Igbo Mass Readings December 2 2020,Wednezde Izu Mbu Oge Adventi

Igbo Mass Readings December 2 2020, Wednezde Izuụka nke Mbu n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.

Igbo Mass Readings December 2 2020, Wednezde Izuụka nke Mbu n'Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.
Igbo Mass Readings December 2 2020, Wednezde Izuụka nke Mbu n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.

EKPERE MMEGHE

Dinwenụ Chineke anyị, nyere anyị aka ịdị nkwadebe ịnabata Onyenweanyị Jesu Kristi mgbe Ọ ga-abịa n’otito; mekwaa ka anyị soro Gị na-achị eze n’ịdịkọ n’otu nke Mmụọ Nsọ, otu Chukwu site n’ụwatụwa niile. Amen.

Ihe Ogugu Nke Mb                        25:6-10

Ihe Ọgụgụ ewetara n’akwụkwọ Onye Amụma Aịzaya

N’elu ugwu nke a, Yahweh nke igwe ndị agha ga akwadoro mba niile oke oriri nke nri kacha mma na mmanya kacha ụtọ.

N’elu ugwu a, ọ ga-eyipu mmadụ niile akwa mkpe ha yi n’ahụ, wepụkwa akwaozu e kpuchigidere mba niile.

Ọ ga-emebi ọnwụ kpam kpam; Osebụrụwa Chineke ga-ehichapụ anya mmiri n’ihu ọ bụla, ọ na-ewepu ihere ndị nke ya n’ebe ọ bụla n’ụwa, n’ihi na Chineke ekwuola ya.

A ga-ekwu n’ụbọchị ahụ sị “Lee nke a bụ Chineke anyị; onye anyị chekwubere ịzọpụta anyị.

Ya bụ Osebụrụwa, onye anyị chekwubere na ya; ka anyị ñurịanụ; ka anyị gorienụ n’ihi na Ọ zọpụtala anyị.”

N’ihi na aka nke Yahweh ga-echekwaba ugwu a, n’ebe a ka a ga-azọpịa Moab n’ụkwụ, dịka e si azọpịa ahịhịa n’ebe a na-ekpofu ahịhịa.

ABỤỌMA NA AZỊZA: Ps. 23:1-3. 3-4. 5. 6.

Azịza: Aga m ebi n’ụlọ nke Chineke ebeebe ebeebe!

1.Chineke bu onye nche m O nweghi ihe m ga-acho

O na -eme ka m zuru ike ebe ahihia ndu di

O na -eduga m na mmiri

Ebe ahụ ka Ọ na-enye m ike. Azza.

2. Ọ na edu m na ụzọ eziomume;

n’ihi aha ya

Ọ bụrụ godu m na-aga na ndagwurugwu ọnwụ,

egwu ọ bụla agaghị atụ m;

Iji mkpara na ngu gị nọdebe m,

Ọ bụ ha na enye m agba m ume. Azza

3. Ị na-akwadoro m nri.

N’ihu ndị iro m.

lteela isi m mmanụ,

iko m ejula n’ọnụ na-agbọfu. Azza

4. N’ezie obiọma na ebere ga na eso m,

ụbọchị ndụ m niile.

Aga m ebi n’ụlọ nke Chineke

Ebeebe ebeebe! Azza.

MBEKU

ALLELUỊA ALLELUỊA:

Onyenweanyị na abịa ịzọpụta ndị nke ya, añụrị ga-adịrị ndị dị nkwadobe izute ya.

ALLELUỊA.

Oziọma maka December 2 2020 – Matiu 15:29-37

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere.

Jesu siri ebe ahụ pụọ gafee akụkụ osimiri Galili. Ọ rịgooro n’elu ugwu, nọdụ ala n’ebe ahụ.

Ọtụtụ igwe mmadụ bịakwutere ya, kpọtara ya ndị ngwọrọ, ndị ọlụsị, ndị isi, ndị ogbi na ọtụtụ ndi ọzọ. Ha tọgbọrọ ha n’ụkwụ Jesu, o wee gwọọ ha niile.

Ọ bụ ihe ịtụnaanya nye igwe mmadụ ahụ mgbe ha hụrụ ndị ogbi ka ha na ekwu okwu, ndị ọlụsị ka ahụ zuru ha oke, ndị ngwọrọ ka ha na aga ije na ndị isi ka ha na-ahụ ụzọ.

Ha wee too Chineke nke Izrel. Jesu kpọkọtara ndị na eso ụzọ ya wee sị ha, “Ebere igwe mmadụ a na-eme m n’ihi na mụ na ha anọọla ụbọchị atọ ugbu a ma ha enweghịkwa ihe ha ga eri, achọghị m ka ha buru ọnụ laa, ka ike ghara ịgwụ ha n’ụzọ”

Ndị na-eso ụzọ ya wee jụọ ya sị, “Olee ebe anyị ga-esi nweta ogbe achịcha n’ozara ebe a, nke ga-ezu inyeju igwe mmadụ a afọ?

Jesu jụrụ ha sị, “Ogbe achịcha ole ka ụnụ nwere?” Ha azaa ya sị, “Ogbe asaa na mkpụrụ azụ olemaole.”

Jesu gwara igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala. Ọ naara ogbe achịcha asaa na azụ ndị ahụ, mgbe o nyechara ekele, ọ nyawara ha, nye ndị na-eso ụzọ ya.

Ha kesaara ha igwe mmadụ ahụ. Ha niile rijuru afọ; ndị na-eso ụzọ ya wee tụtụkọta irighịri ndị fọdụrụnụ nke juru nkata asaa.

EKPERE NHUNYE

Dinwenụ mee ka Onyinye nke a anyị ji okwukwe na ịhụnaanya na-ehunyere Gị ghọọrọ anyị aja na enweghị ngwụcha iji nye Gị otito. Meekwa ka ha bụrụ n’ezie Eucharịstịa anyị na nzọpụta anyị. Mezuoro anyị ihe ndị a site na Kristi Dinwenụ anyị. Amen

EKPERE ANATACHAA ORIRI NSỌ

Chineke Onye ebere, mee ka Eucharịstịa nke a wetara anyị enyemaka Gị, zọpụta anyị na njọ anyị, ma kwadokwa anyị maka ọmụmụ nke Onye nzọpụta anyị bụ Dinwenụ ebighị ebi, ebighị ebi. Amen

IHE ỌGỤGỤ ỤNYAHỤ: Igbo Catholic Readings December 1 2020, Tuezde Izuụka nke Mbu n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta.

IHE ỌGỤGỤ ECHI:   Igbo Mass Readings December 3 2020, Ncheta Francis Xavier dị asọ – Tọọzde Izuụka nke Mbu n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.

Igbo Catholic Readings December 2 2020, Wednezde Izuụka nke Mbu n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.

Sonyere anyị na Facebook na Igbo Mass Readings 

error: Alert: Content is protected !!