na Otu n’Oge Adanyeghị n’Emume.

Sonyere anyị na Facebook na Igbo Mass Readings 

error: Alert: Content is protected !!