Igbo Readings December 16 2020, Wednezde Izu Nke Atọ Oge Adventi

Igbo Mass Readings December 16 2020, Wednezde Izu Ụka Nke Atọ n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.

Igbo Mass Readings December 16 2020, Wednezde Izu Ụka Nke Atọ n'Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.
Igbo Mass Readings December 16 2020, Wednezde Izu Ụka Nke Atọ n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.

EKPERE MMEGHE

Nna, mee ka ọbịbịa emume nke ọmụmụ Nwa Gị wetara anyị enyemaka Gị ma kwadebe anyị maka ndụ ebighị ebi. Site na Dinwenụ anyị Jesu Kristi Nwa Gị ….

Ihe Ogugu Nke Mbụ – 45:6-8, 21-25

Ihe Ọgụgụ ewetara n’akwụkwọ Onye Amụma Aịzaya

Abụ m Yahweh, e wezuga m enweghị chi ọzọ dị nụ; ana m echekwa gị n’agbanyeghị na ị maghị m. Ka ndị mmadụ wee mara na site n’ọwụwa anyanwụ ruo na ọdịda ya na o nweghị onyeọzọ ma ewepụ m, abụ m Yahweh, e nweghị onye ọzọ.

Ọ bụ m na-enye ìhè ma na-eweta ọchịchịrị. Ọ bụ m na-enyekwa ngọzi, na-eweta ọdachi. Ọ bụ m bụ Yahweh na-eme ihe ndị a niile.

Ka eluigwe zodata mmeri dịka igirigi, ka urukpu zoo eziomume dịka mmiri, ka ala meghee, ka nzọpụta topụta, ka o mee ka ikpe nkwụmọtọ topụtakwa, mụ bụ Yahweh kwuru, onye kere eluigwe, ya bụ Chineke, onye kere ụwa, ya kwụbara ya; o keghị ya ka ọ bụrụ ebe ọgbaaghara.

O kere ya ka ọ bụrụ ebe obibi. A bụ m Osebụrụwa, enweghị chi ọzọ. Bịakwutenụ m ka ụnụ nwee nzọpụta, nsọtụ niile nke ụwa!

Abụ m Chineke e nweghị chi ọzọ. Ejirila m onwe m ñụọ iyi, okwu si m n’ọnụ bụ eziokwu, okwu na agaghị alaghachi n’ebe m nọ. Ikpere niile ga-esekpuru m, ire niile ga-añụ iyi.’

E kwuru sị, ‘Sọọsọ na Yahweh ka mmeri na ike si bịa.” Ndị niile na-ebuso ya agha ga-eji ihere bịakwute ya. Mmeri na otito nke si n’aka Chineke ga-adịrị agbụrụ niile nke Izrel.

ABỤỌMA NA AZỊZA: Ps: 85:9-10. 11-12. 13-14.

Azịza: Ka eluigwe zodata mmeri dịka igirigi, ka urukpu zoo eziomume dịka mmiri.

1.Ana m ege ntị n’ihe Chineke Onyenweanyị na-ekwu,

ihe ọ na-ekwu bụ udo maka ndị nke ya.

N’ezie, nzọpụta ya dị nsọ maka ndị na-atụrụ ya egwu.

Ka ebube ya wee nogide n’ala anyị. Azịza

2. Ịhụnanya na eziokwu amakụọla,

eziomume na udo ebiela ọma

Irubeisi ga-esi n’ala pulite,

eziomume ga-esi n’elu ledata anya. Azịza

3. Ee, Onyenweanyị ga-enye anyị ọganiihu,

ala anyị ga-amịta mkpụrụ, bawanye.

Eziomume ga-aga n’ihu ya,

udo ga na-eso nzọ ụkwụ ya. Azịza.

ALLELUỊA:

ALLELUỊA ALLELUỊA:

Welie olu gị tisie mkpu ike; Osebụrụ Chineke anyị ji ike abịa.

ALLELUỊA.

Oziọma maka December 16 2020 – Luk 7:18-23

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Jọn kpọrọ mmadụ abụọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya, zipụ ha ka ha ga jụọ Dinwenụ sị, “Ọ bụ gị bụ onye ahụ ga-abịanụ, ka anyị ga-ele anya onye ọzọ?”  

Mgbe ndị ahụ bịakwutere Jesu, ha sịrị, “Jọn onye na-eme mmirichukwu ziri anyị bịa jụta gị ma ọ bụ gị bụ onye ahụ e kwuru na ọ ga-abịa, ka anyị ga-ele anya onye ọzọ?”

N’oge elekere ahụ, Jesu gwọrọ ọtụtụ mmadụ ọrịa dị iche iche, ọ chụpụtakwara mmụọ ọjọọ n’ahụ ndị ha ji, meekwa ka ọtụtụ ndị isi hụ ụzọ.

Ọ zara ha sị, “Gaanụ gwa Jọn ihe ụnụ hụrụ na ihe ụnụ nụrụ: ndị isi na ahụ ụzọ, ndị ngwọrọ na-aga ije, a na-eme ndị ekpenta ka ha dị ọcha, ndị ntị chiri na-anụ ihe; a na-eme ndị nwụrụ anwụ ka ha si n’ọnwụ bilie, a na-akụziri ndị ogbenye oziọma. Ngọzi na-adịrị onye ọbụla nke  na-agaghị aghọtahie m.”

EKPERE NHUNYE

Dinwenụ, mee ka onyinye nke a anyị ji okwukwe na ịhụnanya na-ehunyere Gị ghọọrọ anyị aja na-enweghị ngwụcha iji nye Gị otito. Meekwa ka ha bụrụ n’ezie Eucharịstịa anyị na nzọpụta anyị. Mezuoro anyị ihe ndị a site na Kristi Dinwenụ anyị. Amen

EKPERE ANATACHAA ORIRI NSỌ

Chineke Onye ebere, mee ka Eucharịstịa nke a wetara anyị enyemaka Gị, zọpụta anyị na njọ anyị, ma kwadokwa anyị maka ọmụmụ nke Onye nzọpụta anyị bụ Dinwenụ anyị ebighị ebi, ebighị ebi.

IHE ỌGỤGỤ ỤNYAHỤ: Igbo Mass Readings December 15 2020, Tuezde Izu Ụka Nke Atọ n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.

IHE ỌGỤGỤ ECHI:  

Igbo Mass Readings December 16 2020, Wednezde Izu Ụka Nke Atọ n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.

error: Alert: Content is protected !!