Igbo Mass Readings October 28 2020 Wednezdee Izu Iri Atọ n’Oge Nkiti

Igbo Mass Readings October 28 2020, Wednezdee Izu Iri Atọ n’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings October 28 2020, Wednezdee Izu Iri Atọ n'Oge Adanyeghị n'Emume.
Igbo Mass Readings October 28 2020, Wednezdee Izu Iri Atọ n’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ          6:1-9

Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Pọl degaara ndi Efesọs.

Ụmụ, na-eruberenụ ndị mụrụ ụnụ isi n’ime Dinwenụ, n’ihina nke a ziri ezi. “Sọpụrụ nna gị na nne gị,” n’ihina nke a bụ iwu nke mbụ nwere nkwa, “ka ihe wee gaara gị nke ọma, ka I werekwa bie ogologo ndụ n’elu ụwa.”

Ndị bụ nna ụnụ akpasula ụmụ ụnụ iwe, kama zụlitenụ ha n’ụzọ ziri ezi na ntụzi aka nke Dinwenụ. Ndị bụ ohu, werenụ egwu na ọma jijiji n’otu obi na-eruberenụ ndị bụ nnaukwu ụnụ n’ụwa isi dịka ha bụ Kristi.

Ụnụ emela ihe dị mma naanị mgbe mmadụ na-ele ụnụ anya, kama dịka ụmụodibo Kristi ndị na-eme uche Chineke site n’obi ha.  

Werenụ obiọma na-arụ ọrụ dịka ọ bụ nke Dinwenụ, na-abụghị nke mmadụ; ebe ụnụ maara na ihe ọbụla mmadụ mere ka ọ ga-anatakwa n’aka Dinwenụ mọbụ ohu mọbụ onye nwe onwe ya.

Ndị nnaukwu, marakwanụ ha otu ahụ, kwụsịnụ iyi ha egwu; ebe ụnụ maara na onye bụ nna ha ukwu na nke ụnụ nọ n’eluigwe. Ọ naghị ele mmadụ anya n’ihu mgbe ọ na-ekpe ikpe.

ABỤỌMA NA AZỊZA:  Ps. 145:10-11, 12-13, 13-14.

Azịza: Onyenweanyị dị ntụkwasịobi n’okwu ya niile.

  1. Onyenweanyị ihe niile I kere ga-ekele gị,

ndị kwere na gị ga-agọzi gị.

Ha ga-ekwupụta ebube nke alaeze gị

ma kwupụtakwa ịdị ike gị. Azịza.

2. Ka mmadụ niile mata ọrụ ịtụnaanya gị niile

na ebube dị elu nke alaeze gị

ma kwụpụtakwa ịdị ike gị. Azịza.

3. Onyenweanyị dị ntụkwasịobi n’okwu ya niile

omume ya niile jupụtara n’obi ebere,

Onyenweanyị na-azọ ndị na-ada ada,

Ọ na-ekulite ndị a kụdara n’ala. Azịza.

Mbeku          Ps. 147:2, 15.

Alleluịa, Alleluịa:

Jerusalem, toonụ Onyenweanyị, Ọ na-ezipụ okwu ya n’ụwa niile.

Alleluịa.

Oziọma maka October 28 2020 – Luk 13:22-30

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Jesu na-agagharị n’obodo ukwu na n’obodo nta, na-akụzi nkuzi, ka ọ na-aga Jerusalem. Otu onye jụrụ ya sị, “Onyenweanyị ọ bụ naanị mmadụ olemole ka a ga-azọpụta?”

O wee gwa ha sị, “Gbaanụ mbọ ka ụnụ si n’ụzọ dị warawara banye, n’ihina agwa m ụnụ, ọtụtụ mmadụ ga-achọ ka ha banye, ma ha agaghị enwe ike.

Oge ọbụla onye nwe ụlọ biliri gbachie ọnụụzọ ya, ụnụ ga-amalite iguzo n’ezi na-akụ aka n’ụzọ na-asị, “Dinwenụ megheere anyị ụzọ.”

Ọ ga-aza ụnụ sị, “Amaghị m ebe ụnụ si bịa.” Mgbe ahụ ụnụ ga-ebido na-asị, “Anyị na gị riri, ñụkwaa; ịkụzikwara nkụzi n’ogbe anyị.”

Ma ọ ga-asị, “Agwa m ụnụ, amaghị m ebe ụnụ siri bịa. Sinụ n’ebe m nọ pụọ, ụnụ niile bụ ndị omenjọ!”

N’ebe ahụ ụnụ ga-akwa akwa, na-ata ikikere eze; mgbe ụnụ hụrụ Abraham, Aịzik na Jekọb na ndị amụma niile ka ha nọ n’alaeze Chineke.

Ma ụnụ onwe ụnụ ga-abụ ndị a chụpụrụ n’ezi. Ndị mmadụ ga-esi n’ọwụwa anyanwụ na ọdida anyanwụ, sikwa n’ugwu na ndịda, bịa nọdụ n’oche nri n’Alaeze Chineke.

Ma lee, ụfọdụ ndị ikpeazụ ga-ebu ụzọ, ụfọdụ ndị bu ụzọ ga-ekpe azụ.

IHE ỌGỤGỤ ỤNYAHỤ: Igbo Mass Readings October 27 2020, Tuezdee Izu Iri Atọ n’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ ECHI:  Igbo Mass Readings October 29 2020, Tọọzdee Izu Iri Atọ n’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings October 28 2020, Wednezdee Izu Iri Atọ n’Oge Adanyeghị n’Emume.

Sonyere anyị na Facebook na Igbo Mass Readings 

error: Alert: Content is protected !!