Igbo Mass Readings October 21 2020 Wednezde Izu Iri Abụọ na Itoolu

Igbo Mass Readings October 21 2020, Wednezdee Izu Iri Abụọ na Itoolu n’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings October 21 2020, Wednezdee Izu Iri Abụọ na Itoolu n'Oge Adanyeghị n'Emume.
Igbo Mass Readings October 21 2020, Wednezdee Izu Iri Abụọ na Itoolu n’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ              3:14-21

Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Pọl degaara ndi Efesọs.

N’ihi nke a ka m ji gbuoro Nna ikpere m abụọ n’ala, onye ezinụụlọ niile dị n’eluigwe na nke dị n’ụwa si nweta aha.

Ka o wee bụrụ na site n’ụba nke otito ya, ọ ga-eme ka ụnụ sie ike na Mmụọ ya nke dị ụnụ n’ime;

ka Kristi nwee ike biri n’obi ụnụ site n’okwukwe, ka ụnụ ndị gbanyere mgbọrọgwụ kwụdosikwa ike n’ịhụnaanya, nwee ike isoro ndị nsọ niile ghọta ihe bụ obosara, ogologo, ịdị elu na ịdị omimi,

na ịmatakwa ịhụnaanya nke Chineke nke karịrị amamiihe, ka ụnụ jupụtakwa n’izu oke niile nke Chineke.

Ugbu a, onye nke zitere ike ahụ dị ire n’ime anyị, nwere ike ime n’uju karịa ihe niile anyị rịọrọ mọbụ chee n’uche. Ka otito dịrị ya n’ime nzukọ na n’ime Krisiti, ruo ọgbọ niile ebighịebi ebighịebi. Amen.

ABỤỌMA NA AZỊZA: Ps. 33:1-2, 4-5, 11-12, 18-19.

Azịza: Ịhụnaanya nke Onyenweanyị jupụtara n’ụwa.

  1. Tijerenụ Chineke mkpu ọñụ ndị eziomume,

n’ihina otito kwesịrị ndị obi ha kwụ ọtọ,

Werenụ ụbọ akwara too Chineke;

Werenụ une kụọrọ ya egwu. Azịza.

2. N’ihina okwu nke Onyenweanyị bụ  eziokwu,

Ọ na-akwụdosiike n’ọrụ ya niile.

Ọ hụrụ eziomume na ikpe nkwụmọtọ n’anya,

ịhụnaanya ya jupụtara n’ụwa. Azịza.

3. Mana atụmaatụ Chineke ga-adị ọkpụ.

Echiche  obi ya niile ga-adị ebeebe

Añụrị na Ngọzi na-adịrị mba Chineke bụ Chukwu ha

ndị nke ọ họọrọ dịka ndị nke ya. Azịza.

4. Ma lee ka Onyenweanyị si eleta ndị niile na-atụrụ ya egwu anya

ndị niile tụkwasịrịobi ha n’ịhụnaanya ya,

Ka O wee zọpụta mkpụrụobi ha n’ọnwụ,

ma chekwaba ha oge ụnwụ. Azịza.

Mbeku          Ps. 119:135

Alleluịa, Alleluịa:

Mee  ka ihu gị chakwasị nwodibo gị ma kuziere m ime uche gị.

Alleluịa.

Oziọma maka October 21, 2020 – Luk 12:39-48

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ma matanụ nke a, ọ bụrụ na nna nwe ụlọ matararị oge elekere onye ohi ga-abịa, ọ ga na-eche nche, ọ gaghị ahapụ ụlọ ya ka onye ohi gwupuo ya.

Ụnụ ga-adịkwa njikere n’ihina Nwa nke mmadụ na-abịa n’oge ụnụ atụghị anya.” Pịta jụrụ sị, “Dinwenụ ọ bụ naanị anyị ka I ji ụkabụilu a agwa okwu, ka ọ bụ maka onye ọbụla?”  

Ma Dinwenụ zara sị, “Onye bụ nwodibo ahụ kwesịrị ntụkwasịobi, nwekwaa uche, onye nke nna ya ukwu ga-enye ike ilekọta ezinụụlọn ya anya, ka ọ na-enye ha oke nri ha n’oge kwesịrị ekwesị?

Ngọzi na-adịrị nwodibo ahụ onye, mgbe nna ya ukwu ga-abịa, ọ ga-ahụ ya ka ọ na-eme otu a.

N’ezie agwa m ụnụ, nna ya ukwu ga-eme ya onye nlekọta nke ihe niile o nwere. Kama, ọ bụrụ na nwodibo ahụ echee n’obi ya sị, Nna m ukwu anọọla ọdụ na mbata, wee bido iti ụmụodibo ndị nwoke na ndị nwaanyị ihe,

na-eri na-añụkwa, mmanya ana-egbu ya, nna ya ukwu ga-abịa n’ụbọchị ọ na-atụghị anya ya n’oge elekere ọ na-amaghị.

Ọ ga-ata ya ahụhụ, tinyekwa ya n’ebe ndị na-ekwesịghị ntụkwasịobi na-anọ. Odibo ahụ nke maara ihe nna ya ukwu na-achọ, mana ọ dịghị njikere ime ya,

o meghịkwa dịka ọchịchọ nna ya ukwu sị dị, ga-anata ọtụtụ ụtalị. Ma nwodibo nke na-amaghị ma mee ihe kwesịrị ịpịa ụtalị ga-enweta ụtalị olemole.

Onye ọ bụla nke e nyere ihe ukwu, a ga-achọkwa ihe ukwu n’aka ya; onye ndị mmadụ nyekwara  ihe ukwu n’aka, n’aka ya ka ha ga-achọ ihe nke kanụ.

IHE ỌGỤGỤ ỤNYAHỤ: Igbo Mass Readings October 20 2020, Tuezdee Izu Iri Abụọ na Itoolu n’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ ECHI:  Igbo Mass Readings October 22 2020, Tọọzdee Izu Iri Abụọ na Itoolu n’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings October 21 2020, Wednezdee Izu Iri Abụọ na Itoolu n’Oge Adanyeghị n’Emume.

Sonyere anyị na Facebook na Igbo Mass Readings 

error: Alert: Content is protected !!