Igbo Mass Readings November 24 2020, Ncheta Andru Dunglac

Igbo Mass Readings November 24 2020, Ncheta Andru Dunglac na Ndị Otu Ya.

Igbo Mass Readings November 24 2020, Ncheta Andru Dunglac na Ndị Otu Ya.
Igbo Mass Readings November 24 2020, Ncheta Andru Dunglac na Ndị Otu Ya.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ         14:14-19

Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Mkpughe.

Elere m anya hụ otu igweọcha nke onye nọdụrụ na ya dịka Nwa nke mmadụ. O kpukwa okpueze ọlaedo n’isi ya, jirikwa mma owuwe ihe ubi dị nkọ.

Mmụọọma ọzọ si n’ụlọnsọ ahụ pụta, jiri oke olu na-agwa onye ahụ nọdụrụ ala n’igweọcha sị, “Tinye mma owuwe ihe ubi gị, malite iwe ihe ubi, n’ihina oge owuwe ihe ubi eruola, maka na ihe a ga-ewe n’ubi achaala nke ọma.

Onye ahụ nọdụrụ ala n’igweọcha weere mma owuwe ihe ubi ya bido owuwe ihe ubi n’ụwa. Ahụkwara m mmụọọma ọzọ ka o si n’ụlọnsọ dị n’eluigwe pụta.

O jikwa mma owuwe ihe ubi ya dị nkọ. Mmụọọma nke na-elekọta ọkụ sikwara n’ekwuaja ahụ pụta, were olu ike gwa mmụọọma ahụ ji mma dị nkọ sị, “Were mma gị bipụ ụyọ vaịn nke ụwa n’ihina mkpụrụ ya niile achaala.”

Mmụọọma ahụ bidoro owuwe ihe ubi n’ụwa bịakwa kpokọta mkpụrụ osisi vaịn nke ụwa, wụnye ha n’ebe nzọcha mmanya ukwu nke iwe ọkụ Chineke.

ABỤỌMA NA AZỊZA:    Ps. 96:10, 11-12, 13.

Azịza:  Onyenweanyị na-abịa ikpe ụwa ikpe.

1.Kwusachaanụ n’ụwa niile na Onyenweanyị bụ eze,

ọ kwụwasịrị ụwa ike, e nweghị ike ibugharị ya,

Ọ ga-eji ikpe nkwụmọtọ kpee mba niile ikpe. Azịza.

2. Ka Eluigwe ñụrịba, ka ụwa goribekwa

Ka oke osimiri na ihe niile dị n’ime ya tienụ mkpu.

Ala-ubi niile na ihe niile dị n’ime ya ñụrịbanụ. Azịza.

3. Ka osisi niile dị n’oke ọhịa kwebe ukwe añụrị

N’ihu nke Onyenweanyị n’ihi ọ na-abịa

Ọ na-abịa ikpe ụwa ikpe

Ọ ga-eji ikpe nkwụmọtọ na eziokwu

Were kpee ụwa na ndị mmadụ ikpe. Azịza.

Mbeku           Matiu 24: 42, 44.

Alleluịa, Alleluịa:

Na-echenụ nche, dịrịkwanụ njikere; n’ihina ụnụ amaghị oge nwa nke mmadụ ga-abịa.

Alleluịa.

Oziọma maka November 24 2020 – Luk 21:5-11.

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Ka ụfọdụ ndị mmadụ na-ekwu banyere ụlọnsọ nke Jerusalem, otu e si were nkume mara mma na ihe ndị mmadụ nyere Chineke chọọ ya mma.

Jesu gwara ha sị, “Banyere ihe ndị a niile ụnụ na-ahụ, ụbọchị na-abịa mgbe a gaghị ahapụ otu nkume n’elu ibe ya nke a gaghị akwatu.”  

Ha jụrụ ya sị, “Onye nkuzi, olee mgbe ihe ndị a ga-emezu? Gịnị ga-abụkwa ihe ịrịbaama mgbe ihe ndị a ga-emezu?

Ma Ọ zara ha sị; “Kpacharanụ anya ka onye ọbụla ghara iduhie ụnụ ụzọ, n’ihina ọtụtụ ga-abịa n’aha m sị, “Ọ bụ m bụ onye ahụ, mọbụ, oge adịla nso!’ Ụnụ esokwala ha.

Mgbe ọbụla ụnụ ga-anụ maka agha na kepukepu maka agha na-abịanụ, obi efela ụnụ; n’ihina ihe ndị a niile ga-emezu, ma na ọgwụgwụ oge erubeghị!”

Mgbe ahụ Jesu gwakwara ha sị, “Otu mba ga-ebilite megide mba nke ọzọ, otu alaeze ga-ebilitekwa megide alaeze nke ọzọ.

Oke ala ọmajijiji ga-adị; oke ụnwụ na ajọ ọrịa na-efe efe ga-adịkwa ebe dị iche iche. Ihe dị egwu na ihe ịrịbaama ukwu ga-apụta site n’eluigwe.

IHE ỌGỤGỤ ỤNYAHỤ: Igbo Mass Readings November 23 2020, Mọnde Izu nke Iri Atọ na Anọ n’oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ ECHI:   Igbo Mass Readings November 25 2020, Wednezde nke Izu Ụka Iri Atọ na Anọ n’oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings November 24 2020, Ncheta Andru Dunglac na Ndị Otu Ya.

Sonyere anyị na Facebook na Igbo Mass Readings 

error: Alert: Content is protected !!