Igbo Mass Readings October 14 2020 Wednezde Izu Iri Abụọ na Asatọ

Igbo Mass Readings October 14 2020, Wednezdee Izu Iri Abụọ na Asatọ n’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings October 14 2020, Wednezdee Izu Iri Abụọ na Asatọ n'Oge Adanyeghị n'Emume.
Igbo Mass Readings October 14 2020, Wednezdee Izu Iri Abụọ na Asatọ n’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ   5:18-25

Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Pọl degaara Galeshịa.

Ọ bụrụ na mmụọ na-edu ụnụ, ụnụ anọghịkwa n’okpuru iwu. Ugbu a ọrụ nke anụahụ pụtara ihe; ịkwaiko, omume ruru inyi, agụụ ịkwaiko, ikpere arụsị, ịgwọ nsi, ibu iro, esemokwu, ekworo, ọnụma, ịchọ nke onwe, nkewa, ịrọ otu, ntaji anya, ịñụbiga mmanya oke, iri oke oriri na ịgba ajọ egwu na ihe ndịọzọ dị otu a.

Ana m adọ ụnụ aka na ntị ugbu a otu m si dọọ ụnụ na mbụ, na ndị na-eme ihe dị otu a agaghị eketa alaeze Chineke.

Mana mkpụrụ mke mmụọ bụ: ịhụnaanya, ọñụ, udo, ndidi, obiọma, ịdị mma, ikwesị ntụkwasịobi, ịdị nwayọọ na njikọta nke onwe; ọ dịghị iwu ọbụla megidere ihe ndị a.

Ndị niile bụ ndị nke Jesu Kristi akpọgbuola ọchịchọ na agụụ anụahụ n’obe. Ọ bụrụ na anyị na-adị ndụ nke mmụọ, ka anyị na-emenụ omume site na nduzi nke mmụọ.

ABỤỌMA NA AZỊZA: Ps. 1:1-2, 3, 4, 6.

Azịza:  Onyenweanyị ndị niile na-eso gị ga-enwe ihe n ke ndụ.

  1. Añụrị ga-adịrị nwoke ahụ nke anaghị eso

ndụmọdụ onye ajọomume,

mọbụ na-akwụgharị n’ụzọ ndị ome njọ,

mọbụ nọdụ n’otu ndị na-ekwutọ Chineke;

Kama ọ na-enwe añụrị n’ebe iwu Onyenweanyị dị;

ma na-achịgharị iwu ya n’obi ya ehihie na abalị. Azịza.

2. Ọ dị ka osisi

a kụrụ n’akụkụ iyi,

nke na-amịpụta mkpụrụ ya n’oge ya,

nke akwụkwọ ya anaghị akpọnwụ akpọnwụ,

ihe niile ọ na-eme na-agara ya nke ọma. Azịza.

3. Ọ dịghị otu a n’ebe ndị ajọ mmadụ nọ;

Mba, n’ihina ha dịka afụrụ ọka nke ikuku na-ebugharị,

N’ihina Onyenweanyị na-echekwaba ụzọ ndị eziomume

mana ụzọ ndị ajọ mmadụ na-eduba n’ila n’iyi. Azịza.

Mbeku          Ps. 95:8

Alleluịa, Alleluịa:

Taa, ọ bụrụ na ụnụ anụ olu ya, ụnụ akpọchila obi ụnụ.

Alleluịa.

Oziọma maka October 14, 2020 – Luk 11:42-46

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Jesu kwuru sị, “Ahụhụ ga-adịrị ụnụ ndị Farisii! Ụnụ na-enye onyinye ego na nke osisi na nke nkpa akwụkwọ dị icheiche, ma leghara ikpe nkwụmọtọ na ịhụnaanya nke Chineke anya.

Ihe niile ndị a ka ụnụ kwesịrị ime n’elegharaghị ndịọzọanya. Ahụhụ ga-adịrị ụnụ, ndị Farisii! N’ihina ọ na-amasị ụnụ ịnọ n’oche kacha mma n’ụlọnzukọ niile na ịnara ekele pụrụ iche n’ọma ahịa.

Ahụhụ ga-adịrị ụnụ! N’ihina ụnụ dịka ili ndị na-apụtaghị ihe nke ndị mmadụ na-agafe n’elu ha n’amaghị na ha dị.”

Otu onye n’ime ndị ọkaiwu zara ya sị, “Onyenkuzi, mgbe Ị na-ekwu otu a, anyị sokwa na ndị Ị na-akparị. Jesu wee sị, “Ahụhụ ga-adịkwara ụnụ, ndị ọkaiwu!

N’ihina ụnụ na-ebo ndị mmadụ ibu dị arọ ma ụnụ onwe ụnụ adịghị emetụ ibu ahụ ọ bụladị otu mkpịsị aka ụnụ.”

IHE ỌGỤGỤ ỤNYAHỤ: Igbo Mass Readings October 13 2020, Tuezdee Izu Iri Abụọ na Asatọ n’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ ECHI:  Igbo Mass Readings October 15 2020, Tọọzde Izu Iri Abụọ na Asatọ n’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings October 14 2020, Wednezdee Izu Iri Abụọ na Asatọ n’Oge Adanyeghị n’Emume.

Sonyere anyị na Facebook na Igbo Mass Readings

error: Alert: Content is protected !!